Akwụkwọ nsọ
Moronaị 8


Isi 8

Ime ụmụ-ntakịrị baptism bụ ihe arụ ọjọọ—Ụmụntakịrị dị ndụ nʼime Kraịst nʼihi Aja mgbaghara mmehie ahụ—Okwukwe, nchegharị, ịdị-nwayọ na ịwedata obi ala, ịnata Mụọ Nsọ ahụ, na idigide ruo ọgwụgwụ na-eduba na nzọpụta. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Akwụkwọ-ozi nke anna m Mọmọn, e detaara m, Moronaị; ma e detaara m ya ntakịrị oge mgbe a kpọsịworo m nʼije-ozi ahụ. Ma nʼudi dị otua ka o detaara m akwụkwọ, na-asị:

2 Nwa m nwoke m hụrụ nʼanya, Moronaị, ana m an̄ụrị-ọn̄ụ karịa na Onye-nwe gị Jisus Kraịst na-echeta gị, ma ọ kpọwo gị nʼije-ozi ya, na nʼọrụ ya dị nsọ.

3 Ana m echeta gị oge nile nʼekpere m nile, na-ekpere Chineke Nna esepụghị-aka nʼaha nke Nwa ya dị Nsọ, Jisus, na ya, site anʼịdị-mma na bamara ya nʼenweghị oke, ga-edebe gị nʼoge nile site na ndidi nke okwukwe nʼaha ya ruo ọgwụgwụ.

4 Ma ugbua, nwa m nwoke, ana m agwa gị okwu gbasara ihe ahụ nke na-ewute m karịa; n’ihi na ọ na-ewute m na aịrụ-ụka nile ga-amalite nʼetiti unu.

5 N’ihi na ọbụrụ na a matara m nke bụ ezi-okwu, e nwererịị ịrụ-ụka nile nʼetiti unu gbasara ime ụmụ-ntakịrị unu baptism.

6 Ma ugbua, nwa m nwoke, achọrọ m ka unu rụsie ọrụ ike, ka e wee wepụ nnukwu amaghị-eme nke a site nʼetiti unu; n’ihi na maka ebum-nʼobi nke a ka m deworo akwụkwọ-ozi a.

7 N’ihi na mgbe m matasịworo ihe ndị a maka unu, ajụtara m Onye-nwe gbasara ihe ahụ. Ma aokwu nke Onye-nwe bịaruru m site nʼike nke Mụọ Nsọ, na-asị:

8 Gee-ntị nʼokwu nile nke Kraịst, Onye-mgbapụta unu, Onye-nwe unu na Chineke unu. Lee, abịara m nʼụwa ọbụghị ịkpọ ndị ezi-omume kama ndị-mmehie ka ha chegharịa; andị arụ siri ike mkpa dibịa anaghị akpa ha, kama ndị arụ na-esighị-ike; ya mere, bụmụ-ntakịrị czụrụ ọke, n’ihi na ha enweghị ike ime dmmehie; ya mere ọbụbụ-ọnụ nke eAdam e wepụworo ha ya nʼime m, nke mere na onweghị ike nʼarụ ha; ma iwu nke fibe-ugwu ewepụwo ya nʼime m.

9 Ma nʼụdị a ka Mụọ Nsọ siri gosipụta okwu nke Chineke nye m; ya mere, nwa m nwoke m hụrụ nʼanya, ama m na ọ bụ ezigbo ịkwa-emo nʼiru Chineke, na unu ga-eme ụmụ-ntakịrị baptism.

10 Lee asị m unu na ihe nke a ka unu ga-akụzi—nchegharị na ime baptism nye ndị ahụ kwesịrị ainye nkọwasị ihe ha na-eme ma nwee ike ime mmehie; e, kụziere nne na nna na ha ga-echegharịrị na ka e mee ha baptism, ma nwee umeala dịka bụmụ-ntakịrị ha, ma a ga-azọpụta ha nile ha na ụmụ-ntakịrị ha.

11 Ma aụmụ-ntakịrị ha enweghị mkpa maka nchegharị, ọbụghị ma ha nwere mkpa ime baptism. Lee, ime baptism bụ maka nchegharị ruo na mmezu nke iwu-nsọ nile ruo na bnsachapụ nke mmehie nile.

12 Mana aụmụ-ntakịrị dị ndụ nʼime Kraịst, ọbụna site na ntọ-ala nke ụwa; ọbụrụ na ọdịghị otu a, Chineke bụ Chineke na-akpa-oke, na kwa Chineke nke na-agbanwe-agbanwe, na bonye na-ele ndị mmadụ anya nʼiru; n’ihi na ụmụ-ntakịrị ole nwụworo na-emeghị baptism!

13 Ya mere, ọbụrụ na-enweghị ike ịzọpụta ụmụ-ntakịrị na-emeghị baptism, ndị a ga-agawọrịị nʼọkụ ala-mụọ agwụgh-agwụ.

14 Lee asị m unu, na onye nke na-eche na ụmụ-ntakịrị nwere mkpa ime baptism nọ nʼime olulu ilu na agbụ nile nke ajọọ-omume; n’ihi na o nweghị ma-ọbụ aokwukwe, olile-anya, ma-ọbụ afọ-ọma; ya mere; ọbụrụ na e bepụ ya mgbe ọ ka nọrịị nʼechiche ahụ, ọ ga-agbadarịrị ala-mụọ.

15 Nịhị na egwu ka ajọọ-omume ahụ dị bụ iche na Chineke na-azọpụta otu nwata n’ihi baptism, ma nke ọzọ ga-alarịrị nʼiyi n’ihi na o meghị baptism.

