Akwụkwọ nsọ
Ita 8


Isi 8

E nwere esem-okwu na ndọrọ-ndọrọ gbasara ala-eze ahụ—Ekịsh wee mee otu ntụgwa-nzuzo nile nke ịn̄ụ-iyi-jikọtara maka igbu eze ahụ—Ntụgwa nzuzo nile bụ nke ekwensu ma na-eweta mbibi nke mba nile—Ndị Jentaịlụ ọhụrụ a dọrọ ha aka na ntị megide ntụgwa nzuzo nke ga-achọ ịkwatu inwere-onwe nke ala nile, ebo nile, na mba nile.

1 Ma o wee ruo na ọ mụtara Ọma, ma Ọma chịrị nʼọnọdụ ya. Ma Ọma mụtara Jared; ma Jared mụtara ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị.

2 Ma Jared nupụrụ-isi megịde nna ya, ma bịa ma biri nʼala nke Het. Ma o wee ruo na o toro ọtụtụ mmadụ otuto-erughị-nʼobi, n’ihi okwu aghụghọ ya nile, ruo mgbe o ritaworo otu ọkara nke ala-eze ahụ.

3 Ma mgbe o ritaworo otu ọkara nke ala-eze ahụ o nyere nna ya ịlụ-agha, ma ọ bụpụrụ nna ya baa na ndọkpụ nʼagha, ma mee ka o jee ozi nʼime ndọkpụ nʼagha;

4 Ma ugbua, nʼụbọchị nile nke ọchịchị nke Ọma ọ nọ nʼime ndọkpụ nʼagha otu ọkara nke ụbọchị ya nile. Ma o wee ruo na ọ mụtara ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị, nʼetiti ndị nke bụ Esrọm na Koriantamọ;

5 Ma iwe were ha karịa n’ihi ihe nile nke Jared nwanne ha nwoke mere, nke mere na ha zulitere ndị-agha ma nye Jared ịlụ-agha. Ma o wee ruo na ha nyere ya ịlụ-agha nʼabalị.

6 Ma o wee ruo na mgbe ha gbuworo ndị-agha nke Jared ha chọkwara igbu ya; ma ọ rịọrọ ha ka ha ghara igbu ya, na ya ga-arara ala-eze ahụ nye nʼaka nna ya. Ma o wee ruo na ha hapụụrụ ya ndụ ya.

7 Ma ugbua Jared nwere mwute karịa n’ihi ntufu nke ala-eze ahụ, n’ihi na ọ tụkwasịwo obi ya nʼala-eze ahụ na nʼotuto nke ụwa.

8 Ugbua nwa-ada nke Jared ebe ọ bụ ọka-ibe karịa, ma ebe ọ hụrụ mwute nile nke nna ya, chere echiche ịchọpụta atụmatụ site na nke ọ ga-agbapụta ala-eze ahụ nyeghachị nna ya.

9 Ugbua nwa-ada nke Jared mara mma karịa. Ma o wee ruo na ya na nna ya kparịtara ụka, ma ọ sịrị ya: Olee ebe nna m siteworo nwee mwute dị otu a? Ọ bụ na ọ gụbeghị akụkọ-ndekọta ahụ nke ndị nna anyị wefetara nnukwu omimi ahụ? Lee ọ bụ na-enweghị nkọwasị gbasara ndị mgbe ochie, na ha site anʼatụmatụ nzuzo ha nile nwetara ala-eze nile na nnukwu otuto?

10 Ma ugbua, ya mere, ka nna m ziga ka a kpọọ Ekịsh, nwa-nwoke nke Kịmnọ; ma lee, amara m mma, ma aga m aete-egwu nʼiru ya, ma aga m amasị ya, nke ga-eme ka ọ chọọ ka m bụrụ nwunye ya, mgbe ahụ ka ị ga-asị: Aga m akpọnye gị ya ma ọbụrụ na ị ga ewetara m isi nke nna m, bụ eze.

11 Ma ugbua Ọma bụụrụ enyi nke Ekịsh; ya mere, mgbe Jared zigaworo ka a kpọọ Ekịsh, nwa-ada nke Jared tere-egwu nʼiru ya nke mere na ọ masịrị ya, nke mere na ọ chọrọ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ma o wee ruo na ọ sịrị Jared: Nye m ya ka ọ bụrụ nwunye m.

12 Ma Jared sịrị ya: Aga m enye gị ya, ma ọbụrụ na ị ga-ewetara m isi nke nna m, bụ eze.

13 Ma o wee ruo na Ekịsh kpọkọtara bata nʼụlọ nke Jared ndị ikwu na ibe ya nile, ma sị ha: Unu ga an̄ụru m iyi na unu ga-ekwesị-ntụkwasị-obi nye m nʼihe nke m ga achọ nʼaka unu?

14 Ma o wee ruo na ha nile an̄ụụrụ ya iyi, site na Chineke nke elu-igwe, na kwa site nʼelu-igwe nile, na kwa site nʼụwa, na site nʼisi ha nile, na onye-ọbụla ga-agbanwe site nʼinye-aka ahụ nke Ekịsh chọrọ ga-atufu isi ya; ma onye ọbụla ga-agba ama ihe ọbụla nke Ekịsh mere ka ha mata, onye ahụ ga-atufu ndụ ya.

