Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 127


Nkeji 127

Akwụkwọ sitere n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Ndị-nsọ nile nke ugbua nọ na Nauvoo, Illinois, nke jikọtara ntụzi-aka nile gbasara baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, enyere oge ya na Nauvoo, 1 Septemba 1842 (History of the Church, 5:142–144).

1–4, Joseph Smith na-an̄urị n’ime mkpagbu na ahụhụ; 5–12, Akụkọ e dere-ede ka a garịrị edote gbasara baptism nile maka ndị nwụrụ-anwụ.

1 Dịka Onye-nwe na-ekpughewo nye m na ndị iro m, ma na Missouri ma na Steti nke a, nọ kwa ọzọ na-achụgharị m; na dịka ha na-achụgharị m n’enweghi ihe akpatara ya, na n’enweghi onyinyo kachasị ntakịrị ma-ọbụ ụche nke ikpe-ziri-ezi ma-ọbụ ikpe kwụrụ-ọtọ na-nkwado ha gbasara imesike nke mkpesa nile megide m; ma ebe ọbụ na ebubo nile hiwere-ukwu na ụgha nke kachasị-agba-ojii, e chewo m ya ihe kwesịrị na amamihe n’ime m i hapụ ebe a maka ntakịrị oge, n’ihi nchekwa nke m na nchekwa nke ndị nke a. A ga m asị ndị nile mụ na ha nwere itụ-mgbere, na-ahapụwo m ihe m nile n’aka ndị nnọchi-anya na ndị-ode akwụkwọ ndị ga-eme ihe itụ-mgbere nile ngwa-ngwa na ụzọ ziri-ezi, na ga-ahụ na ụgwọ m nile ka a kagburu mgbe oge ruru, site n’ire arịa ụlọ, ma-ọbụ n’ụzọ-ọzọ dịka okwu ahụ ga-achọ, ma-ọbụ dịka ohere ga-anabata. Mgbe m nụrụ na ebili-mmiri akwụsịwo, mgbe ahụ a ga m alọghachikwute unu ọzọ.

2 Na gbasara aihe ize-ndụ nile nke a kpọrọ m ị gabiga, ha yiri ihe ntakịrị nye m, n’ihi bntaji-anya na oke-iwe nke mmadụ abụrụwo ihe e jiri mara m n’ụbọchị nile nke ndụ m; ma ihe kpatara ya yiri ihe dị-omimi, ma-ọbụghị na cechiri m echichi tutu ntọ-ala nke ụwa maka ebum n’obi ọma, ma-ọbụ nke ọjọọ, dịka unu ga-achọ ịkpọ ya. Bụrụ nụ ndị ikpe nye ọnwe unu. Chineke mazuru ihe ndịa nile, ọbụrụ na ọ dị mma ma-ọbụ njọ. Mana otu o sila dị, mmiri di omimi bụ ihe e mere ka m na egwu na ya. Ọ bụrụwo e jiri mara nke m; ma e nwere m mmetụta, dịka Pọl, ị n̄ụrị n’ime dmkpagbu; n’ihi rute taa ka Chineke nke nna anyị ha napụtara m n’aka ha nile, na ga-anapụta m site ugbua gawa; n’ihi lee, ma hụrụ, a ga m emeri ndị iro m nile, n’ihi Onye-nwe Chineke e kwuwo ya.

3 Ka ndị-nsọ nile n̄ụrịa, ya mere, na nwee nnukwu obi-ụtọ; n’ihi aChineke nke Israel bụ Chineke ha, na ọ ga-enyepụ nnyeghachị nke ụgwọ-ọlụ ziri-ezi n’isi nile nke ndị-ọchịchị aka-ike ha.

4 Na ọzọ, n’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru: Ka ọrụ nke atemple m, na ọrụ nile nke m họpụtara nye unu, gaa n’iru na ghara ịkwụsị; na ka bịrụsi-ọrụ ike unu, na njisi-ike unu, na ndidi, na ọrụ unu bawanye ugboro abụọ, na unu aghaghị inweta ụgwọ-ọrụ unu, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha kwuru. Na ọbụrụ ha e csogbue unu, otu a ka ha sogburu ndị amụma na ndị ezi-omume ndị nọrọ tutu unu. N’ihi nke a nile e nwere ụgwọ-ọrụ n’elu-igwe.

5 Na ọzọ, e nye m unu okwu gbasara abaptism maka ndị unu bnwụrụ-anwụ.

6 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu gbasara ndị unu nwụrụ anwụ: Mgbe e mere onye ọbụla n’ime unu abaptism maka ndị nwụrụ-anwụ unu, ka enwe bonye na edekọta akụkọ, na ka ọ bụrụ onye aka-ebe na baptism nile unu; ka ọ nụrụ na nti ya nile, ka ọ gbaa-ama nke ezi-okwu, ka Onye-nwe kwuru;

7 Ka n’akụkọ-edere ede ya nile bụrụ na-enwere aike-ide ya n’elu-igwe; ihe ọbụla unu bkechiri n’ụwa, bụrụ ihe e kechiri n’elu-igwe, ihe ọbụla unu tọghere n’ụwa, bụrụ ihe a tọghere n’elu-igwe;

8 N’ihi a chọọla m aiwetaghachi ọtụtụ ihe n’elu-ụwa, gbasara bọkwa nchụ-aja, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha kwuru.

9 Na ọzọ, ka aakụkọ edere-ede nile nọrọ n’usoro, ka-edota ha ’ebe nchekwa ihe-ọkpụ nke temple nke m dị-nsọ, ka a na echeta ha site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha kwuru.

10 A ga m asị ndị-nsọ nile, na-achọrọ m, na chọsie ike, ikwuru ha okwu site n’ebe nguzo ikwu okwu n’isi okwu nke baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, n’Ụbọchị Izu-ike na abia. Mana ọbụrụra na odighị n’ike m ime otu a, a ga m ede okwu nke Onye-nwe site n’oge rue n’oge, n’isi okwu ahụ, na zipụrụ unu ya site na nzipụ-ozi, na kwa ọtụtụ ihe ndị-ọzọ.

11 Ka m mechie akwụkwọ-ozi m ugbụ a maka oge nke a, n’ihi oge adịghị kwa; n’ihi onye-iro ahụ nọ na-njikere, na dịka Onye-nzọpụta kwuru, aọkpara-eze nke ụwa nke a na-abịa, mana ọdighị kwa ihe onwere n’ime m.

12 Lee, ekpere nke m nye Chineke bụ ka a zọpụta unu nile. Na edepụta m aha onwe m onye odibo unu n’ime Onye-nwe, onye-amụma na aọhụ-ụzọ nke Nzukọ-nsọ nke Jịsus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.

Joseph Smith.