Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 35


Nkeji 35

Mkpughe e nyere Joseph Smith onye-amụma na Sidney Rigdon, na ma-ọbụ n’akụkụ Fayette, New York, Disemba 1830 (History of the Church, 1:128–131). N’oge a, onye-amụma nọ n’ọrụ ụbọchị nile n’ime ntụgharị nke Bible. Ntụgharị a malitere na ngwa dịka Jun 1830, ma Oliver Cowdery na John Whitmer arụwo rịị ọrụ dịka ndị ode-akwụkwọ. Ebe a kpọworo ha n’ọrụ ndị ọzọ, akpọrọ Sidney Rigdon site n’inye ọkwa nke dị nsọ ịrụ ọrụ dịka onye ode-akwụkwọ nye Onye-amụma n’ọrụ a(lee ama-okwu 20). Dịka okwu mmalite nye ndekọta ya nke mkpughe a Onye-amụma dere: “Na Disemba Sidney Rigdon biara (site na Ohio) ị jụ site n’ọnụ Onye-nwe, ya na Edward Partridge so kwa bia.… Ntakịrị oge mgbe umunna abụọ ndia rutere, nke a ka Onye-nwe kwuru” (History of the Church, 1:128).

1–2, Otu ndị mmadụ ga-eji enwe ịke ịbụrụ ụmụ nke Chineke; 3–7, Sidney Rigdon ka akpọrọ ime baptism na inyefe Mụọ Nsọ; 8–12, Ihe iriba-ama nile na ọrụ-ebube nile ka a na-arụ na-eme site na okwukwe; 13–16, Umu odibo Onye-nwe ga-ahọcha mba nile site n’ike nke Mụọ; 17–19, Joseph Smith ji ọtụghe ụzọ nile nke ihe omimi nile; 20–21, Ndị ahọpụtara ga-anọ ruo ụbọchị Onye-nwe ga-abịa; 22–27, Israel ga-enwe nzọpụta.

1 Gee nti, n’olu aOnye-nwe Chineke unu, ọbụna bAlfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ, onye cụzọ ya na-adị otu-gburu-gburu ebighi-ebi, ddi otu a taa dịka ụnyahụ, ma ruo mgbe nile.

2 Abụ m Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke, onye a akpọgburu n’ihi mmehie nile nke ụwa, ọbụna ka ha ra bu ndị bkwere n’aha m, ka ha nwe ike ịbụ cụmụ ndịkom nke Chineke, ọbụna dotu n’ime m dịka mụ bụ eotu n’ime Nna, dịka Nna bụ otu n’ime m, ka anyị bụrụ otu.

3 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m nwa odibo m Sidney e lewo m gị-anya na ọrụ gị nile. Anụwo m ekpere gị nile, ma kwado gị maka ọrụ nke karịrị.

4 Ị bụ onye agọziri, n’ihi na ị ga-eme ọtụtụ nnukwu ihe. Lee ezipụwo gị, ọbụna dịka aJọn, ka idozie ụzọ n’iru m, ma tutu bElaịja nke ga-abịa, ma ị mataghi-kwa ya.

5 I mewo baptism site na mmiri maka nchegharị, kama ha a anataghị kwa Mụọ Nsọ.

6 Kama ugbụ a a na-enye gị iwu-nsọ, na ị aga-eme baptism site na mmiri, ma ha ga-anata bMụọ Nsọ site n’ịbịkwasị caka n’isi, ọbụna dịka ndị ozi mgbe ochie.

7 Ma ọ ga-eru a ga-enwe nnukwu ọrụ n’ala, ọbụna n’etiti andị Jentaịlụ, n’ihi na enweghị-uche ha na ihe arụ ha nile gapụtasi ìhè n’anya mmadụ nile.

8 N’ihi na a bụ m Chineke, ma ogwe aka m adịghị amkpụmkpụ, ma a ga m ezi bọrụ ebube nile, cihe iriba-ama nile na ihe iju-anya nile, nye mmadụ nile ndị dkwere n’aha m.

9 Ma onye ọbụla ga-arịọ ya n’aha m an’okwukwe, ha bga-achụpụ cekwensu nile; ha dga-agwọ ndị ọrịa ha ga-eme ka onye-isi nata ịhụ-ụzọ, ka onye ntị chiri nụ ihe, ma onye ogbu ka ha kwuo-okwu, ma ndị ngwọrọ na-eje ije.

