Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 100


Nkeji 100

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Perrysburg, New York, 12 Oktoba 1833 (History of the Church, 1:416, 419–421). Ụmụnne ndị nwoke abụọ ahụ, ebe ha nọworo ọtụtụ ụbọchị ha hapụrụ ezi na ụlọ ha nile, nwere mmetụta maka ha.

1–4, Joseph na Sidney ga-ekwusa ozi-ọma ahụ maka nzọpụta nke mkpụrụ-obi nile; 5–8, A ga-enye ha n’awa ahụ ihe ha ga-ekwu; 9–12, Sidney ga-abụ onye-nkwupụta ma Joseph ga-abụ onye mkpughe ma dị-ike n’ọgbụgba-ama; 13–17, Onye-nwe ga-ekụlite ndị mmadụ dị-ọcha n’obi, ma ndị na-erubere ya isi ka a ga-azọpụta.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu, ndị enyi m aSidney na bJoseph, ezi na ụlọ unu dị mma; ha nọ n’ime aka m abụọ, ma a ga m emere ha otu osi masị m; n’ihi n’ime m ka ike nile dị.

2 Ya mere, soro m, ma nụrụ ndụmọdụ nke m ga-enye unu.

3 Lee, ma hụrụ, e nwere m igwe mmadụ n’ebe a, na mpaghara nile gbara ebe a gburu-gburu; ma a ga-emeghe ọnụ-ụzọ a ga-eji arụsị-ọrụ ike na mpaghara nile gbara gburu-gburu n’ala ọwụwa anyanwụ nke a.

4 Ya mere, mụ, Onye-nwe, e mewo ka ị bia n’ebe a; n’ihi na otu a ka m chere dị mkpa n’ime m maka anzọpụta nke mkpụrụ-obi nile.

5 Ya mere, n’ezie a sị m unu, welite nụ olu unu nile elu nye ndị mmadụ ebe a; akwụpụta nụ echiche nile nke m ga-etinye n’ime obi unu nile, ma unu a gaghị enwe mgbagwọ-ju-anya n’iru ndị mmadụ;

6 N’ihi na a aga-enye ya unu n’awa ahụ, e, n’oge ahụ, ihe unu ga-ekwu.

7 Mana otu iwu-nsọ ka m na-enye unu, na unu ga-ekwupụta ihe ọbụla unu ana-ekwupụta n’aha m, n’obi nke ihe dị-mkpa, na mụọ nke bịdị nwayọ, n’ihe nile.

8 Ma e kwe m unu nkwa nke a, na ọ bụrụraa na unu na-eme nke a aMụọ Nsọ ahụ ga-apụta ìhè n’ịgba-aka-ebe nye ihe nile ọbụla nke unu ga-ekwu.

9 Ma ọ dị m mkpa na gị, nwa odibo m Sidney, bụrụ aonye nkwupụta okwu nye ndia; e, n’ezie, a ga m echi gị echiche baa n’okpụkpọ-oku nke a, ọbụna ị bụrụ Onye-nkwupụta okwu nye nwa ọdịbọ m Joseph.

10 Ma a ga m enye ya ike ịdị-ukwuu an’ọgbụgba-ama.

11 Ma a ga m enye gị ike aịdị-ukwuu n’ịkọwadaruo-ala akwụkwọ-nsọ nile, ka ị wee bụrụ onye nkwupụta nye ya, ma ọ ga-abụ bonye-mkpughe nye gị ka ị wee mata ezi-okwu nke ihe nile gbasara ihe nile nke ala-eze m n’ụwa.

12 Ya mere, gaa-n’iru na njem unu ma ka obi unu nile n̄ụrịa; n’ihi na lee, ma hụrụ, a nọnyere m unu ọbụna ruo n’ọgwụgwụ.

13 Ma ugbua a na m enye unu otu okwu gbasara aZaịọn. Zaịọn ga-enwe bmgbapụta, n’agbanyeghì na a ga-ata ya ahụhụ nwoge nta.

14 Ụmụnna unu nwoke, ndị odibo m Orson aHyde na John Gould, nọ n’aka m abụọ; ma ọbụrụraa na ha na-edebe iwu-nsọ m nile ha ga-abụ ndị a zọpụtara.

15 Ya mere, ka a kasie unu obi; n’ihi na ihe anile ga arụkọ-ọrụ ọnụ maka ọdị mma nke ha ndị na-eje-ije n’ụzọ ziri-ezi, ma ruo na nsacha nke nzukọ-nsọ.

16 N’ihi na a ga m ekụlite nye onwe m ndị mmadụ ndị adị ọcha n’obi, ndị ga-efe m n’ezi-omume;

17 Ma ha nile ndị ana-akpọku aha nke Onye-nwe, ma na-edebe iwu-nsọ ya nile, ga-enwe nzọpụta. Ọbụna otu a. Amen.