Akwụkwọ nsọ
Moronaị 10


Isi 10

Igba-ama maka Ạkwụkwọ nke Mọmọn na-abịa site nʼike nke Mụọ Nsọ—Onyinye nile nke Mụọ a na-enye ha ndị nwere okwukwe—Onyinye nke mụọ nile nʼeso okwukwe oge nile—Okwu nile nke Moronaị wee kwuo okwu site nʼuzuzu—Bịakwute Kraịst, ka e mee ka unu zuo-oke nʼime ya, ma sachaa mkpụrụ-obi unu nile. Ihe dịka afọ 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ugbua mụ, Moronaị, na-ede ụfọdụ ihe dịka o siri dị m mma; ma ana m edegara ụmụnne m nwoke, andị Leman; ma ọ ga-adị m mma ma a sị na ha ga-amata na ihe karịrị narị afọ anọ na iri afọ abụọ agafewo site nʼoge e nyere ihe iriba-ama maka ọbịbịa nke Kraịst.

2 Ma aarachilitere m akụkọ-ndekọta nile ndị a, mgbe m kwuchaworo okwu ole na ole nʼụzọ nke agbam-ume nye unu.

3 Lee, aga m agba unu ume ka mgbe unu ga-agụ ihe ndị a, ma ọbụrụ na ọ bụ amamihe nʼime Chineke na unu ga-agụ ha, na unu ga-echeta otu Onye-nwe siri nwe obi ebere nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ, site nʼokike nke Adam gbada ruo nʼoge nke unu ga-anata ihe ndị a, ma atụgharịa ya nʼuche nʼime bobi unu nile.

4 Ma mgbe unu ga-anata ihe ndị a, aga m agba unu ume ka unu wee ajụọ Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ihe ndị a ha babụghị ezi-okwu; ma ọbụrụ na unu ga-eji cezigbo obi, jiri dezigbo ebum-nʼobi, na-enwe eokwukwe nʼime Kraịst, ọ fga-egosipụta gezi-okwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mụọ Nsọ.

5 Ma site nʼike nke Mụọ Nsọ unu ga-enwe ike amata bezi-okwu nke ihe nile.

6 Ma ihe ọbụla nke dị mma zịrị-ezi ma bụrụ ezi-okwu; ya mere, ọdịghị ihe ọbụla nke dị mma na-agọnarị Kraịst ahụ, kama ha na-ekwupụta na ọ nọ.

7 Ma unu ga-amata na ọ nọ, site nʼike nke Mụọ Nsọ; ya mere aga m agba unu ume ka unu ghara ịgọnarị ike nke Chineke; n’ihi na ọ na arụ-ọrụ site nʼike, adịka okwukwe nke ụmụ nke mmadụ siri dị, otu aka ahụ taa na echi, na ruo mgbe nile.

8 Ma ọzọ, ana m agba unu ume, ụmụnne m nwoke, ka unu ghara ịgọnarị aonyinye nile nke Chineke, n’ihi na ha dị ọtụtụ; ma ha si nʼotu Chineke ahụ bịa. Ma e nwere bụzọ dị iche iche nke e si na-enye onyinye ndị a; mana ọ bụ otu Chineke ahụ bụ onye na-arụ ihe nile dị nʼime ihe nile; ma a na-enye ha site na ngosipụta nile nke Mụọ nke Chineke nye ndị mmadụ, inye ha uru.

9 N’ihi na lee, aotu onye ka e nyere site na Mụọ nke Chineke, ka o wee bkụzie okwu nke amamihe.

10 Ma e nyere onye ọzọ, ka o wee kụzie okwu nke ọmụma-ihe site nʼotu Mụọ ahụ;

11 Ma e nyere onye ọzọ, nnukwu aokwukwe karịrị akarị; ma nye onye ọzọ, onyinye nile nke bịgwọ-ọrịa site nʼotu Mụọ ahụ;

12 Ma ọzọ, nye onye ọzọ, ka o wee rụọ nnukwu aọrụ-ebube nile;

13 Ma ọzọ, nye onye ọzọ, ka o wee buo-amụma gbasara ihe nile;

14 Ma ọzọ, nye onye ọzọ, ịhụ ndị mụọ-ozi na nkụzi nke mụọ nile;

15 Ma ọzọ, nye onye ọzọ, ụdị asụsụ nile;

16 Ma ọzọ, nye onye ọzọ, nsụgharị nke asụsụ nile na nke ụdị aasụsụ nile dị iche iche.

17 Ma onyinye nile ndị a na-abịa site na Mụọ nke Kraịst; ma ha na abịakwute onye ọbụla nʼụdị nʼụdị, dịka o siri chọọ.

18 Ma aga m agba unu ume ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ-nʼanya, ka unu cheta na aonyinye ọbụla dị mma si na Kraịst bịa.

19 Ma aga m agba unu ume, ụmụnne m nwoke m hụrụ nʼanya, ka unu cheta na ọ bụ aotu onye ahụ ụnyahụ, taa, na ruo mgbe nile, ma na onyinye nile ndị a nke m kwuworo maka ha, ndị bụ nke mụọ, ọdịghị mgbe ọbụla a ga-ewepụ ha, ọbụna ruo mgbe nile nke ụwa na-eguzoro, nanị dịka bekweghị-ekwe nke ụmụ nke mmadụ siri dị.

20 Ya mere a ga-enwerịrị aokwukwe; ma ọbụrụ na a ga-enwerịrị okwukwe a ga-enwerịrị kwa olile-anya; ma ọbụrụ na a ga-enwerịrị olile-anya a ga-enwerịrị kwa afọ-ọma.

