Akwụkwọ nsọ
Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ 2


Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ—2

Nye Onye ọbula Ọ Gbasara:

Na 30 Septemba 1978, n’oge Ọgbakọ Ntụgharịkọta uche ọha nke mpaghara afọ 148 nke Nzukọ nke Jisụs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, Onye-isi nduzi N. Eldon Tanner, Onye ndụmọdụ nke Mbụ nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Nzukọ-nsọ wepụtara ihe ndị a na-eso:

Na mmalite Jun nke afọ nke a, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ e kwupụtawo na Onye-isi nduzi Spencer W. Kimball e nwetawo mkpughe ime ka ọkwa nchụ-aja na ngọzi nile nke temple rute ndị nwoke nile tozuru oke nke nzukọ. Onye-isi nduzi Kimball a rịọwo m ka m gwa ọgbakọ ntugharịkọta uche nke a na mgbe ya onwe ya nwetasịworo mkpughe nke a nke bịakwutere ya mgbe ọ tugharịsiworo uche nke obi na kpee ekpere ogologo mgbe na mpaghara ime ụlọ nile dị nsọ nke temple nsọ, o wepụtawo ya n’iru ndị ndụmọdụ ya nile, ndị nabataworo ya na nye ya nkwado. Mgbe ahụ ka e wepụtara ya nye Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ, ndị kwadoro ya n’ozuzu, na a gbasoro nke a wepụtara ya ndị ji Ikike zuru ọha, ndị n’otu ụdị ahụ kwadoro ya n’ozuzu.

Onye-isi nduzi Kimball arịọwo ka m gụpụta akwụkwọ nke a ugbua:

Jun 8, 1978

Nye ọha ndị-ọrụ, na ndị-ọrụ ọkwa nchụ-aja nile na mpaghara nta nke Nzukọ nke Jịsus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ a gazue uwa nile:

Ụmụnna m hụrụ n’anya:

Ebe anyị hụworo mgbasa ọrụ nke Onye-nwe gazue n’elu ụwa, anyị e nwewo obi ekele na ndị mmadụ nke ọtụtụ mba nile na-egosi nnabata nye ozi nke ozi-ọma nke ahụ e weghachiri azụ, ma na-esonye na Nzukọ-nsọ na ọnụ-ọgụgụ nke na-abawanye. Nke a n’onwe ya a gbaworị anyị ume inwe mmasị ime ka onye otu ọbụla nke Nzukọ tozuru oke nweta ohere nile na ngọzi nile nke ozi-ọma ahụ na-enye.

N’ihi na anyị matara nkwa nile nke ndị amụma nile kwere ma ndị-isi nduzi nile nke Nzukọ ndị buworị anyị ụzọ n’oge ga-adi n’ime atụmatụ ebighi-ebi nke Chineke, mgbe ụmụnna anyị nile ndị tozuru oke ga-enweta ọkwa nchụ-aja, na mgbe anyị hụworo ikwesị ntụkwasị-obi nke ndị ahụ e gbochiri inwe ọkwa nchu-aja, anyị arịọsiwo arịrịọ ike ogologo mgbe n’ihi ndị a, ụmụnna anyị kwesirị ntụkwasị-obi, tufue ọtụtụ awa na mpaghara ime Ụlọ Elu nke Temple na-ịrịọ Onye-nwe maka nduzi dị nsọ.

Ọ nụwọ ekpere anyị nile, na site na mkpughe mesie ike na ogologo ụbọchị e kwere nkwa a bịawo mgbe ndị nwoke kwesịrị ntukwasị obi n’ime Nzukọ-nsọ ga-enweta ọkwa nchụ-aja dị nsọ, n’ike iji ikike Chineke dị na ya rụọ ọrụ na rita uru ya na ndị ya nile ọ hụrụ n’anya ngọzi ọbula nke si na ya bịa, tinyere ngọzi nile nke temple. Otu aka ahụ, ndị nwoke nile bụ ndị otu Nzukọ-nsọ ka a ga-echi echichi ọkwa nchụ-aja na-atụleghi agbụrụ ma-ọbụ ọcha elu arụ. Ndị ndu nile nke ọkwa nchụ-aja ka a na-enye ntụzi aka ka ha na-agbaso atụmatụ nke ịkpachara anya n’inwe nzukọ ajụjụ-ọnụ nye ndị nile a ga-echi echichi baa n’Ọkwa Nchụ-aja Erọn ma-ọbụ nke Melkizedek ị hụ na ha mezuru ọnọdụ nile nke ntozu oke.

Anyị na-ama ọkwa n’obi umeala na Onye-nwe emewo ụgbu a ka a mara uche obi ya n’ihi ngọzi nke ụmụ ya gazue elu ụwa nile bụ ndị ga-an̄a ntị n’olu okwu ndị odibo ya nile o nyere ikike, na kwado onwe ha nile i nweta ngọzi ọbụla nke ozi-ọma.

Nke unu n’ezi,

Spencer W. Kimball

N. Eldon Tanner

Marion G. Romney

Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ

Ebe anyị kọtara na Spencer W. Kimball bụ onye-amụma, ọhụ-ụzọ ma onye-mkpughe, na onye-isi nduzi nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, a na ezube k’anyị bụ ọgbakọ a họpụtara ahọpụta nabata mkpughe nke a dịka okwu na uche obi nke Onye-nwe. Ndị nile kwadoro biko gosi nke a site na-iweli aka nri gị elu. Ndị megidere ya gosi site n’otu iriba ama ahụ.

Ntụli aka eji kwado nke a nwetara nkwekọrịta mmadụ nile.

Salt Lake City, Utah, Septemba 30, 1978.