Akwụkwọ nsọ
Ita 11


Isi 11

Agha nile, nghọtahịe nile, na ajọọ-omume wee chịa ndụ ndị Jared—Ndị-amụma wee buo-amụma mbibi kpam-kpam nke ndị Jared ma ọbụghị na ha chegharịrị—Ndị ala ahụ jụrụ okwu nile nke ndị-amụma.

1 Ma nʼụbọchị nile nke Kom ọtụtụ ndị-amụma bịakwara, ma buo-amụma maka mbibi nke nnukwu ndị ahụ ma ọbụghị na ha ga-echegharị, ma tụgharịkwute Onye-nwe, ma hapụ igbu-mmadụ ha nile na ajọọ-omume.

2 Ma o wee ruo na ndị ahụ jụrụ ndị-amụma ahụ, ma ha gbakwuru Kom maka nchekwa, n’ihi na ndị ahụ chọrọ ibibi ha.

3 Ma ha buuru Kom amụma ọtụtụ ihe; ma a gọziri ya nʼụbọchị ya nile nke fọdụrụ.

4 Ma o biri ndụ ruo nʼịka-nka, ma mụta Shịblọm; ma Shịblọm chịrị nʼọnọdụ ya. Ma nwanne-nwoke nke Shịblọm nupụrụ-isi megide ya, ma a malitere inwe nnukwu ịlụ-agha karịrị-akarị nʼala ahụ.

5 Ma o wee ruo na nwanne-nwoke nke Shịblọm mere ka e gbuo ndị-amụma nile buru amụma maka mbibi nke ndị ahụ;

6 Ma e nwere nnukwu ọdachị nʼala ahụ, n’ihi na ha agbawo-ama na nnukwu ọbụbụ-ọnụ ga-abịakwasị ala ahụ, na kwa bịakwasị ndị ahụ, ma na a ga-enwe nnukwu mbibi nʼetiti ha, ụdị nke na-adịtụbeghị mbụ nʼelu iru nke ala ahụ, ma na ọkpụkpụ ha ga-adị ka amkpomkpo aja nʼelu iru nke ala ahụ ma ọbụghị na ha ga-echegharị site nʼajọọ-omume ha.

7 Ma ha an̄aghị ntị nʼolu nke Onye-nwe, n’ihi ntụgwa ọjọọ ha nile; ya mere, a malitere inwe ịlụ-agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile nʼala ahụ nile, na kwa ọtụtụ ụnwụ na ajọọ-ọrịa nile, nke mere na e nwere nnukwu mbibi, ụdị nke a na-amatabeghị mbụ nʼelu iru nke ala ahụ; ma ihe ndị a nile mezuru nʼụbọchị nile nke Shịblọm.

8 Ma ndị ahụ malitere ichegharị site nʼajọọ-omume ha; ma oge nile ọbụla ha mere otu a Onye-nwe meere ha aebere.

9 Ma o wee ruo na e gburu Shịblọm, ma a kpọbatara Set nʼime ndọkpụ nʼagha, ma o biri nʼime ndọkpụ nʼagha ụbọchị ya nile.

10 Ma o wee ruo na Aha, nwa ya nwoke, nwetara ala-eze ahụ; ma ọ chịrị ndị ahụ ụbọchị ya nile. Ma o mere ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche nʼụbọchị ya nile, site na nke a ọ kpatara ịkwafu nnukwu ọbara; ma ole na ole ka ụbọchị ya nile dị.

11 Ma Item, ebe ọ bụ onye-agbụrụ nke Aha, nwetara ala-eze ahụ; ma o mekwara ihe nke dị njọ nʼụbọchị ya nile.

12 Ma o wee ruo na nʼụbọchị nile nke Item ọtụtụ ndị-amụma bịara, ma buokwara ndị ahụ amụma ọzọ; e, ha buru-amụma na Onye-nwe ga-ebibi ha kpam kpam site nʼiru nke ụwa ma ọbụghị na ha chegharịrị site nʼajọọ-omume ha nile.

13 Ma o wee ruo na ndị ahụ mesịrị obi ha nile ike, ma ha achọghị aịn̄a-nti nʼokwu ha nile; ma ndị-amụma ahụ ruru uju ma site nʼetiti ndị ahụ wezuga onwe ha.

14 Ma o wee ruo na Item kpere ikpe nʼajọọ-omume ụbọchị ya nile; ma ọ mụtara Morọn. Ma o wee ruo na Morọn chịrị nʼọnọdụ ya; ma Morọn mere ihe nke dị njọ nʼiru Onye-nwe.

15 Ma o wee ruo na annupụ-isi malitere nʼetiti ndị ahụ, n’ihi ntụgwa nzuzo ahụ nke e wulitere iji nweta ike na uru; ma e nwere otu dike bilitere nʼetiti ha nʼajọọ-omume, ma nye Morọn ịlụ-agha, nʼime nke ọ kwaturu otu ọkara nke ala-eze ahụ; ma o chịkọtara otu ọkara nke ala-eze ahụ ọtụtụ afọ.

16 Ma o wee ruo na Morọn kwaturu ya, ma nweta kwa ala-eze ahụ ọzọ.

17 Ma o wee ruo na e nwere otu dike ọzọ bilitere; ma ọ bụụrụ onye agbụrụ nke nwanne-nwoke nke Jared.

18 Ma o wee ruo na ọ kwaturu Morọn ma nweta ala-eze ahụ, ya mere, Morọn biri na ndọkpụ nʼagha ụbọchị ya nile nke fọdụrụ; ma o mụtara Korianto.

19 Ma o wee ruo na Korianto biri na ndọkpụ nʼagha ụbọchị ya nile.

20 Ma nʼụbọchị nile nke Korianto e nwekwara ọtụtụ ndị-amụma bịara, ma buo-amụma maka nnukwu na ihe nile ndị dị ịtụ-nʼanya, ma kwusaa nchegharị nye ndị ahụ, ma, ma ọbụghị na ha chegharịrị, Onye-nwe Chineke ga-ekpe aikpe megide ha ruo nʼibibi ha kpam-kpam;

21 Mana Onye-nwe ga-ezite ma-ọbụ kpọbata andị ọzọ inwere ala ahụ, site nʼike ya nʼụdị ahụ nke o siri kpọta ndị nna ha.

22 Ma ha jụrụ okwu nile nke ndị-amụma, n’ihi otu nzuzo ha na ihe arụ ọjọọ ha nile.

23 Ma o wee ruo na Korianto mụtara aIta, ma ọ nwụrụ, ebe o biworo nʼime ndọkpụ nʼagha ụbọchị ya nile.