Akwụkwọ nsọ
Moronaị 2


Isi 2

Jisus nyere ndị na-eso-ụzọ iri na abụọ nke ndị Nifaị ike inyefe onyinye nke Mụọ Nsọ. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Okwu nile nke Kraịst, nke ọ gwara andị-na-eso-ụzọ ya, iri na abụọ ndị nke ọ họrọworo, dịka o bikwasịrị aka ya abuọ nʼisi ha—

2 Ma ọ kpọrọ ha aha, na-asị: Unu ga-akpọku Nna nʼaha m, nʼekpere siri ike; ma mgbe unu meworo nke a unu ga-enwe aike nke ga-eme na onye ọbụla unu ga-ebikwasị baka unu nʼisi ya, cunu ga-enye ya Mụọ Nsọ; ma nʼaha m ka unu ga-enye ya, n’ihi na otu a ka ndị-ozi m na-eme.

3 Ugbua Kraịst gwara ha okwu nile ndị a nʼoge ọ pụtara ihe nke mbụ; ma igwe-mmadụ ahụ anụghị ya, mana ndị-na-eso-ụzọ ya ahụ nụrụ ya; ma ka ha ra bụ ndị nile ha abikwasịrị aka nʼisi, Mụọ Nsọ ahụ dakwasịrị ha.