Akwụkwọ nsọ
Moronaị 7


Isi 7

E nyere ọkpụkpọ-oku ịba nʼime ezumike nke Onye-nwe—Jiri ezigbo ebum-nʼobi kpee ekpere—Mụọ nke Kraịst na-enyere ndị mmadụ aka ịmata ihe-ọma site nʼihe ọjọọ—Setan na eduba ndị mmadụ nʼịgọnarị Kraịst ma na-eme ihe ọjọọ—Ndị-amụma nile na-egosipụta ọbịbịa nke Kraist—Site nʼokwukwe a na-arụ ọrụ-ebube nile ma ndị mụọ-ozi na akụzi ihe—Ndị mmadụ kwesịrị ile-anya ndụ ebighi-ebi ma rapara nʼafọ-ọma. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, Moronaị, na-ede ihe ole na ole nʼokwu nile nke nna m Mọmọn, ndị nke o kwuru gbasara aokwukwe, olile-anya, na afọ-ọma; n’ihi na nʼụdị a ka o siri gwa ndị ahụ okwu, dịka ọ na akụziri ha ihe nʼụlọ-nzukọ nke ha wuworo maka ebe ife ofufe.

2 Ma ugbua mụ, Mọmọn, na-agwa unu okwu ụmụnne m nwoke m hụrụ-nʼanya; ma ọ bụ site nʼamara nke Chineke Nna, na Onye-nwe anyị Jisus Kraịst, na ọchịchọ ya dị nsọ, n’ihi onyinye nke aọkpụkpọ ọ kpọrọ m, ka e nyere m ohere ịgwa unu okwu nʼoge nke a.

3 Ya mere, aga m agwa unu ndị bụ nke nzukọ-nsọ ahụ okwu, ndị bụ ndị na-eso Kraịst nʼudo, na ndị nwetaworo olile-anya zuru ezu site na nke unu ga-enwe ike ịba anʼizu-ike nke Onye-nwe, site nʼoge nke a gaa nʼiru ruo mgbe unu na ya ga-ezu-ike nʼelu-igwe.

4 Ma ugbua ụmụnne m nwoke, ana m ekpebi ihe ndị a maka unu n’ihi aịga ije udo unu na ụmụ nke mmadụ.

5 N’ihi na echetara m okwu nke Chineke nke sịrị site nʼọrụ ha nile unu aga-amata ha; n’ihi na ọbụrụ na ọrụ ha nile dị mma, mgbe ahụ ha dị kwa mma.

6 N’ihi na lee, Chineke ekwuwo onye dị anjọ enweghị ike ime ihe ahụ nke dị mma; n’ihi na ọbụrụ na o nye onyinye, ma-ọbụ bkpee ekpere nye Chineke, ma ọbụghị na ọ ga-eji ezigbo ebum-nʼobi mee ya ọdịghị uru ọ ga-abara ya.

7 N’ihi na lee, agaghị agụnyere ya ihe ahụ nʼezi-omume.

8 N’ihi na lee, ọbụrụ na onye dị anjọ na-enye onyinye, ọ na-eme ya bna-enweghị mmasị; ya mere a na-agụnyere ya ihe ahụ dịka o dotara onyinye ahụ; ya mere a na-agụ ya onye ọjọọ nʼiru Chineke.

9 Ma otu ahụ kwa a na-agụrụ ya mmadụ ihe ọjọọ, ma ọbụrụ na ọ ga-ekpe ekpere ma o jighị aezigbo ebum-nʼobi; e, ọdịghị uru ọ ga-abara ya, n’ihi na Chineke anaghị anabata onye ọbụla dị otu ahụ.

10 Ya mere, onye dị njọ enweghị ike ime ihe ahụ nke dị mma; ọbụghị ma ọ ga-enye onyinye dị mma.

11 N’ihi na lee, aisi mmiri dị ilu enweghị ike ịgbapụta mmiri dị mma; ọbụghị ma isi mmiri dị mma o nwere ike ịgbapụta mmiri dị ilu; ya mere, onye bụ nwa-oru nke ekwensu enweghị ike iso Kraịst; ma ọbụrụ na o bsoro Kraịst o nweghị ike ịbụ nwa-oru nke ekwensu.

12 Ya mere, ihe nile nke dị amma na-esi nʼaka Chineke wee bịa; ma ihe ahụ nke dị bnjọ na-esi nʼaka ekwensu wee bịa; n’ihi na ekwensu bụ onye-iro nke Chineke, ma na-alụ ọgụ megide ya esepụghị-aka, ma na-akpọ oku ma na-eto akpịrị ime cmmehie, na ime ihe ahụ nke dị njọ esepụghị-aka.

