Akwụkwọ nsọ
Ita 15


Isi 15

E gburu ọtụtụ nde ndị Jared nʼịlụ-agha—Shịz na Koriantamọ wee kpọkọọ ndị ahụ nile nʼịlụ-ọgụ ọnwụ—Mụọ nke Onye-nwe kwụsịrị ịnọnyere ha—E bibiri ndị mba Jared kpam-kpam—Nanị Koriantamọ fọdụrụ.

1 Ma o wee ruo mgbe Koriantamọ nwetara ọgwụgwọ nke mmerụ-arụ ya nile, o malitere icheta aokwu nile nke Ita gwaworo ya.

2 Ọ hụrụ na e gbuwọrịị site na mma-agha ihe dịka ndị nke ya nde abụọ, ma ọ malitere inwe mwute nʼime obi ya; e, e gbuwọrịị ndịkom dike nde abụọ, na kwa ndị nwunye ha na ụmụ ha.

3 Ọ malitere ichegharị site nʼihe-ọjọọ nke ha meworo; ọ malitere icheta okwu nile nke e kwuworo site nʼọnụ nke ndị-amụma nile, ma ọ hụrụ ha na e mezuru ha ruo otu a, mpekele ọbụla; ma mkpụrụ-obi ya ruru uju ma jụ ka a kasie ya obi.

4 Ma o wee ruo na o dere akwụkwọ-ozi nye Shịz, na-achọ ka o debe ndị ya ndụ, ma ọ ga-enyepụ ala-eze ahụ nʼihi ndụ nile nke ndị ahụ.

5 Ma o wee ruo na mgbe Shịz nataworo akwụkwọ-ozi ya o dere akwụkwọ-ozi nye Koriantamọ, sị na ọbụrụ na ọ ga-enyepụ onwe ya, na ya ga-eji mma-agha nke ya gbuo ya, na ya ga-edebe ndụ nile nke ndị ahụ.

6 Ma o wee ruo na ndị ahụ echegharịghị site nʼajọọ-omume ha; ma a kpasuru ndị nke Koriantamọ iwe megide ndị nke Shịz; ma a kpasuru ndị nke Shịz iwe megide ndị nke Koriantamọ; ya mere, ndị nke Shịz nyere ndị nke Koriantamọ ịlụ-agha.

7 Ma mgbe Koriantamọ hụrụ na ya agala ịda ọ gbapụkwara ọzọ nʼiru ndị nke Shịz.

8 Ma o wee ruo na o bịaruru na mmiri nile nke Rịpliankọm, nke site na nsụgharị-asụsụ, bụ buru ibu, ma-ọbụ ịkarị ha nile; ya mere, mgbe ha bịaruru mmiri nile ndị a ha rụnyere ụlọ-ịkwuu ha; ma Shịz rụnyekwara ụlọ-ịkwuu ya na nsọ ha; ma ya mere nʼechi ya, ha bịara ịlụ-agha.

9 Ma o wee ruo na ha lụrụ agha dị egwu karịa, nʼime nke e merụkwara Koriantamọ arụ ọzọ, ma ọ dara mba site nʼitufu ọbara.

10 Ma o wee ruo na ndị-agha nile nke Koriantamọ kwagidere ndị-agha nile nke Shịz nke mere na ha meriri ha, ha mere ha ka ha gbafuo nʼiru ha; ma ha gbalara nʼebe ndịda-ndịda, ma rụnye ụlọ-ịkwuu ha nʼebe nke a na-akpọ Ọgat.

11 Ma o wee ruo na ndị-agha nke Koriantamọ rụnyere ụlọ-ịkwuu ha nile nʼakụkụ ugwu Rama; ma ọ bụụrụ nʼotu ugwu ahụ ebe nna m Mọmọn azolitere akụkọ-ndekọta nile ahụ nye Onye-nwe, nke dị nsọ.

12 Ma o wee ruo na ha kpọkọtara ndị ahụ nile ọnụ nʼelu iru nile nke ala ahụ, ndị a na-egbubeghị, ma ewezuga nanị Ita.

13 Ma o wee ruo na Ita hụrụ ihe nile nke ndị ahụ na-eme; ma ọ hụrụ na ndị ahụ nke nọnyere Koriantamọ, a kpọkọtara ha ọnụ ha na ndị-agha nke Koriantamọ; ma ndị ahụ nke nọnyere Shịz a kpọkọtara ha ọnụ ha na ndị-agha nke Shịz.

14 Ya mere, ha nọ nʼohere nke afọ anọ na-akpọkọta ndị ahụ ọnụ, ka ha wee nwe ike nwetacha ndị nile nke nọ nʼelu iru nke ala ahụ, na ka ha wee nwe ike nata ume nile nke kwere omume na ha nwere ike ịnata.

15 Ma o wee ruo mgbe a kpọkọtachaworo ha nile ọnụ, onye ọbụla na ndị-agha nke ọ chọrọ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha—ma ndịkom, ndịnyom na ụmụ-ntakịrị e nyere ngwa-ọgụ nile nke agha ebe ha ji ihe-ize-mgbọ nile, na aepekele-nchekwa-obi nile, na epekele-mkpuchi-isi nile ma ebe e jikeworo ha nʼụdị nke ịlụ-agha—ha zọpụrụ-ije otu megide ibe ya nʼịlụ-agha; ma ha lụrụ ọgụ ụbọchị ahụ nile, ma ọdịghị ndị meriri.

