Akwụkwọ nsọ
Ita 12


Isi 12

Onye-amụma Ita wee gbaa ndị ahụ ume ikwere na Chineke—Moronaị wee kọwagharia ọrụ-ebube nile na ihe-ịtụ-nʼanya nile e mere site nʼokwukwe—Okwukwe mere ka nwanne-nwoke nke Jared hụ Kraịst—Onye-nwe na-enye ndị mmadụ adịghị-ike ka ha wee dị umeala—Nwanne-nwoke nke Jared bupụrụ ugwu Zirịn site nʼokwukwe—Okwukwe, olile-anya, na afọ-ọma dị mkpa na nzọpụta—Moronaị hụrụ Jisus iru na iru.

1 Ma o wee ruo na ụbọchị nile nke Ita bụụrụ nʼụbọchị nile nke Koriantamọ; ma aKoriantamọ bụụrụ eze na-achị ala ahụ nile.

2 Ma aIta bụụrụ onye-amụma nke Onye-nwe; ya mere Ita pụtara nʼụbọchị nile nke Koriantamọ, ma malite ibu-amụma nye ndị ahụ, n’ihi na e nweghị ike bịkwụsị ya n’ihi Mụọ nke Chineke nke dịịrị nʼime ya.

3 N’ihi na o atiri mkpu site nʼụtụtụ, ọbụna ruo nʼọdịda nke anyanwụ, na-agba ndị mmadụ ume ikwere na Chineke ruo nʼichegharị ma ọbụghị otu a ga bebibi ha, na-agwa ha na site cnʼokwukwe a na-emezu ihe nile—

4 Ya mere, onye ọbụla kwere na Chineke ga-enwe ike jiri obisike nwee aolile-anya maka ụwa nke ka mma, e, ọbụna ọnọdụ nʼaka-nri nke Chineke, bụ olile-anya nke na-abịa site nʼokwukwe, na-eme bndabere nye mkpụrụ-obi nile nke ụmụ-mmadụ, nke ga-eme ka ha kwusie ike ma guzogide, na-anọgide cnʼezi ọrụ nile oge nile, ebe a na-eduga ha dna-ito Chineke.

5 Ma o wee ruo na Ita buru amụma nnukwu na ihe ndị dị ịtụ-nʼanya nye ndị ahụ, ndị nke ha na-ekwereghị, n’ihi na ha ahụghị ha.

6 Ma ugbua, mụ, Moronaị, ga-ekwu ihe ole na ole gbasara ihe ndị a; aga m egosị ụwa na aokwukwe bụ ihe ndị batụrụ anya ha ma cahụghị ha anya; ya mere, arụla-ụka n’ihi na unu ahụghị, n’ihi na unu enwetaghị aka ebe ruo mgbe a dnwalesiworo okwukwe unu.

7 N’ihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka Kraịst jiri gosị ndị nna anyị onwe ya, mgbe o sịworo nʼọnwụ bilie; ma o gosịghị ha onwe ya ruo mgbe ha nweworo okwukwe na ya; ya mere, ọ ga-abụrịrị na ụfọdụ nwere okwukwe na ya; n’ihi na o gosịghị ụwa onwe ya.

8 Kama n’ihi okwukwe nke ndị mmadụ o gosịwo ụwa onwe ya, ma nye aha nke Nna otuto, ma kwado ụzọ nke a ga-esi na ya ndị ọzọ e wee nwere ike bụrụ ndị nketa nke onyinye elu-igwe, ka ha wee nwee olile-anya maka ihe ndị ahụ nke ha na ahụbeghị anya.

9 Ya mere, unu nwekwara ike inwe olile-anya ma bụrụ ndị nketa nke onyinye ahụ, ma ọbụrụ na unu ga-enwe okwukwe.

10 Lee ọ bụụrụ site nʼokwukwe ka a akpọrọ ndị mgbe ochie nʼụdị usoro nsọ nke Chineke.

11 Ya mere, site nʼokwukwe ka e nyere iwu nke Moses. Mana nʼonyinye nke Ọkpara ya ka Chineke kwadoworo ụzọ nke akachasị mma karịa; ma ọ bụ site nʼokwukwe ka e mejupụtaworo ya.

12 N’ihi na ọbụrụ na e nweghị aokwukwe nʼetiti ụmụ nke mmadụ, Chineke enweghị ike ime bọrụ-ebube ọbụla nʼetiti ha; ya mere, o gosịghị onwe ya ruo mgbe ha nweworo okwukwe.

13 Lee ọ bụ okwukwe nke Alma na Amiulek bụ ihe mere aụlọ-mkpọrọ ahụ jiri tụgharịa daa nʼala.

14 Lee, ọ bụụrụ okwukwe nke Nifaị na Lihaị bụ ihe kpatara amgbanwe ahụ jiri bịakwasị ndị Leman, nke mere na e mere ha baptism jiri ọkụ ma jiri bMụọ Nsọ.