10 Ma oge na-abịa ọsọ-ọsọ mgbe a ga-egosi pụta nnukwu ihe nile nye ụmụ nke ndị mmadụ;

11 Kama ma aenweghi okwukwe onweghị ihe a ga-egosi pụta ma-ọbụghị bntọgbọrọ n’efu nile nye cBabịlọn, otu nke ahụ nke mereworo mba nile a n̄ụọ mmanya nke ọnụma nke dịkwa-iko ya.

12 Ma aonweghị ndị na-eme ihe ọma ma ọbụghị ndị dị na njikere ị nabata uju nke ozi-ọma m, nke m zipụworo nye ọgbọ nke a.

13 Ya mere, a kpọlitere m aihe ndị n’adịghị ike nke ụwa, ndị bn’enweghi oke mmụta ma a na-eleda-anya, ka ha họchaa mba nile site n’ike Mụọ m;

14 Ma ogwe-aka ha ga-abụ nke m, ma a ga m abụ ihe aize-mgbọ na ntụchi ya; ma a ga m eke ha ihe-okike ukwu ha, ma ha ga-alụ ọgụ dịka nwoke maka m; ma bndị iro ha nile ga-anọkwa n’okpuru ụkwụ ha; a ga m ekwe ka mma agha cdaa n’ihi ha, ma site dn’ọkụ nke oke-iwe m ka m ga-echekwa ha.

15 Ma onye aogbenye na onye di bnwayọ ga-enwe ozi-ọma e kwusara nye ha, ma ha ga cna-elepụ anya n’ihi oge nke ọbịbịa m, n’ihi na dọdịkwa nso–

16 Ma ha ga-amụta ilu nke osisi afig, n’ihi ọbụna ugbu a ọkọchị adịwo nso.

17 Ma e zipụwo m auju nke ozi-ọma m, site n’aka nwa odibo m bJoseph; ma n’adịghịke ka m gọzịworo ya.

18 Ma e nyewo m ya aọtụghe-ụzọ nile nke ihe omimi nke ihe nile nke a brachiworo, ọbụna ihe nile nọ site na cntọ-ala nke ụwa, ma ihe nile ndị ga-abịa site n’ugbu a ruo oge ọbịbịa m, ọbụrụ na ọ nọgide n’ime m, na ma ọbụghị, onye ọzọ ka m ga-edochi n’ọnọdụ ya.

19 Ya mere, lekọta ya ka okwukwe gị ghara ịda, ma a ga-enye ya site na aOnye-nkasị-obi, bMụọ Nsọ, nke mazuru ihe nile.

20 Ma e nye m gị iwu-nsọ—na gị ga an’edere ya ihe; ma akwụkwọ nsọ nile ka a ga-enye, ọbụna dịka ha dị n’obi m, ruo na nzọpụta nke ndị nke m bahọpụtara;

21 N’ihi ha ga-anụ aolu m, ma hụkwa mụ, ma ha-agaghị arahụ ụra, ma ha bga-anọ ruo ụbọchị cọbịbịa m, n’ihi a ga-asacha ha, ọbụna dịka m ddị ọcha.

22 Ma ugbụ a a sị m agị, nọgide ya, ma ọ ga-eje ije ya gị na ya; a hapụkwala ya, ma n’ezie, ihe ndị a nile ga-emezu.

23 Ma amgbe ọbụna unu anaghi ede, lee, a ga-enye ya ike ibu-amụma; ma ị ga-ekwusa ozi-ọma m ma kpọkuo bndị-amụma-nsọ iji-gosi okwu ya nile, dịka a ga-enye ha ya.

24 aDebe iwu-nsọ nile na ọgbụgba-ndu nile nke e ji kekọọ unu; ma a ga m eme ka elu-igwe nile bma jijiji n’ihi ọdịnma unu, ma cSetan ga-ama jijiji ma Zaịọn dga-an̄ụrị n’elu-ugwụ nile ma baa ụba;

25 Ma a aga-azọpụta bIsrael mgbe oge nke m zuru; ma site na cọtụghe-ụzọ ndị m nyeworo ka-aga-edu ha, ma ha-agaghị kwa enwe mgbogwoju-anya ma ọlị.

26 Welite obi unu nile elu na n̄ụrịa, amgbapụta unu na-erute nso.

27 Egwu atụla unu, igwe-anụ nta, aala-eze ahụ bụ nke unu ruo mgbe m ga-abịa. Lee a na m babịa ọsọ-ọsọ. Ọbụna otu a. Amen.