Akwụkwọ nsọ
Moronaị 6


Isi 6

Ndị nke chegharịrị a na-eme ha baptism ma mere ha enyi—Ndị nzukọ-nsọ nke chegharịrị a na-agbaghara ha—Nzukọ nile a na eduzi ya site nʼike nke Mụọ Nsọ. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua ana m ekwu gbasara abaptism. Lee, ndị okenye, ndị nchụ-aja, na ndị nkuzi e mere ha baptism; ma emeghị ha baptism ma ọbụghị na ha wepụtara mkpụrụ gosịrị na ha btozuru-oke ịnata ya.

2 Ọbụghị ma ha nabatara onye ọbụla ime baptism ma ọbụghị na ha jiri aobi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị bịarute, ma gbaa ama nʼiru nzukọ-nsọ ahụ na ha chegharịrị nʼezi-okwu site na mmehie ha nile.

3 Ma ọdịghị ndị anabatara ime baptism ma ọbụghị ma ha awekwasịrị onwe ha aha nke Kraịst, na-enwe mkpebi ijere ya ozi ruo ọgwụgwụ.

4 Ma mgbe a nabatasịworo ha na baptism, ma e mere ha ma asachaa ha site nʼike nke Mụọ Nsọ, a gụnyere ha nʼetiti ndị nke nzukọ-nsọ nke Kraịst ahụ; ma e bdere aha ha, ka e wee cheta ha ma zụọ ha site nʼokwu ọma nke Chineke, idebe ha nʼezi ụzọ ahụ, ma nyere ha aka ciche-nche esepụghị aka nʼekpere, dna-adabere na nanị nʼikwesị-ụgwọ ọrụ nke Kraịst, onye bụụrụ eonye-mbụ-wetara na onye mmecha nke okwukwe ha.

5 Ma anzukọ-nsọ ahụ gbakọtara ọnụ bugboro-ugboro, cibu ọnụ na ikpe ekpere, na ikwurịta okwu otu onye na ibe ya gbasara ọdịmma nke mkpụrụ-obi ha nile.

6 Ma ha gbakọtara ọnụ ugboro-ugboro iketa-oke nʼachịcha na mmanya, na ncheta nke Onye-nwe Jisus.

7 Ma ha siri ike nʼiru na e nweghị aajọọ-omume nʼetiti ha; ma onye ọbụla nke a chọpụtara na-eme ihe ọjọọ, na bndị aka-ebe mmadụ atọ nke nzukọ-nsọ ahụ mara ha ikpe nʼiru cndị okenye ahụ, ma ọbụrụ na ha echegharịghị, ma ha dekwupụtaghị, eehichapụrụ aha ha, ma agụnyeghị ha nʼetiti ndị nke Kraịst.

8 Ma augbọrọ ole ọbụla nke ha chegharịrị ma chọọ mgbaghara mmehie, jiri ezigbote ebum-nʼobi, a bgbaghaara ha.

9 Ma ọgbakọ ha nile ka nzukọ-nsọ ahụ aduziri nʼụdị nke ịrụ-ọrụ nile nke Mụọ, na site nʼike nke bMụọ Nsọ; n’ihi na dịka ike nke Mụọ Nsọ duru ha nʼihe nke ha ga-ekwusa, ma-ọbụ ịgba-ume, ma-ọbụ ikpe ekpere, ma-ọbụ ịrịọ, ma-ọbụ ịbụ-abụ, ọbụna otu ahụ e mere ya.