Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 118


Nkeji 118

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Far West, Missouri, 8 Julaị 1838, na nzaghachi nye arịrịọ, “Gosi anyị uche gị, O Onye-nwe, gbasara Iri na Abụọ ahụ (History of the Church, 3:46).

1–3, Onye-nwe ga-arọpụta maka ezi na ụlọ nke ndị Iri na Abụọ ahụ; 4–6, Ohere nile enwere n’ime Iri na Abụọ ahụ ka-emejupụtara.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru: ka e nwee ọgbakọ ozugbo; ka ahazie Ndị Iri na Abụọ ahụ; na ka ahọpụta ndị mmadụ aga-anọchi ọnọdụ ndị ahụ dapụrụ.

2 Ka nwa odibo m aThomas nọdụ nwoge nta n’ala nke Zaịọn, ibipụta okwu m.

3 Ka ndị fọdụrụ gaa-n’iru ikwusa ozi-ọma site na awa ahụ, na ọ bụrụ na ha ga-eme nke a n’iwedata onwe ala, na ịdị-nwayọ na amweda na ala, na bogologo-ntachi-obi, Mụ, Onye-nwe, kwere ha otu nkwa na a ga m arọpụta maka ezi na ụlọ ha; na ọnụ-ụzọ bara uru ka a ga-emeghe maka ha, site ugbụ a gaa-n’iru.

4 Na mmalite udu-mmiri ọzọ ka ha pụọ iji gafe nnukwu mmiri nile, na maa-ọkwa ozi-ọma n’ebe ahụ, na uju ya, na gbaa ama maka aha m.

5 Ka ha hapụ ndị nsọ m pụọ na obodo ukwu nke Far West, n’ụbọchị iri-abụọ na isii nke Epril na-abịa, site n’ebe ahụ a na-ewu ụlọ m, ka Onye-nwe kwuru.

6 Ka nwa odibo m John Taylor, na kwa nwa odibo m John E. Page, na kwa nwa odibo m Wilford Woodruff, na kwa nwa odibo m William Richards, bụrụ ndị ahọpụtara ị nọchi ọnọdu nile nke ndị ahụ dapụrụ, na mee ka ha mara n’ụzọ usoro ọrụ maka nhọpụta ha.