15 Lee, ọ bụụrụ okwukwe nke aAmọn na ụmụnne ya nwoke bụ ihe bkpatara nnukwu ọrụ-ebube dị otu ahụ nʼetiti ndị Leman.

16 E, ma ọbụna ndị ahụ nile nke rụrụ aọrụ-ebube nile rụrụ ha site bnʼokwukwe ọbụna ndị ahụ nke biri tutu Kraịst na kwa ndị nke biri mgbe ọ bịasịworo.

17 Ma ọ bụụrụ site nʼokwukwe ka ndị-na-eso ụzọ atọ ahụ jiri nweta ikwe nkwa na ha agaghị aedetụ ọnwụ ire; ma ha enwetaghị ikwe-nkwa ahụ ruo mgbe ha gosịworo okwukwe.

18 Ma ọbụghị ma o nwere mgbe onye ọbụla meworo ọrụ-ebube ruo mgbe ha gosịworo okwukwe; ya mere, ha buru-ụzọ kwere nʼỌkpara nke Chineke.

19 Ma e nwere ọtụtụ ndị okwukwe ha siri ike karịa, ọbụna atutu Kraịst abịa, ndị a na-enweghị ike idebe site nʼime bakwa-mgbochi ahụ, kama ha jịrị anya ha hụ ihe ndị nke ha jiworo anya nke okwukwe hụ, ma ha nwere obi-ụtọ.

20 Ma lee, anyị ahụwo nʼakụkọ-ndekọta nke a na otu nʼime ndị a bụụrụ nwanne-nwoke nke Jared; n’ihi na otu a ka okwukwe ya dịịrị nnukwu nʼime Chineke, na mgbe Chineke wepụtara amkpịsị-aka ya o nweghị ike izonarị ya nwanne-nwoke nke Jared, n’ihi okwu ya nke o gwawooro ya, bụ okwu nke o nwetaworo site nʼokwukwe.

21 Ma mgbe nwanne-nwoke nke Jared hụworo mkpịsị-aka nke Onye-nwe, n’ihi aikwe-nkwa nke nwanne-nwoke nke Jared nwetaworo site nʼokwukwe, Onye-nwe enweghị kwa ike ijichi ihe ọbụla site nʼọhụhụ-anya ya; ya mere o gosịrị ya ihe nile, n’ihi na e nweghị kwa ike ịga nʼiru na-edebe ya na mpụta nke bakwa-mgbọchị ahụ.

22 Ma ọ bụ site nʼokwukwe ka ndị nna m nataworo aikwe-nkwa ahụ na ihe ndị a ga-abịakwute ụmụnne ha site nʼaka ndị Jentaịlụ; ya mere Onye-nwe enyewo m iwu-nsọ, e, ọbụna Jisus Kraịst.

23 Ma asịrị m ya: Onye-nwe, ndị Jentaịlụ ga-akwa ihe ndị a emo, n’ihi aadịghị-ike na-ide ihe anyị; n’ihi na Onye-nwe i mewo anyị dike nʼokwu site nʼokwukwe, mana i mebeghị anyị bdike nʼide ihe; n’ihi na i mewo ndị a nile ka ha nwe ike ikwu okwu hie nne, n’ihi Mụọ Nsọ nke i nyeworo ha;

24 Ma i mewo anyị ka anyị nwe ike dee ihe nanị ntakịrị, n’ihi adịchaghị mma nke aka anyị nile. Lee, i mebeghị anyị dike anʼide ihe dịka nwanne-nwoke nke Jared, n’ihi na i mere ya na ihe ndị nke o dere buru ibu ọbụna dịka i siri dị, ruo na ịdọta ndị mmadụ ịgụ ha.

25 I mepụtawo kwa okwu nile ka ha sie ike ma dị ukwuu, ọbụna nke mere na anyị enweghị ike ide ha; ya mere, mgbe anyị na-ede anyị na-ahụ adịghị ike anyị, ma na-akpọbigharị-ụkwụ n’ihi otu anyị na-esi edebe mkpụrụ-okwu anyị nile, ma egwu na-atụ m adịghị-ama-ama ndị Jentaịlụ aga-akwa okwu anyị nile emo.

26 Ma mgbe m kwuworo nke a, Onye-nwe gwara m okwu, na-asị: Ndị nzuzu na-aakwa-emo, mana ha ga-eru uju; ma amara m zuru-oke maka ndị dị nwayọ, ka ha ghara irite uru na adịghị-ike unu;

27 Ma ọbụrụ na ndị mmadụ bịakwute m aga m egosị ha aadịghị-ike ha. Ana m benye ndị mmadụ adịghị-ike ka ha wee dị umeala, ma camara m zuru oke maka ndị mmadụ nile nke dị dumeala nʼiru m; n’ihi na ọbụrụ na ha dị umeala nʼiru m, ma nwee okwukwe na m, mgbe ahụ ka m ga-eme ihe ndị ena-adịghị ike ka ha dịrị ike nye ha.