16 Ahụhụ na-adịrị ndị nke ga-eduhie ụzọ nile nke Onye-nwe nʼụdị a, n’ihi na ha ga-ala nʼiyi ma ọbụghị na ha chegharịrị. Lee, eji m atụghị-egwu na-ekwu, ebe m nwere aikike sitere na Chineke; ma anaghị m atụ-egwu ihe mmadụ nwere ike ime; n’ihi na bịhụnanya zuru-oke cna-achụpụ egwu.

17 Ma e jupụtara m anʼafọ-ọma, nke bụ ịhụnanya mgbe nile na-adigide; ya mere, ụmụ-ntakịrị nile dị otu ụdị nye m, ya mere, eji m ịhụnanya zuru-oke hụ bụmụ-ntakịrị nʼanya; ma ha nile yiri onwe ha ma bụrụ ndị nketa nke nzọpụta.

18 N’ihi na a matara m na Chineke abụghị Chineke na-akpa oke, ọbụghị ma-ọbụ onye na-agbanwe-agbanwe; kama ọ naghị aagbanwe-agbanwe site bmgbe ebighi-ebi nile ruo mgbe ebighi-ebi nile.

19 aỤmụ-ntakịrị enweghị ike ichegharị; ya mere, ọ bụ ajọọ-omume dị egwu ịjụ inye ha ebere Chineke nile na-enweghị ntụpọ, n’ihi na ha nile dị ndụ nʼime ya n’ihi bebere ya.

20 Ma onye nke na-asị na ụmụ-ntakịrị nwere mkpa ime baptism na-ajụ inye ha ebere nile nke Kraịst, ma were dịka ihe efu aaja mgbaghara mmehie nke ya na ike nke mgbapụta ya.

21 Ahụhụ na-adịrị ụdị ndị ahụ, n’ihi na ha nọ nʼihe egwu nke ọnwụ, aala-mụọ, na bịta-ahụhụ agwụgh-agwụ. Ana m ekwu ya na-atụghị-egwu; Chineke enyewo m iwu-nsọ. Gee ha ntị ma chebara ya uche, ma-ọbụ ha ga-eguzoro megide unu cnʼoche-ikpe nke Kraịst.

22 N’ihi na lee na ụmụ-ntakịrị nile adị ndụ nʼime Kraịst, na kwa ndị nile na-enweghị biwu ahụ. N’ihi na ike nke cmgbapụta na-abịakwasị ndị nile na-enweghị iwu; ya mere, onye ọbụla nke a na-enyeghị iwu, ma-ọbụ onye nke na-anọghị nʼokpuru amam-ikpe, enweghị ike ichegharị; ma i nye ụdị ndị ahụ baptism abaghị uru—

23 Mana ọ bụ ịkwa-emo nʼiru Chineke, ịgọnarị ebere nile nke Kraịst, na ike nke Mụọ Nsọ ya, na itinye ntụkwasị-obi anʼọrụ nile nwụrụ-anwụ.

24 Lee, nwa m nwoke, ihe nke a ekwesịghị ịdị; n’ihi na anchegharị dịrị ndị nke nọ nʼokpuru ọmụma-ikpe na nʼokpuru ọbụbụ-ọnụ nke iwu emebiri emebi.

25 Ma mkpụrụ-mbụ nile nke anchegharị bụ bbaptism; ma baptism na-abịa site nʼokwukwe ruo na mmejupụta nke iwu-nsọ nile ahụ; ma mmejupụta nke iwu-nsọ nile ahụ na-eweta cnsachapụ nke mmehie nile;

26 Ma nsachapụ nke mmehie nile na-eweta aịdị-nwayọ, na ịwedata obi ala; ma n’ihi ịdị-nwayọ na ịwedata obi ala ka nleta nke bMụọ Nsọ ga-esi wee bịa, bụ cOnye-nkasi-obi nke na-emejupụta dnʼolile-anya na eịhụnanya zuru-oke, bụ ịhụ-nʼanya nke na-adigide site fna-ịgbalị gnʼekpere, ruo mgbe ọgwụgwụ ga-abịa, mgbe hndị nsọ nile ga-ebinyere Chineke.

27 Lee, nwa m nwoke, aga m edekwara gị akwụkwọ ọzọ ma ọbụrụ na mụ apụghị ọsọ-ọsọ imegide ndị Leman. Lee, ampako nke mba nke a, ma-ọbụ ndị nke ndị Nifaị, egosịwo mbibi ha ma ọbụghị na ha ga-echegharị.

28 Kpeere ha ekpere, nwa m nwoke, ka nchegharị wee bịakwute ha. Mana lee, ana m atụ egwu eleghị-anya Mụọ ahụ akwụsịwo aịnọnyere ha; ma nʼakụkụ ala nke a ha nọ kwa na-achọ iwepụ ike nile na ikike nke sitere nʼebe Chineke nọ na-abịa; ma ha bna-agọnarị Mụọ Nsọ.

29 Ma mgbe ha jụworo nnukwu ọmụma-ihe dị otu a, nwa m nwoke, ha ga-ala-nʼiyi ọsọ-ọsọ ruo na mmejupụta nke amụma nile nke ndị-amụma nile kwuworo, na kwa dịka okwu nile nke Onye-Nzọpụta anyị nʼonwe ya.

30 Nọdụ nke ọma, nwa m nwoke, ruo mgbe m ga-edere gị akwụkwọ ọzọ, ma-ọbụ zute gị ọzọ. Amen.