13 Mana lee, ihe ahụ nke bụ nke Chineke na-akpọ-okụ ma na-eto-akpịrị ime ihe ọma esepụghị-aka; ya mere, ihe nile nke na-akpọ-okụ ma ana-eto-akpịrị ime ihe ọma, na ịhụ Chineke nʼanya, na ijere ya ozi, mụọ nke Chineke bkwalitere ya.

14 Ya mere, kpachapụ-anya, ụmụnne m nwoke m hụrụ-nʼanya, ka unu ghara ikpe-ikpe ihe ahụ nke dị anjọ ịbụ nke Chineke, ma-ọbụ ihe ahụ nke dị mma na nke Chineke ịbụ nke ekwensu.

15 N’ihi na lee, ụmụnne m nwoke, e nyere ya unu aikpe ikpe, ka unu wee mata ihe ọma site nʼihe ọjọọ; ma ụzọ esị ekpe ikpe dị mfe nghọta, ka unu wee jiri ọmụma-ihe zuru-oke mata, dịka ìhè-nke-ehihie siri dị site nʼabalị-nke-ọchịchịrị.

16 N’ihi na lee, aMụọ nke Kraịst ka e nyere mmadụ nile, ka ha wee bmata ihe ọma site nʼihe ọjọọ; ya mere, ana m egosị unu ụzọ a na-esi ekpe ikpe; n’ihi na ihe ọbụla nke na-akpọ-okụ ime ihe ọma, na-eme ka mmadụ kwenye na Kraịst, ezitara ya site nʼike na onyinye nke Kraịst; ya mere unu ga-eji ọmụma-ihe zuru-oke mata na ọ bụ nke Chineke.

17 Mana ihe ọbụla nke na-eme ka mmadụ kwenye ime aihe ọjọọ, ma ghara ikwere na Kraịst, ma gọnarị ya, ma ghara ijere Chineke ozi, mgbe ahụ unu ga-eji ọmụma-ihe zuru-oke mata na ọ bụ nke ekwensu; n’ihi na nʼụdị a ka ekwensu na-esị arụ ọrụ, n’ihi na ọ naghị eme ka mmadụ kwenye ime ihe ọma, e-e, ọdịghị ma ọlị; ọbụghị ma ndị mụọ-ozi ya ha ga-eme otu ahụ; ọbụghị ma ndị na-etinye onwe ha nʼokpuru ya ha ga-eme otu ahụ.

18 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, ebe unu na-hụ na unu matara ihe ahụ site na nke unu ga-esi kpee ikpe, bụ ihe nke bụ aihe nke Kraịst, hụ na unu ekpeghị ikpe nke na ezighị-ezi; n’ihi na otu bikpe-ikpe ahụ nke unu ji na-ekpe ka a ga-eji kwa kpee unu.

19 Ya mere, ana m arịọ unu, ụmụnne m nwoke, ka unu wee chọsie-ike anʼihe nke Kraịst ka unu wee mata ihe ọma site nʼihe ọjọọ; ma ọbụrụ na unu ga-ejidesi ihe ọma ọbụla ike, ma ghara ịkwutọ ya, unu ga-abụrịrị bnwa nke Kraịst.

20 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, olee otu o siri kwe omume na unu nwere ike ijidesi ihe ọma ọbụla ike?

21 Ma ugbua abịa m nʼokwukwe ahụ, nke m sịrị na m ga-ekwu maka ya; ma aga m agwa unu ụzọ nke unu ga-esị jidesie ihe ọma ọbụla ike.

22 N’ihi na lee, Chineke ebe ọ amazuru ihe nile, ebe ọ nọ site na mgbe nile na-adigide ruo na mgbe nile na-adigide, lee, o zipụrụ bndị mụọ-ozi ịkụziri ụmụ nke mmadụ, ime ka ọ pụta-ihe gbasara ọbịbịa nke Kraịst; ma nʼime Kraịst ka ihe ọma nile ga-esị wee bịa.

23 Ma Chineke kwupụtakwara nye ndị-amụma, site nʼọnụ nke onwe ya, na Kraịst ga-abịa.

24 Ma lee, e nwere ọtụtụ ụzọ o gosịpụtara ihe nile nye ụmụ nke mmadụ, ndị nke dịịrị mma; ma ihe nile nke dị mma na-esi na Kraịst wee bịa; ma ọdịghị otu a ndị mmadụ adara ada, ma e nweghị ihe ọma ọbụla nwere ike ịbịakwute ha.

