Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 28


Nkeji 28

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Oliver Cowdery, na Fayette, New York, Septemba 1830 (History of the Church, 1:109–111). Hiram Page, onye otu Nzukọ-nsọ, nwere otu nkume ma n’ekwu na ya n’anata mkpughe nile site n’enyem-aka ya gbasara mwuli nke Zaịọn na usoro nke Nzukọ-nsọ. Ọtụtụ ndị otu abụwo ndị emegharịrị-anya site n’okwu a, ma ọbụna Oliver Cowdery ka ike si n’ime ya arụ ọrụ metutara n’ụzọ n’ezighị-ezi maka nke a. Tutu enwee ọgbakọ eyịrị-eyi, onye-amụma jiri ya kpọrọ ihe ị jụ Onye-nwe gbasara okwu a, ma mkpughe nke a sochiri.

1–7, Joseph Smith ji ọtụghe-ụzọ nke ihe omimi nile, ma nani ya ga-anata mkpụghe nile nke Nzukọ-nsọ; 8–10, Oliver Cowdery ga-ekwụsa ozi-ọma nye ndị Leman; 11–16, Setan duhiere Hiram Page ma nye ya mkpughe ụgha nile.

1 Lee, a sị m gị, aOliver, na-aga-enye gị ya na a ga-ege gị ntị na nzukọ-nsọ n’ime ihe nile ọbụla ị bga-akụziri ha site na cOnye-nkasị-obi, gbasara mkpughe nile na iwu-nsọ nile nke m nyeworo.

2 Mana, lee, n’ezie, n’ezie a sị m gị ọ adịghị onye a ga-enye ọkwa ị nata iwu-nsọ nile na mkpughe nile na nzukọ-nsọ a ma ọ bụghi nwa odibo m bJoseph Smith, Nta, n’ihi na ọ na-anata ha ọbụna dịka Moses.

3 Ma ị ga-enwe nrube-isi nye ihe nile nke m ga-enye ya, ọbụna dịka aErọn, jiri okwukwe kwupụta iwu-nsọ nile na mkpughe nile, jiri ike na bikike nye nzukọ-nsọ.

4 Ma ọbụrụ na e duuru gị n’oge ọbụla site n’Onye-nkasị-obi ka aikwuo ma-ọbụ kuzie, ma-ọbụ mgbe nile site n’ụzọ nke iwu-nsọ nye nzukọ-nsọ ị ga-eme ya.

5 Kama ịgaghị ede n’ụzọ nke iwu-nsọ; kama site na amamihe;

6 Ma ị gaghị-enye ya iwu bụ onye nọ n’isi gị, n’isi nzukọ-nsọ;

7 N’ihi na e nyewo m ya aọtụghe-ụzọ nke bihe omimi nile ma mkpụghe nile ndị arachiri ruo mgbe m ga-ahọpụtara ha onye ọzọ n’ọnọdụ ya.

8 Ma ụgbu a, lee, a si m gị na ị ga-agakwu andị Leman; ma kwusaara ha bozi-ọma nke m; ma ka ha ra na ha natara nkuzi gị nile ị ga-eme ka ehiwe nzukọ-nsọ m n’etiti ha; ma ị ga-enwe ọtụtụ mkpughe, kama ịgaghị ede ha dịka iwu-nsọ.

9 Ma ugbua, lee, a sị m gị na ekpugheghị ya, ma onweghị nwoke ọbụla maara ebe a ga-ewu aobodo-ukwu nke bZaịọn, kama a ga-enye ya ma-emesịa. Lee, a sị m gị na ọ ga-abụ n’oke nke ndị Leman.

10 Ị gaghị ahapụ ebe nke a ruo mgbe e mesịrị ọgbakọ, ma nwa odịbọm Joseph ka a ga-akpọ ịnọ n’isi ọgbakọ site n’olu nke ya, ma ihe ọ gwara gị ka ị ga-ekwu.

11 Ma ọzọ, ị ga-enwere nwanne gị nwoke, Hiram Page, an’etiti nani gị na ya, ma gwa ya na ihe ndị ahụ bụ ndị edeworo site na nkume ahụ abụghị nke m ma na bSetan e cduhiewo ya;

12 N’ihi na, lee, ihe ndị a abụghị ọkwa e nyere ya, ma-ọbụ onweghị ọkwa a ga-enye onye ọbụla nke otu nzukọ-nsọ a na mmegide ọgbụgba-ndụ nile nke nzukọ-nsọ.

13 N’ihi na a ga-emerịrị ihe nile n’usoro, ma site na ankwekọrịta zuru-ọnụ na Nzukọ-nsọ, site na ekpere nke okwukwe.

14 Ma ị ga-enye ka emezie ihe ndị a nile, dịka ọgbụgba-ndụ nile nke nzukọ-nsọ; tutu Ị ga eje-ije gị n’etiti ndị Leman.

15 Ma a aga-enye gị ya site n’oge mgbe ị gara, ruo n’oge ị ga-abia, ihe i ga eme.

16 Ma ị garịrị emeghe ọnụ gị n’oge nile; n’ekwusa ozi-ọma nke m n’olu nke an̄ụrị. Amen.