Akwụkwọ nsọ
Ita 1


Akwụkwọ nke Ita

Akụkọ-ndekọta nke ndị Jared, e wetara site nʼepekele iri abụọ na anọ ahụ ndị nke Lịmhaị chọtara nʼụbọchị nile nke eze Mosaịa.

Isi 1

Moronaị wee dee na nke-nke ihe odide nile nke Ita—Akụkọ-agbụrụ Ita e depụtara ya—Asụsụ nke ndị Jared agwakọtaghị ya nʼụlọ-elu tọwa nke Babel—Onye-nwe kwere nkwa iduru ha nʼala nke a họọrọ ma mee ha nnukwu mba.

1 Ma ugbua mụ, aMoronaị, na a ga nʼiru inye nkọwasị maka ndị ahụ biiri mgbe ochie ndị baka nke Onye-nwe bibiri nʼelu iru nke mba ebe elu-elu a.

2 Ma ana m ewere nkọwasị m site anʼepekele iri abụọ na anọ ahụ nke ndị nke Lịmhaị chọtara, nke a na-akpọ Akwụkwọ nke Ita.

3 Ma ebe m chere na akụkụ mbụ nke akụkọ-ndekọta nke a, nke na-ekwu gbasara okike nke ụwa, na kwa maka Adam, na nkọwasị nke sitere nʼoge ahụ ọbụna ruo na nnukwu aụlọ-elu tọwa ahụ, na ihe ọbụla nile mere nʼetiti ụmụ nke mmadụ ruo oge ahụ, e ji ya nʼetiti ndị Juu—

4 Ya mere anaghị m ede ihe ndị ahụ nke mere site nʼụbọchị nile nke aAdam ruo oge ahụ; mana e nwere ha nʼelu epekele ahụ nile; ma onye ọbụla chọtara ha, otu onye ahụ ga-enwe ike ka o wee nweta nkọwasị ahụ nʼuju.

5 Mana lee, anaghị m enye nkọwasị ahụ nʼuju; kama otu akụkụ nkọwasị ahụ ka m na-enye, site nʼụlọ-elu tọwa gbada ruo mgbe e bibiri ha.

