Akwụkwọ nsọ
Moronaị 4


Isi 4

Otu ndị okenye na ndị nchụ-aja na-esi enye achịcha oriri-nsọ a kọwara ya. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 aỤdị bndị okenye ha na ndị nchụ-aja na-esi enye ndị nzukọ-nsọ ahụ anụ-arụ na ọbara nke Kraịst; ma ha cnyere ya dịka iwu-nsọ nile nke Kraịst siri dị; ya mere anyị matara na ụdị ahụ bụ ezi-okwu; ma okenye ma-ọbụ onye nchụ-aja nyere ya—

2 Ma ha gburu ikpere nʼala ha na ndị nzukọ-nsọ ahụ, ma kpee ekpere nye Nna nʼaha nke Kraịst, na-asị:

3 O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị nʼaha nke Ọkpara gị, Jisus Kraịst, ka ị gọzie ma doo aachịcha nke a nsọ nye mkpụrụ obi nile nke ndị nile ga-eketa oke na ya; ka ha wee rie na bncheta nke arụ nke Ọkpara gị, na gbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha nọ na njikere iwekwasị onwe ha caha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya oge nile, ma na-edebe iwu-nsọ ya nile nke o nyeworo ha, ka ha wee na-enwe dMụọ ya oge nile ịnọnyere ha. Amen.