Akwụkwọ nsọ
Moronaị 1


Akwụkwọ nke Moronaị

Isi 1

Moronaị wee dee maka irite uru nke ndị Leman—Ndị Nifaị ndị nke na-ajụghị Kraịst e gburu ha. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ugbua mụ, aMoronaị, mgbe m bịachaworo na ngwụcha ide na nke-nke nke nkọwasị nke ndị nke Jared, echere m rị na-agaghị m ede kwa ọzọ, mana anwụbeghị m; ma anaghị m eme onwe m ka ndị Leman mata m eleghị anya ha ga-egbu m.

2 N’ihi na lee, aịlụ-agha ha nile dị egwu nʼetiti onwe ha; ma n’ihi ịkpọ-asị ha, ha bgburu onye Nifaị ọbụla nke na-agaghị agọnarị Kraịst ahụ.

3 Ma mụ, Moronaị, agaghị aagọnarị Kraịst ahụ; ya mere, ana m akpagharị ebe ọbụla m nwere ike maka nchekwa nke ndụ nke onwe m.

4 Ya mere, ana m ede ihe ole na ole ndị ọzọ, megidere ihe nke m chewororị; n’ihi na echewo m rịị ka m ghara ide kwa ọzọ; mana ana m ede ihe ole na ole ndị ọzọ, na mgbe ụfọdụ ha ga-abara ụmụnne m nwoke ndị Leman uru, nʼụbọchị dị nʼiru, dịka ọchịchọ nke Onye-nwe siri dị.