Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 91


Nkeji 91

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 9 Maach 1833 (History of the Church, 1:331–332) Onye-amụma nọ n’oge ahụ na-atụgharị Testament Ochie ebe ọ bịarụworo n’akụkụ nke edemede nile ndị ochie a na-akpọ Apọkrịfa, ọ jụrụ Onye-nwe ma nata ntuzi-aka nke a—

1–3, Apọkrịfa ahụ ka a tụgharịrị asụsụ akụkụ nke ka nke ọma mana o nwere ọtụtụ echiche ndị mmadụ sitere n’aka ha n’abụghị ezi-okwu; 4–6, Ndị ọ na-enye uru bụ ndị nwere ozizi site na Mụọ.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu gbasara aApọkrifa ahụ—O nwere ọtụtụ ihe dị n’ime ya nke bụ ezi-okwu, ma a tụgharịrị asụsụ ya nke ọma;

2 E nwere ọtụtụ ihe dị n’ime ya nke n’abụghi ezi-okwu, ndị bụ echiche nke ndị mmadụ nke sitere n’aka ha.

3 N’ezie, a sị m unu, na ọ dịghị mkpa ka atụgharịa asụsụ Apọkrịfa ahụ.

4 Ya mere, onye ọbụla nke na-agụ ya, ka ọ aghọta, n’ihi na Mụọ na-egosipụta ezi-okwu;

5 Ma onye ọbụla nwere ozizi site na aMụọ ga-enweta ihe nrite uru site na ya;

6 Ma onye ọbụla n’anataghị site na Mụọ enweghi ike irita uru. Ya mere ọ dịghị mkpa na a ga-atụgharị asụsụ ya. Amen.