Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 125


Nkeji 125

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Nauvoo, Illinois, Maach 1841, gbasara Ndị-nsọ na mpaghara nke Iowa (History of the Church, 4:311–312).

1–4, Ndị-nsọ ga-ewu obodo-ukwu nile na ịgbakọ na stek nile nke Zaịọn.

1 Gịnị bụ uche nke Onye-nwe gbasara ndị-nsọ na Mpaghara nke Iowa?

2 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru, a sị m unu, ọbụrụ na ndị ana-akpọ onwe ha site n’aha m na nọ na achọ ị bụ ndị-nsọ m, ọbụrụ na ha ga-eme uche m na dobe iwu-nsọ m nile gbasara ha, ka ha gbakọọ onwe ha ọnụ n’ebe nile nke m ga-ahọpụta nye ha site n’aka nwa odibo m Joseph, na wulie obodo-ukwu nye aha m, ka ha nọrọ na njikere maka nke ahụ nke nọ na-eche oge ahụ gaje ịbịa.

3 Ka ha wulie obodo-ukwu n’aha m n’ala ahụ chere-iru n’obodo-ukwu nke Nauvoo, na ka akpọkwasị ya aha aZarahemla.

4 Na ka ndị nile sitere n’ọwụwa anyanwụ, na ọdida anyanwụ, na elu elu, ma na ndịda, ndị nwere ọchichọ nke ibiri na ya, were ihe nketa ha n’ebe ahụ, ya na n’obodo-ukwu aNashville, ma-ọbụ n’obodo-ukwu nke Nauvoo, ma n’ime bstek ahụ nile nke m họpụtaworo, ka Onye-nwe kwuru.