16 Ma o wee ruo mgbe o ruru abalị ike gwụrụ ha, ma ha laghachịrị nʼebe izu-ike ha nile; ma mgbe ha laghachịworo nʼebe izu-ike ha nile ha welitere ogologo iti-mkpu na ịkwa akwa arịrị maka ntufu nke ndị nke ha e gburu; ma nnukwu ka iti-mkpu ha nile dịịrị, ogologo-iti-mkpu na ịkwa-akwa arịrị ha nile, nke mere na ha tikara ikuku karịa.

17 Ma o wee ruo na nʼechi ya ha gakwara ọzọ nʼịlụ-agha, ma nnukwu na egwu ka ụbọchị ahụ dịịrị; otu o sila dị, ọdịghị ndị meriri, ma mgbe abalị bịakwara ọzọ ha jiri iti mkpu ha nile, iti ogologo mkpu ha nile, na iru-uju nile tịka ikuku, n’ihi ntufu nke ndị nke ha e gburu.

18 Ma o wee ruo na Koriantamọ degakwaara Shịz akwụkwọ-ozị ọzọ, na-achọ ka ọ ghara ịbịakwa ọzọ nʼịlụ-agha, mana na ya ga-ewere ala-eze ahụ, ma debe ndụ nile nke ndị ahụ.

19 Mana lee, Mụọ nke Onye-nwe akwụsịwo ịnọnyere ha, ma aSetan nwere ike nʼuju nʼobi nile nke ndị ahụ; n’ihi na ha nyepụrụ onwe ha nʼisi ike nile nke obi ha, na ikpu-isi nke echiche ha ka e wee bibie ha; ya mere ha ga kwara ịlụ agha ọzọ.

20 Ma o wee ruo na ha lụrụ ọgụ ụbọchị ahụ nile, ma mgbe abalị bịara ha rạhụrụ-ụra nʼelu mma-agha ha nile.

21 Ma nʼechi ya ha lụrụ ọgụ ọbụna ruo mgbe abalị bịara.

22 Ma mgbe abalị bịara ha an̄ụbigara iwe oke dịka mmanya, ọbụna dịka nwoke nke n̄ụbigara mmanya oke; ma ha rahụkwara ọzọ nʼelu mma-agha ha nile.

23 Ma nʼechi ya ha lụrụ ọgụ ọzọ; ma mgbe abalị bịara ha nile adawọrịị site na mma-agha ewezuga nanị iri ise na abụọ nke ndị nke Koriantamọ, na iri isii na iteghete nke ndị nke Shịz.

24 Ma o wee ruo na ha rahụrụ nʼelu mma-agha ha nile nʼabalị ahụ, ma nʼechi ya ha lụrụ ọgụ ọzọ, ma ha doro ndọrọ-ndọrọ nʼike ha nile jiri mma-agha ha nile na ihe-ize-mgbọ ha nile, ụbọchị ahụ nile.

25 Ma mgbe abalị bịara e nwere iri atọ na abụọ nke ndị nke Shịz, na iri abụọ na asaa nke ndị nke Koriantamọ.

26 Ma o wee ruo na ha riri ihe ma rahụ ụra, ma jikere maka ọnwụ nʼechi ya. Ma ha buru ibu ma sie ike dịka nʼume nke mmadụ.

27 Ma o wee ruo na ha lụrụ ọgụ nʼohere nke oge-awa atọ, ma ha dara-mba site nʼịtụfu ọbara.

28 Ma o wee ruo na mgbe ndịkom nke Koriantamọ nataworo ume nke ga-ezu ka ha nwee ike gaa ije, ha chọrọ ịgbapụ maka ndụ ha; mana lee, Shịz biliri, na kwa ndị ya, ma ọ n̄ụrụ-iyi nʼiwe ya na ya ga-egbu Koriantamọ ma-ọbụ laa nʼiyi site na mma-agha.

29 Ya mere, ọ chụrụ ha ọsọ, ma nʼechi ya ọ chụfere ha; ma ha jịkwara mma-agha lụọ ọgụ ọzọ. Ma ọ wee ruo na mgbe ha anile daworo site na mma-agha, ma ọbụghị nanị Koriantamọ na Shịz, lee Shịz adawọrịị mba site nʼịtụfu ọbara.

30 Ma o wee ruo na mgbe Koriantamọ dabereworo nʼelu mma-agha ya, ka o wee zuru nwantịntị ike, o bepụrụ isi nke Shịz.

31 Ma o wee ruo na mgbe o bepụworo isi nke Shịz, na Shịz bilitere nʼaka ya abụọ ma daa; ma mgbe ọ gbaworo lịka-lịka maka ikute ume, ọ nwụrụ.

32 Ma o wee ruo na aKoriantamọ dara nʼala, ma dizie ka a ga-asị na o nweghị ndụ.

33 Ma Onye-nwe gwara Ita okwu, ma sị ya: Gaa. Ma ọ gara nʼiru, ma hụ na okwu nile nke Onye-nwe e mezuwo ha nile; ma o dechara aakụkọ-ndekọta ya; (ma otu ụzọ nʼime otu narị edebeghị m ya) ma o zoro ha nʼụdị nke ndị Lịmhaị chọtara ha.

34 Ugbua okwu ndị ikpe-azụ nke aIta dere bụ ndị a: Ma Onye-nwe ọ chọrọ ka e nwogharịa m, ma-ọbụ ka m taa ahụhụ dịka ọchịchọ nke Onye-nwe nʼanụ-arụ siri dị, ọdịghị ihe o mere, ma ọbụrụ na ọ ga-eme ka a zọpụta m nʼala-eze nke Chineke. Amen.