21 Ma ma-ọbụghị na unu nwere aafọ-ọma ọdịghị otu ọbụla a ga-esi wee zọpụta unu nʼala-eze nke Chineke; ọbụghị ma a ga-azọpụta unu nʼala-eze nke Chineke ma ọbụrụ na unu enweghị okwukwe; ọbụghị ma unu nwere ike ma ọbụrụ na unu enweghị olile-anya.

22 Ma ọbụrụ na unu enweghị olile-anya unu ga-anọrịrị nʼịda mba; ma ịda-mba na-abịa n’ihi ajọọ-omume.

23 Ma Kraịst gwara ndị nna anyị nʼezi-okwu: aỌbụrụ na unu nwere okwukwe unu nwere ike ime ihe nile nke dị mkpa nye m.

24 Ma ugbua ana m agwa nsọtụ nile nke ụwa okwu—na ọbụrụ na ụbọchị ahụ ga-abịa nke ike na onyinye nke Chineke a ga-ewepụ ya nʼetiti unu, ọ ga-abụ an’ihi bekweghị ekwe.

25 Ma ahụhụ na adịrị ụmụ nke mmadụ ma ọbụrụ na ọ dị otu a; n’ihi na-agaghị enwe aonye ọbụla ga-eme ihe ọma nʼetiti unu, e-e ọbụghị otu onye. N’ihi na ọbụrụ na a ga-enwe otu onye nʼetiti unu nke na-eme ihe ọma, ọ ga-arụ ọrụ site nʼike na onyinye nile nke Chineke.

26 Ma ahụhụ na adịrị ndị nke ga-ewepụ ihe ndị a ma nwụọ, n’ihi na ha na aanwụ nʼime bmmehie ha nile, ma agaghị enwe ike ịzọpụta ha nʼala-eze nke Chineke; ma ana m ekwu ya dịka okwu nile nke Kraịst siri dị; ma anaghị m ekwu okwu ụgha.

27 Ma ana m agba unu ume ka unu cheta ihe ndị a; n’ihi na oge ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ mgbe unu ga-amata na anaghị m ekwu okwu ụgha, n’ihi na unu ga-ahụ m nʼoche ikpe nke Chineke; ma Onye-nwe Chineke ga-asị unu: Ọ bụ na ekwupụtaghị m aokwu m nile nye unu, nke e dere site nʼaka nwoke a, dịka otu onye bna-eti site na ndị nwụrụ-anwụ, e, ọbụna dịka otu onye na-ekwu okwu site cnʼuzuzu?

28 Ana m ekwupụta ihe ndị a maka mmejupụta nke amụma nile. Ma lee, ha ga-esị nʼọnụ nke Chineke nke mgbe nile na-adigide wee pụta; ma okwu ya aga-agagharịsịke site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

29 Ma Chineke ga-egosị unu, na ihe ahụ nke m deworo bụ ezi-okwu.

30 Ma ọzọ aga m agba unu ume ka unu abịakwute Kraịst, ma jidesie onyinye ọma ọbụla ike, ma bebịtụkwala ajọọ onyinye ahụ aka, ma-ọbụ ihe nke na adịghị ọcha.

31 Ma ateta, ma bilie site nʼuzuzu, O Jerusalem; e, ma yịkwasị ọmarịcha uwe nile unu, O ada nke bZaịọn; ma mee ka cstek unu nile dsie ike ma mesaa oke-ala unu nile mbara ruo mgbe nile, ka ị ghara kwa inwe emgbagwọju-anya ọzọ, ka ọgbụgba-ndụ nile nke Nna nke mgbe ebighi-ebi nke o meworo nye unu, O ụlọ nke Israel, ka e wee mejupụta ya.

32 E, abịakwute Kraịst, ma ka e mee ka unu bzuo-oke nʼime ya, ma wezuga onwe unu site nʼamaghị Chineke nile; ma ọbụrụ na unu ga-ewezuga onwe unu site nʼamaghị Chineke nile, ma chụ Chineke nʼanya jiri ike unu nile, echiche na ume, mgbe ahụ ka amara ya zuru-oke nye unu, nke mere na site nʼamara ya unu ga-ezu-oke nʼime Kraịst; ma ọbụrụ na site dnʼamara nke Chineke unu zuo-oke nʼime Kraịst, ọdịghị otu unu ga-esị gọnarị ike nke Chineke.

33 Ma ọzọ, ọbụrụ na unu site nʼamara nke Chineke zuo oke nʼime Kraịst, ma ghara ịgọnarị ike ya, mgbe ahụ ka a aga-asacha unu nʼime Kraịst site nʼamara nke Chineke, site nʼịkwafu bọbara nke Kraịst, nke dị nʼime ọgbụgba-ndụ nke Nna ahụ maka cnsachapụ nke mmehie unu nile, ka unu wee dị dnsọ, na-enweghị ntụpọ.

34 Ma ugbua asị m ndị nile, nọdụ-nke-ọma. Aga m a ga ọsọ-ọsọ aizu-ike na bparadaịs nke Chineke, ruo mgbe cmụọ m na arụ m dga-ejikọta kwa ọnụ ọzọ, ma akpọruta m na mmeri site enʼikụkụ, izute unu nʼiru foche-ikpe mmasị nke gJehova ukwu ahụ, hOnye-ikpe Ebighi-ebi nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ. Amen.

NGWỤCHA