25 Ya mere, site na nkwusa ozi nke andị mụọ-ozi, na site nʼokwu ọbụla nke ga-esi nʼọnụ nke Chineke pụta, ndị mmadụ malitere igosi okwukwe nʼime Kraịst; ma otu a site nʼokwukwe, ha jidesịrị ihe ọma ọbụla ike; ma otu a ka ọ dịịrị ruo ọbịbịa nke Kraịst.

26 Ma mgbe ọ bịasịworo a zọpụtakwara ndị mmadụ site nʼokwukwe nʼaha ya; ma site nʼokwukwe, ha ghọrọ ụmụ ndị nwoke nke Chineke. Ma dịka ọ bụ ezi-okwu na Kraịst na-adị ndụ ọ gwara ndị nna anyị okwu ndị a nile, na-asị: aIhe ọbụla unu ga-arịọ Nna nʼaha m, nke dị mma, nʼokwukwe kwere na unu ga-anata, lee, a ga-emere unu ya.

27 Ya mere, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, aọrụ-ebube nile ha akwusịwo n’ihi na Kraịst arịgorowo nʼelu-igwe, ma ọ nọdụwo nʼaka nri nke Chineke, na bịnata site nʼaka Nna ihe nile ruru ya nke ebere nke o nwere nʼarụ ụmụ nke mmadụ?

28 N’ihi na ọ zawo nsọtụ nile nke iwu ahụ, ma ọ na-akpọrọ ndị nile nke nwere okwukwe na ya; ma ndị nke nwere okwukwe na ya aga-arapara nʼihe ọma ọbụla; ya mere ọ bna-ekwuchita ihe gbasara ụmụ nke mmadụ; ma ọ na-ebi ebighi-ebi nʼelu-igwe nile.

29 Ma n’ihi o mewo nke a, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, ọrụ-ebube nile ha akwụsịwo? Lee asị m unu, e-e, ọbụghị ma ndị mụọ-ozi ha akwụsịwo ịkụziri ụmụ nke mmadụ ihe.

30 N’ihi na lee, ha nọ nʼokpuru ya, ịkụzi dịka okwu nke iwu-nsọ ya siri dị, na-egosị ha onwe ha bụ ndị nwere okwukwe siri ike na echiche kwusịrị ike nʼụdị nile nke ụdị iyi Chineke.

31 Ma ọkwa-ọrụ nke ije-ozi ha bụ ịkpọta ndị mmadụ na nchegharị, na imejupụta na ịrụ ọrụ nke ọgbụgba-ndụ nile nke Nna, nke o meworo nye ụmụ nke mmadụ, idozi ụzọ nʼetiti ụmụ nke mmadụ, site nʼikwupụta okwu nke Kraịst nye ndị a họpụtara dịka ngwa-ọrụ nke Onye-nwe, ka ha wee gbaa ama maka ya.

32 Ma site nʼime otu ahụ, Onye-nwe Chineke na akwado ụzọ nke ga-eme ka ndị mmadụ ndị nke fọdụrụ wee nwee aokwukwe na Kraịst, ka Mụọ Nsọ wee nwee ọnọdụ nʼobi ha nile, dịka ike nke dị nʼime ya siri dị; ma nʼụdị a ka Nna si na-eweta na mmezu, ọgbụgba-ndụ nile ahụ nke o meworo nye ụmụ nke mmadụ.

33 Ma Kraịst asịwo: aỌbụrụ na unu ga-enwe okwukwe na m unu ga-enwe ike ime ihe ọbụla nke m chere dị bmkpa.

34 Ma ọ sịwo: aChegharịa unu nsọtụ nile nke ụwa, ma bịakwute m, ma ka e mee unu baptism nʼaha m, ma nwee okwukwe na m, ka e wee zọpụta unu.

35 Ma ugbua ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, ọbụrụ na nke a bụ otu ọ dị na ihe ndị a bụ ezi-okwu nke m gwaworo unu, ma Chineke ga-egosị unu, jiri aike na nnukwu otuto bnʼụbọchị ikpe-azụ ahụ, na ha bụ ezi-okwu, ma ọbụrụ na ha bụ ezi-okwu ụbọchị nke ọrụ-ebube nile ọ kwusịwo?

36 Ma-ọbụ ndị mụọ-ozi ha akwụsịwo igosịpụta onwe ha nye ụmụ nke mmadụ? Ma-ọbụ o ajibidowo ike nke Mụọ Nsọ ahụ site nʼebe ha nọ? Ma-ọbụ ọ ga-eme otu ahụ, ogologo mgbe nile oge ga-adịgịde, ma-ọbụ ụwa ga-eguzoro, ma-ọbụ a ga-enwe otu onye nʼelu iru ya a ga-azọpụta?