6 Ma nʼụdị a ka m na-enye nkọwasị ahụ. Onye nke dere akụkọ-ndekọta a bụ aIta, ma ọ bụụrụ onye agbụrụ nke Korianto.

7 Korianto bụụrụ nwa-nwoke nke Morọn.

8 Ma Morọn bụụrụ nwa-nwoke nke Item.

9 Ma Item bụụrụ nwa-nwoke nke Aha.

10 Ma Aha bụụrụ nwa-nwoke nke Set.

11 Ma Set bụụrụ nwa-nwoke nke Shịblọn.

12 Ma Shịblọn bụụrụ nwa-nwoke nke Kom.

13 Ma Kom bụụrụ nwa-nwoke nke Koriantọm.

14 Ma Koriantọm bụụrụ nwa-nwoke nke Amnịgada.

15 Ma Amnịgada bụụrụ nwa-nwoke nke Erọn.

16 Ma Erọn bụụrụ onye si nʼagbụrụ nke Het, onye bụụrụ nwa-nwoke nke Hịatọm.

17 Ma Hịatọm bụụrụ nwa-nwoke nke Lịb.

18 Ma Lịb bụụrụ nwa-nwoke nke Kịsh.

19 Ma Kịsh bụụrụ nwa-nwoke nke Korọm.

20 Ma Korọm bụụrụ nwa-nwoke nke Livaị.

21 Ma Livaị bụụrụ nwa-nwoke nke Kịm.

22 Ma Kịm bụụrụ nwa-nwoke nke Moriantọn.

23 Ma Moriantọn bụụrụ onye si nʼagbụrụ nke Rịplekịsh.

24 Ma Rịplekịsh bụụrụ nwa-nwoke nke Shez.

25 Ma Shez bụụrụ nwa-nwoke nke Het.

26 Ma Het bụụrụ nwa-nwoke nke Kom.

27 Ma Kom bụụrụ nwa-nwoke nke Koriantọm.

28 Ma Koriantọm bụụrụ nwa-nwoke nke Ima.

29 Ma Ima bụụrụ nwa-nwoke nke Oma.

30 Ma Oma bụụrụ nwa-nwoke nke Shul.

31 Ma Shul bụụrụ nwa-nwoke nke Kịb.

32 Ma Kịb bụụrụ nwa-nwoke nke Oraịha, onye bụụrụ nwa-nwoke nke Jared;

33 aJared onye nke ya na nwanne ya nwoke na ezi na ụlọ ha soro bịa, ha na ụfọdụ ndị ọzọ na ezi na ụlọ ha nile, site na nnukwu ụlọ-elu tọwa ahụ, nʼoge ahụ Onye-nwe bgwakọtara asụsụ nke ndị ahụ, ma n̄ụọ iyi nʼoke iwe ya na a ga-ekposasị ha nʼelu ciru nile nke ụwa; ma dịka okwu nke Onye-nwe siri dị, ndị ahụ ekposasịrị ha.

34 Ma anwanne-nwoke nke Jared ebe ọ bụ onye gbara dimkpa na nwoke dị ike, na nwoke Onye-nwe gosịrị iru-ọma dị elu nke ukwuu, Jared, nwanne ya nwoke, gwara ya: Kpọkuo Onye-nwe, ka ọ ghara ịgbagwojụ anyị anya ka anyị wee ghara ịghọta okwu anyị nile.

35 Ma o wee ruo na nwanne-nwoke nke Jared kpọkuru Onye-nwe, ma Onye-nwe nwere ọmiko nʼarụ Jared; ya mere ọ gwakọtaghị asụsụ nke Jared; ma Jared na nwanne ya nwoke enweghị mgbagwọju-anya.

36 Mgbe ahụ Jared sịrị nwanne ya nwoke: Kpọkuo Onye-nwe ọzọ, ma o nwere ike ịbụ na ọ ga-atụgharị iwe ya site nʼebe ndị bụ ndị enyi anyị nọ, ka ọ ghara ịgwakọta asụsụ ha.

37 Ma o wee ruo na nwanne nwoke nke Jared kpọkuru Onye-nwe, ma Onye-nwe nwere ọmiko nʼarụ ndị enyi ha nile na kwa ezi na ụlọ ha, nke mere na ha enweghị mgbagwọju-anya.

38 Ma o wee ruo na Jared gwara nwanne ya nwoke okwu ọzọ, na-asị: Gaa ma jụta Onye-nwe ma ọ ga-achụpụ anyị site nʼala ahụ, ma ọbụrụ na ọ ga-achụpụ anyị site nʼala ahụ, kpọkuo ya ebe anyị ga-aga. Ma onye matara ma ọbụghị Onye-nwe ga-akpọga anyị nʼala nke bụ nke a ahọọrọ karịa nke ụwa nile? Ma ọbụrụ otu ahụ, ka anyị kwesị-ntụkwasị-obi nye Onye-nwe, ka anyị wee nata ya maka ihe nketa anyị.

39 Ma o wee ruo na nwanne-nwoke nke Jared kpọkuru Onye-nwe dịka ihe ahụ nke e kwuworo site nʼọnụ nke Jared siri dị.

40 Ma o wee ruo na Onye-nwe nụrụ olu nke nwanne-nwoke nke Jared, ma nwee ọmiko nʼarụ ya, ma sị ya:

41 Gaa ma kpọkọta igwe-anụ unu, ma oke ma nwunye, nʼụdị ọbụla, na kwa nke mkpụrụ-akụkụ nke ala ụdị ọbụla; na aezi na ụlọ unu nile; na kwa Jared nwanne gị nwoke na ezi na ụlọ ya; na kwa bndị enyi gị na ezi na ụlọ ha nile, ma ndị enyi nke Jared na ezi na ụlọ ha nile.

42 Ma mgbe unu meworo nke a ị ga aeburu ha ụzọ gbada nʼime ndagwurugwu ahụ nke di nʼelu-elu. Ma nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị, ma aga m beburu gị ụzọ gaba nʼala nke bụ nke a chọọrọ karịa ala nile nke ụwa.

43 Ma nʼebe ahụ ka m ga-agọzi gị na mkpụrụ-afọ gị, ma zulitere onwe m site na mkpụrụ-afọ gị, na site na mkpụrụ-afọ nke nwanne gị nwoke, na ndị nke ga-eso gị gaa, nnukwu mba. Ma agaghị enwe nke dị nnukwu karịa mba ahụ nke m ga-ewulitere onwe m site na mkpụrụ-afọ gị, nʼelu iru nile nke ụwa. Ma otu a ka m ga-emere gị n’ihi na ogologo oge a unu akpọkuwo m.