28 Lee, aga m egosị ndị Jentaịlụ adịghị ike ha, ma aga m egosị ha na aokwukwe, olile-anya na afọ-ọma na-ewetara m—isi mmiri nke ezi-omume nile.

29 Ma mụ, Moronaị, ebe m nụworo okwu ndị a nile, nwere nkasi-obi, ma sị: O Onye-nwe, ka e mee ọchịchọ ezi-omume gị, n’ihi na a matara m na ị na-arụrụ ụmụ nke mmadụ ọrụ dịka okwukwe ha siri dị;

30 N’ihi na nwanne-nwoke nke Jared gwara ugwu Zirịn ahụ, aPụọ—ma e wepụrụ ya. Ma ọbụrụ na o nweghị okwukwe, ọ garaghị apụ; ya mere ị na-arụ ọrụ mgbe ndị mmadụ nweworo okwukwe.

31 N’ihi na otu a ka i siri gosipụta ndị-na-eso-ụzọ gị onwe gị; n’ihi na mgbe ha nweworo aokwukwe, ma kwuo okwu nʼaha gị, i gosịrị ha onwe gị na nnukwu ike.

32 Ma e chetakwara m na i siri na i kwadowo ụlọ maka ndị mmadụ, e, ọbụna nʼetiti aebe obibi nile nke Nna gị, nʼime nke mmadụ ga-enwerịrị bolile-anya nke kachasị mma karịa; ya mere mmadụ ga-enwe olile-anya, ma-ọbụ ọ gaghị anata ihe nketa nʼebe ahụ nke i kwadoworo.

33 Ma ọzọ, echetara m na i kwuwo na i ahụwo ụwa nʼanya, ọbụna ruo nʼịtọgbọ ndụ gị maka ụwa, ka i wee nwe ike iwelite kwa ya ọzọ ịkwadoro ụmụ nke mmadụ ebe.

34 Ma ugbua a matara m na aịhụnanya nke a nke i nweworo nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ bụ afọ-ọma; ya mere, ma ọbụghị na ndị mmadụ ga-enwe afọ-ọma ha enweghị ike iketa ebe ahụ nke i kwadoworo nʼebe obibi nile nke Nna gị.

35 Ya mere, amatara m site nʼihe nke a nke i kwuworo, na ọbụrụ na ndị Jentaịlụ enweghị afọ-ọma, n’ihi adịghị ike anyị, na ị ga-achọpụta ha, ma wepụ aonyinye-chi ha, e, ọbụna nke ahụ ha nataworo, ma nye ya ndị nke ga-enwe nke karịrị-akarị.

36 Ma o wee ruo na ekpere m ekpere nye Onye-nwe ka o wee nye ndị Jentaịlụ aamara, ka ha wee nwee afọ-ọma.

37 Ma o wee ruo na Onye-nwe sịrị m: Ọbụrụ na ha enweghị afọ-ọma ọdịghị ihe o mere gị, i kwesịwo ntụkwasị-obi; ya mere, a ga-eme ka uwe gị nile dị aọcha. Ma n’ihi na ị hụwo badịghị ike gị a ga-eme ka ị sie ike, ọbụna ruo nʼịnọdụ ala nʼebe ahụ nke m kwadoworo nʼebe obibi nile nke Nna m.

38 Ma ugbua mụ, Moronaị, na-asị ndị Jentaịlụ nọdụ-nke-ọma, e, na kwa nye ụmụnne m ndị m hụrụ-nʼanya, ruo mgbe anyị ga-ezukọ nʼiru aoche-ikpe nke Kraịst, ebe mmadụ nile ga-amata na buwe m nile enweghị ntụpọ site nʼọbara unu.

39 Ma mgbe ahụ ka unu ga-amata na mụ aahụwo Jisus, ma na ọ gwawo m okwu biru na iru, ma na ọ gwara m nʼobi umeala dị mfe nghọta, ọbụna dịka mmadụ na-agwa onye ọzọ nʼasụsụ nke m, gbasara ihe ndị a.

40 Ma nanị ole na ole ka m deworo, n’ihi adịghị ike m nʼide ihe.

41 Ma ugbua, aga m atụnyere unu uche ka unu achọọ Jisus a nke ndị-amụma nile na ndị-ozi nile deworo maka ya, ka amara nke Chineke Nna, na kwa Onye-nwe Jisus Kraịst, na Mụọ Nsọ, nke na bagba-ama maka ha, wee dị ma nọgide nʼime unu ruo mgbe nile. Amen.