Akwụkwọ nsọ
Moronaị 9


Akwụkwọ-ozi nke abụọ nke Mọmọn degaara nwa ya nwoke Moronaị.

Mejupụtara isi 9.

Isi 9

Ma ndị Nifaị ma ndị Leman e metọrọ ha ma si nʼomume-kwesịrị-ekwesị wezuga onwe ha—Ha na-ata ahụhụ ma na-egburịta onwe ha—Mọmọn wee kpee ekpere ka amara na ịdị-mma wee nọkwasị Moronaị ruo mgbe nile. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Nwa m nwoke m hụrụ-nʼanya, ana m e dere gị akwụkwọ ọzọ ka i wee mata na m ka dị ndụ; mana ana m ede ihe ole na ole maka ihe nke dị mwute.

2 N’ihi na lee, enwewo m nnukwu ịlụ-agha mụ na ndị Leman, nʼime nke anyị na-emerighị; ma Akeantus adawo site na mma-agha ahụ; na kwa Lụram na Emrọn; e, ma anyị atụfuwo nnukwu ọnụ-ọgụgụ nke ndị nwoke anyị họọrọ ahọ.

3 Ma ugbua lee, nwa m nwoke, egwu na-atu m eleghị-anya ndị Leman ga-ebibi ndị a; n’ihi na ha anaghị echegharị, ma Setan na-akpasu ha iwe otu onye megide ibe ya esepụghị-aka.

4 Lee, eso m ha nʼarụ ọrụ esepụghị-aka; ma mgbe m kwuru okwu nke Chineke anʼịdị-nkọ, ha na ama jijiji ma na-eweso m iwe; ma mgbe m na-ejighi idi-nkọ ha na-emesi obi ha ike megide ya; ya mere, egwu na-atụ m na-eleghị-anya Mụọ nke Onye-nwe akwụsịwo bịnọnyere ha.

5 N’ihi na nnukwu ka ha na-ewe iwe karịa nke mere na ọ dị m ka ha anaghị atụ egwu maka ọnwụ; ma ha atụfuwo ịhụ-nʼanya ha, otu onye nʼebe ibe ya nọ; ma ha nwere aagụụ ọbara na ịbọ-ọbọ esepụghị-aka.

6 Ma ugbua, nwa m nwoke m hụrụ-nʼanya, na-agbanyeghị obi ike ha, ka anyị agbalisie ike nʼọrụ; n’ihi na ọbụrụ na anyị ga-akwụsị bịrụ ọrụ, a ga-eweta anyị nʼokpuru amam-ikpe; n’ihi na anyị nwere ọrụ anyị ga-arụ mgbe nile anyị nọ nʼụlọ nke a e jiri ụrọ wuo, ka anyị wee merie onye-iro nke ezi-omume nile ahụ, ma nye mkpụrụ-obi anyị izu-ike nʼala-eze nke Chineke.

7 Ma ugbua ana m ede ihe ole na ole gbasara ịta-ahụhụ nke ndị a. N’ihi na dịka mmụta nke m nataworo site nʼaka Amọrọn, lee, ndị Leman nwere ọtụtụ ndị-mkpọrọ, nke ha wetara site nʼụlọ-elu tọwa nke Sheraịza; ma e nwere ndịkom, ndịnyom na ụmụ-ntakịrị.

8 Ma ndị di nile na ndị nna nile nke ndịnyom na ụmụ-ntakịrị ndị a ka ha gbuworo; ma ha nyejuru ndịnyom ahụ afọ site nʼanụ-arụ nke ndị di ha, ma ụmụ-ntakịrị ahụ nʼanụ-arụ nke ndị nna ha; ma ọdịghị mmiri, ma ọbụghị ntakịrị, ka ha na enye ha.

9 Ma na-agbanyeghị nnukwu ihe aru nke ndị Leman a, ọ karịghị nke ndị nke anyị bi na Moriantọm. N’ihi na lee, ọtụtụ ụmụ-ada nke ndị Leman ka ha kpọrọworo ndị-mkpọrọ; ma mgbe ha napụworo ha ihe ahụ nke ha hụkarịsịrị-nʼanya ma dị mkpa karịa ihe nile, nke bụ aịdị-ọcha-mmekọrịta na bezigbo-omume

10 Ma mgbe ha meworo ihe nke a ha gburu ha nʼụzọ obi-ọjọọ kachasị njọ, na-ata arụ ha ahụhụ ọbụna ruo nʼọnwụ; ma mgbe ha mesịworo nke a, ha richapụrụ anụ-arụ ha dịka anụ ọhịa nile; n’ihi isi-ike nke obi ha nile; ma ha na-eme ya maka ihe aka-ebe nke atụghị-egwu.

