Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 78


Nkeji 78

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Maach 1832 (History of the Church, 1:255–257). Usoro ahụ Onye-nwe nyere Joseph Smith maka nzube ihiwe ụlọ-akụ maka ndị ogbenye. Ọbụghị ihe a chọrọ oge nile ka e jiri-mara nke ndị mmadụ ahụ Onye-nwe kwusaara okwu na mkpughe nile bụrụ ihe ụwa ga-amata; ya mere, na mbipụta nkea ma n’ụfọdụ mkpughe ndị na-eso ụmụnne nwoke ka a kpọrọ aha ọzọ n’abụghị nke ha. Mgbe mkpa gafere maka idebe aha ha na nzuzo, ezigbo aha ka e mesịrị nye n’akara mkpuchi nile. Ebe a n’enweghi mkpa pụtara ìhè taa ịgan’iru n’inye aha ndị a pụrụ-iche, ezigbo aha ha nanị ka a na-eji ugbụ a n’ebe a dịka e nyere ya na ndepụta nke mbụ.

1–4, Ndị nsọ ga-ahazi ma hiwe ụlọ-akụ; 5–12, Itinye ihe onwunwe ha n’ezi ọrụ n’amamihe ga-eduba na nzọpụta; 13–14, Nzukọ-nsọ kwesịrị ịnọrọ nke onwe ya site n’ebe ndị-ike nke ndị ụwa nọ; 15–16, Maikael (Adam) na-arụ n’okpuru ntụzi-aka nke Onye Nsọ ahụ (Kraịst); 17–22, Ngozi na-adịrị ndị kwesịrị ntụkwasị-obi, n’ihi ha ga-eketa ihe nile.

1 Onye-nwe kwuru nye Joseph Smith, Nta, na-asị; N̄aa-ntị nye m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru, ndị e chiri echichi baa na andị-isi ọkwa nchụ-aja nke nzukọ-nsọ m, ndị gbakọrọ onwe unu n’otu ebe;

2 Ma gee nụ ntị na andụmọdụ nke onye ahụ nke bchiworo unu echichi site n’elu, onye ga-ekwuba na ntị unu okwu ndị ahụ nke amamihe, ka nzọpụta wee bụrụ nke unu n’ime ihe ahụ nke unu gosiworo n’iru m ka Onye-nwe Chineke kwuru.

3 N’ihi na n’ezie asị m unu oge ahụ abịawo, ma ugbụ a nọ n’ọba-aka; mana lee, ma hụrụ, ọ dị mkpa na e nwere otu anhazi nke ndị m, n’idozi usoro ma n’ihiwe ihe gbasara bụlọ-akụ maka cndị ogbenye nke ndị m, ma n’ebe a ma n’ala nke dZaịọn

4 Maka nhiwe na usoro nke ga-anọgide na mgbe nile na-adigide nye nzukọ-nsọ m, ịkpọlite ime ka ebu m n’uche ahụ gaa n’iru, nke unu wekwasịworo, nye nzọpụta nke mmadụ, ma nye otuto nke Nna unu nke bi n’elu-igwe;

5 Ka unu ahara otu na nkwekọrịta nke ihe nile nke elu-igwe, e, na ihe nile nke ụwa kwa, maka inweta ihe nile nke elu-igwe.

6 N’ihi na ọbụrụ na unu ahaghị otu n’ihe nile nke ụwa unu enweghị ike ịha otu n’inweta ihe nile nke elu-igwe;

7 N’ihi na ọbụrụ na unu chọrọ ka m nye unu otu ebe n’ala-eze aselestịal, unu aghaghị bijikere onwe unu site cna-ime ihe nile nke m nyere unu n’iwu ma chọrọ kwa n’aka unu.

8 Ma ugbụ a, n’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru ọ dị mkpa na e mere ihe nile nye aotuto nke m, sịte n’aka unu ndị jikọrọ ọnụ n’ime busoro nke a;

9 Ma-ọbụ, n’okwu ndị ọzọ ka nwa odibo m Newel K. Whitney na nwa odibo m Joseph Smith, Nta, na nwa odibo m Sidney Rigdon nọrọ na kansụl ha na ndị-nsọ ndị nọ na Zaịọn;

10 Ma ọbụghị otu a aSetan na-achọ ịtụgharị obi ha nile site n’ezi-okwu ahụ, ka ha kpuo-isi ma ghara ịghọta ihe nile nke akwadoro maka ha.

11 Ya mere, iwu-nsọ ka m na-enye unu, ka unu jikere ma hazie onwe unu site na nkekọta ma-ọbụ aọgbụba-ndụ mgbe nile na-adigide nke a n’enweghi ike ịtọhapụ.

12 Ma onye ahụ nke tọhapụrụ ya ga-etufu ọkwa-ọrụ ya na ọnọdụ ya n’ime nzukọ-nsọ, ma a ga-enyefe ya an’ahụhụ nile nke Setan ruo ụbọchị nke mgbapụta.

13 Lee, nke a bụ njikere nke m ji ejikere unu, na ntọ-ala, na ihe nlere-anya nke m na-enye unu nile site na nke unu ga-emezu iwu-nsọ nile nke e nyeworo unu;

14 Na site na nnyezu nke m, na-agbanyeghị amkpagbu nke ga-adakwasị unu, na nzukọ-nsọ ga-enwe ike iguzoro nke onwe ya karịa ihe ndị ọzọ nile ekere eke nọ n’okpuru ụwa selestịal ahụ.

15 Ka unu nwe ike bịarute aokpu-eze ahụ akwadoro maka unu, ma emee unu bndị ọchịchị nye ọtụtụ ala-eze, ka Onye-nwe Chineke kwuru, Onye Nsọ ahụ nke Zaịọn, onye hiweworo ntọ-ala nile nke cAdam-ondi-Ahman;

16 Onye họpụtaworo aMaikael ọkpara-eze unu, ma hiwe ụkwụ ya abụọ, ma bulie ya elu, ma nyefee ya ọtughe-ụzọ nile nke nzọpụta n’okpuru ndụmọdụ na ntụzi-aka nke onye Nsọ ahụ, onye n’enweghi mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ngwụcha nke ndụ.

17 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, unu bụ ụmụ-ntakịrị ma unu aghọtabeghi nnukwu ngọzi nile nke Nna nwere n’aka nke ya nile ma kwadowo maka unu;

18 Ma unu enweghi ike aịnagide ihe nile ugbụ a; otu ọ sịla dị, norọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, n’ihi na a ga m beduru unu na-aga. Ala-eze ahụ bụ nke unu ma ngozi nile dị na ya bụ nke unu, ma akụ na ụba nile nke cmgbe ebighi-ebi bụ nke unu.

19 Ma ya onye natara ihe nile an’obi-ekele ka a ga-enye otuto; ma ihe nile nke ụwa nke a ka a ga-etinyere ya, ọbụna ụzọ botu narị, e, karịa.

20 Ya mere, mee ihe nile nke m nyeworo unu n’iwu, ka Onye-mgbapụta unu kwuru ọbụna Ọkpara aAhman, onye na-akwado ihe nile tutu ọ bịa bịkpọrọ unu;

21 N’ihi na unu bụ andị nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Ụzọ mụọ, ma ọ bga-eweli unu elu n’igwe-ojii, ma nye onye ọbụla oke ya.

22 Ma onye ahụ nke bụ aonye-ọrụ nke kwesịrị ntụkwasị-obi ma bnwere uche ga-eketa cihe nile. Amen.