37 Lee asị m unu, E-e; n’ihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka a na-eme aọrụ-ebube nile; ma ọ bụ site nʼokwukwe ka ndị mụọ-ozi na-egosipụta onwe ha ma na akụziri ndị mmadụ; ya mere, ọbụrụ na ihe ndị a akwusịwo ahụhụ na-adịrị ụmụ nke mmadụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi bekweghị-ekwe, ma ihe nile bụ ihe efu.

38 N’ihi na-agaghị azọpụta mmadụ, dịka okwu nile nke Kraịst siri dị, ma ọbụghị na ha ga-enwe okwukwe nʼaha ya; ya mere, ọbụrụ na ihe ndị a akwusịwo, mgbe ahụ ka okwukwe kwụsịwokwara; ma egwu ka ọnọdụ nke mmadụ dị, n’ihi na ha nọ dịka a ga-asị na-ọdibeghị mgbapụta e mere.

39 Mana lee, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, ana m ekpe unu ikpe ihe ndị ka mma, nʼihi na ana m ekpe na unu nwere okwukwe na Kraịst n’ihi ịdị umeala unu; n’ihi na ọbụrụ na unu enweghị okwukwe na ya mgbe ahụ unu aekwesịghị ka a gụnye unu nʼetiti ndị nke nzukọ-nsọ ya.

40 Ma ọzọ, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, aga m agwa unu okwu gbasara aolile-anya. Olee otu ọ ga-esi mee na unu ga-enwe ike toruo nʼinwe okwukwe, ma ọbụghị na unu ga-enwe olile-anya?

41 Ma-ọbụ gịnị ka unu ga-enwe aolile-anya ya? Lee asị m unu na unu ga-enwe bolile-anya site nʼaja mgbaghara mmehie nke Kraịst na ike nke mbilite nʼọnwụ, ịkpọlite unu ịdị cndụ ebighi-ebi, ma nke a n’ihi okwukwe unu na ya dịka nkwa ahụ siri dị.

42 Ya mere, ọbụrụ na mmadụ enwe aokwukwe o bkwesịrị inwe olile-anya; n’ihi na ma enweghị okwukwe enweghị ike inwe olile-anya.

43 Ma ọzọ, lee asị m unu o nweghị ike inwe okwukwe na olile-anya, ma ọbụghị na ọ ga-adị anwayọ ma wedata obi ala.

44 Ọbụrụ otu ahụ, aokwukwe ya na olile-anya bụ ihe efu, n’ihi na ọdịghị onye a na-anabata nʼiru Chineke, ma ọbụghị na ọ di nwayọ ma wedata obi ala; ma ọbụrụ na mmadụ adị nwayọ ma wedata obi ala, ma bkwupụta site nʼike nke Mụọ Nsọ na Jisus bụ Kraịst ahụ, o kwesịrị inwe afọ-ọma; n’ihi na ọ bụrụ na o nweghị afọ-ọma ọdịghị ihe ọ bụ; ya mere o kwesịrị inwe afọ-ọma.

45 Ma aafọ-ọma nwere ogologo ntachi-obi, ma o nwere obi ọma, ma ọ naghị enwe bntaji-anya, ma ọ naghị afụli elu, ọ naghị achọ nke ya, ọdịghị-mfe ịkpasu ya iwe, ọ naghị eche ihe ọjọọ, ma ọ naghị enwe ọn̄ụ nʼajọọ-omume kama ọ na enwe ọn̄ụ nʼezi-okwu, na-edi ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-anagide ihe nile.

46 Ya mere, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, ọbụrụ na unu enweghị afọ-ọma, ọdịghị ihe unu bụ, n’ihi na afọ-ọma anaghị ada-ada mgbe ọbụla. Ya mere, rapara nʼafọ-ọma, nke bụ nke kachasị ha nile, n’ihi na ihe nile ga-adarịrị—

47 Mana aafọ-ọma bụ bịhụnanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ, ma ọ na-edi ndidi ruo mgbe nile; ma onye ọbụla a chọtara nwere ya nʼụbọchị ikpe-azụ, ọ ga-adịrị ya mma.

48 Ya mere, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, Jiri nu ike nile nke obi unu akpere Nna, ka e wee mejupụta unu nʼihụnanya nke a, nke o nyekwasịworo ndị nile bụ bndị na-eso Ọkpara ya, Jisus Kraịst nʼezi-okwu; ka unu wee ghọọ ụmụ-nwoke nke Chineke; nke ga-eme na mgbe ọ ga-apụta-ihe anyị cga-adị ka ya, n’ihi na anyị ga-ahụ ya otu ọ dị; ka anyị wee nwe olile-anya nke a; ka e wee dsachaa anyị ọbụna dịka o siri dị nʼenweghị ntụpọ. Amen.