11 O nwa m nwoke m hụrụ-nʼanya, olee otu ndị di otu a, ndị na-enweghị ọzụzụ—

12 (Ma nanị afọ ole na ole gafeworo, ma ha bụụrụ ndị a zụrụ azụ na ndị mara ezigbo mma ile-anya)

13 Mana O nwa m nwoke, olee otu ndị dị otu a, ndị ihe na amasị ha dị nʼime ihe arụ dị ukwuu otu a—

14 Olee otu anyị ga-esi tụọ-anya na Chineke aga-akwụsị aka ya nʼikpe ikpe megide anyị?

15 Lee, obi m na-eti mkpu: ahụhụ na-adịrị ndị a. Pụta nʼikpe-ikpe, O Chineke, ma zoo mmehie ha nile, na ajọọ-omume, na ihe arụ nile site nʼiru gị!

16 Ma ọzọ, nwa m nwoke, e nwere ọtụtụ andịnyom isinkpe na ụmụ-ada ha ndị nọgidere na Sheraịza; na ihe oriri nke ahụ ndị Leman na-ebupụghị, lee, ndị-agha nke Zinafaị ebupụwo, ma hapụ ha ka ha na-agagharị ebe ọbụla ha nwere ike maka nri; ma ọtụtụ ndị agadi-nwanyị na ada-mba nʼụzọ ma nwụọ.

17 Ma ndị-agha nke mụ na ha nọ esighị-ike; ma ndị-agha nile nke ndị Leman nọ nʼetiti Sheraịza na mụ; ma ka ha ra bụ ndị gbakwugaworo ndị-agha nke aErọn e mewo ka ha taa ahụhụ nye enweghị obi ebere ha.

18 O mmetọ nke ndị m! Ha enweghị usoro ma ha enweghị ebere. Lee, abụ m nanị otu nwoke, ma enwere m nanị ume nke otu nwoke, ma enweghịkwa m ike ọzọ ime ka iwu m nile dị ire.

19 Ma ha esịwo ezigbo ike nʼekweghị ekwe ha; ma nʼotu aka ahụ ha enweghị ebere, na edebeghị onye ọbụla, ọbụghị ma-ọbụ okenye ma-ọbụ nwata; ma ha nwere mmasị nʼihe nile ma-ewezuga ihe ahụ nke dị mma; ma ịta-ahụhụ nke ndịnyom anyị na ụmụntakịrị anyị nʼelu iru nile nke ala nke a karịrị ihe nile; e, ire enweghị ike ịkọ, ọbụghị ma e nwere ike ide ya.

20 Ma ugbua, nwa m nwoke, agaghị m anọgide kwa ọzọ nʼihe nkiri nke a dị egwu. Lee, ị matara ajọọ-omume nke ndị a; ị matara na ha enweghị ụkpụrụ-ọma, ma ha agafewo inwe-mmetụta; ma ajọọ-omume ha akarịrị nke ndị Leman.

21 Lee, nwa m nwoke, enweghị m ike ịkọ-akụkọ-ọma maka ha nye Chineke eleghị-anya ya enye m otiti ihe.

22 Mana lee, nwa m nwoke ana m akọ-akụkọ-ọma maka gị nye Chineke, ma atụkwasịrị m obi na Kraịst na a ga-azọpụta gị; ma ana m ekpere Chineke ka o wee adebe ndụ gị, ịhụ nlaghachị nke ndị ya nʼebe ọ nọ, ma-ọbụ mbibi kpam-kpam ha; n’ihi na a matara m na ha ga-ala nʼiyi ma ọbụghị na ha bchegharịrị ma laghachị-kwute ya.

23 Ma ọbụrụ na ha laa nʼiyi ọ ga-adị ka nke ndị Jared, n’ihi ịdị na njikere nke obi ha nile, aịchọ ọbara na bịbọ-ọbọ.

24 Ma ọbụrụ na ha nwụọ, anyị matara na ọtụtụ ụmụnne anyị-ndị-nwoke aagbapụwo gakwuru ndị Leman, ma ọtụtụ ndị ọzọ ga-agbapụkwa gakwuru ha; ya mere, detụ ihe ntakịrị ole na ole, ma ọbụrụ na edebe gị ma aga m anwụ ma ahụghị m gị; mana atụkwasịrị m obi na aga m ahụ gị nʼoge na-adịghị-anya; n’ihi na-eji m akụkọ-ndekọta nile dị nsọ nke m bga-enyefe gị nʼaka.

25 Nwa m nwoke, nwee okwukwe na Kraịst; ma ka ihe nile ndị nke m deworo ghara iwute gị, ịnyida gị ruo ọnwụ; kama ka Kraịst bulite gị elu, ma ka aahụhụ ya nile na ọnwụ, na ngosi nke arụ ya nye ndị nna anyị, na ebere ya na ogologo ntachi-obi, na olile-anya nke otuto ya na nke bndụ ebighi-ebi, dịrị nʼime cobi gị ruo mgbe nile.

26 Ma ka amara nke Chineke Nna, onye oche-eze ya dị elu nʼelu-igwe nile, na Onye-nwe anyị Jisus Kraịst, onye na-anọdụ anʼaka-nri nke ike ya, ruo mgbe ihe nile ga-adị nʼokpuru ya, dịrị ma nọnyere gị ruo mgbe nile. Amen.