15 Ma o wee ruo na otu a ka ha na Ekịsh kwekọrịtara. Ma Ekịsh kụziri ha aịn̄ụ-iyi nile nke e nyeworo site na ndị mgbe ochie ndị chọkwara ike, nke e nyedatara ọbụna site na bKen, onye bụụrụ onye ogbu-mmadụ site na mmalite.

16 Ma edokwara ha site nʼike nke ekwensu ka o nye ndị mmadụ ịn̄ụ-iyi ndị a nile, idebe ha nʼọchịchịrị, inyere ụdị ndị ahụ chọrọ ike aka inweta ike, na igbu-mmadụ, na ịpụnara ihe, na ikwu-okwu ụgha, na ime ụdị ajọọ-omume nile na akwụnakwụna nile.

17 Ma o bụụrụ nwa-ada nke Jared bụ onye tinyere ya nʼime obi ya ịchọta ihe ndị ochie nile a; ma Jared tinyere ya nʼime obi nke Ekịsh; ya mere, Ekịsh nyere ya ndị ebo ya na ndị enyị ya, na-eduhie ha site na nkwa ọma nile ime ihe ọbụla ọ chọrọ.

18 Ma o wee ruo na ha mere antụgwa nzuzo, ọbụna dịka ndị mgbe ochie; bụ ntụgwa nke rụrụ-arụ karịa ma dị ọjọọ karịchaa, nʼanya nke Chineke.

19 N’ihi na Onye-nwe anaghị arụ ọrụ nʼime ntụgwa nzuzo nile, ọbụghị ma ọ na achọ ka mmadụ kwafuo ọbara, kama nʼihe nile ọ jụwo ya, site na mmalite nke mmadụ.

20 Ma ugbua mụ, Moronaị, anaghị ede ụdị ịn̄u-iyi nile na ntụgwa nile nke ha, n’ihi na emewo ka m mata ya na a na-enwe ha nʼetiti ndị nile, ma a na enwe ha nʼetiti ndị Leman.

21 Ma ha akpatawo ambibi nke ndị a nke m na ekwu maka ha ugbua, na kwa mbibi nke ndị Nifaị.

22 Ma mba ọbụla nke ga-akwado ụdị ntụgwa nzuzo nile ahụ, inweta ike na uru, ruo mgbe ha ga-agbasa na mba ahụ, lee, a ga-ebibi ha; n’ihi na Onye-nwe agaghị ekwe na aọbara nke ndị nsọ, nke ha ga-akwafu, ga na-akpọkụ ya mgbe nile site nʼala maka bịbọ-ọbọ nʼisi ha ma na ọ gaghị abọrọ ha ọbọ.

23 Ya mere, O unu ndị Jentaịlụ, ọ bụ amamihe nʼime Chineke na a ga-egosị unu ihe ndị a, na site na ya unu ga-echegharị site na mmehie unu nile, ma unu ekwela na ntụgwa igbu-mmadụ nile ndị a ga-akarị unu, ndị nke a na ewulite inweta aike na uru—ma ọrụ ahụ, e, ọbụna ọrụ nke mbibi bịakwasịrị unu, e, ọbụna mma-agha nke ikpe ziri-ezi nke Chineke nke mgbe Ebighi-ebi ga-adakwasị unu, ruo na nkwatu na mbibi unu ma ọbụrụ na unu ga-ekwe ka ihe ndị a dịrị.

24 Ya mere, Onye-nwe na enye unu iwu, mgbe unu ga-ahụ ihe ndị a ga-abịa nʼetiti unu na unu, ga eteta nʼuche nke ọnọdụ unu dị egwu, n’ihi ntụgwa nzuzo a nke ga-adị nʼetiti unu; ma-ọbụ ahụhu dịrị ya, n’ihi ọbara nke ndị nke e gbuworo; n’ihi na ha na akwa akwa site nʼuzuzu maka ịbọ ọbọ nʼisi ya, na kwa nʼisi ndị nke wulitere ya.

25 N’ihi na ọ ga-eru na onye ọbụla na-ewulite ya na-achọ ịkwatu ainwere-onwe nke ala nile, ebo nile, na mba nile; ma ọ na-eweta na mmezu mbibi nke ndị nile, n’ihi na e wulitere ya site nʼaka ekwensu, onye bụ nna nke okwu-ụgha nile; ọbụna otu onye okwu-ụgha ahụ nke bghọgburu nne na nna mbụ anyị, e, ọbụna otu onye okwu-ụgha ahụ nke meworo ka mmadụ gbuo-mmadụ site na mmalite; onye mesịworo obi nile nke ndị mmadụ ike nke mere na ha egbuwo ndị-amụma nile, ma tụọ ha okwute, ma chụpụ ha site na mmalite.

26 Ya mere, mụ, Moronaị e nyere m iwu ide ihe ndị a nile ka e wee melaa ihe ọjọọ, na ka oge ahụ wee bịa mgbe Ekwensu ana-agaghị enwe kwa ike nʼobi nile nke ụmụ nke mmadụ, kama ka e wee bgbaa ha ume ime ihe-ọma esepụghị-aka, ka ha wee bịakwute isi mmiri nke ezi-omume nile ahụ ma azọpụta ha.