Akwụkwọ nsọ
Ita 6


Isi 6

Ụgbọ-mmiri nile nke ndị Jared ikuku nile nyagara ha nʼala nke e kwere na nkwa—Ndị ahụ wee too Onye-nwe maka ịdị-mma ya—E mere Oraịha eze na-achị ha—Jared na nwanne ya nwoke wee nwụọ.

1 Ma ugbua mụ, Moronaị, na-aga nʼiru inye akụkọ-ndekọta nke Jared na nwanne ya nwoke.

2 N’ihi na o wee ruo mgbe Onye-nwe kwadosịworo aokwute nile ahụ nke nwanne-nwoke nke Jared buliteworo nʼime ugwu ahụ, nwanne-nwoke nke Jared gbadatara site nʼugwu ahụ, ma o webara okwute nile ahụ nʼime ụgbọ-mmiri ndị ahụ a kwadoro, otu nʼime nsọtụ nke ọbụla; ma lee, ha nyere ìhè nʼụgbọ-mmiri nile ahụ.

3 Ma otu a Onye-nwe mere okwute nile ka ha nye ìhè nʼọchịchịrị, inye ndị nwoke, ndịnyom, na ụmụ, ìhè, ka ha wee ghara ịgafe nnukwu mmiri nile ahụ nʼọchịchịrị.

4 Ma o wee ruo na mgbe ha kwadoworo ụdị nri nile, nke ga-eme ka ha nwee ike dị ndụ nʼelu mmiri ahụ, na kwa nri maka igwe-anụ na igwe-anụmanụ ha, na maka ụdị anụ-ọhịa na anụmanụ ma-ọbụ anụ-ufe ọbụla nke ha ga-ebu gaa—ma o wee ruo na mgbe ha meworo ihe ndị a nile ha banyere nʼime ụgbọ-mmiri nile ma-ọbụ ụgbọ-njem ha nile, ma gawa nʼime oke osimiri ahụ na-etinye onwe ha nʼaka Onye-nwe Chineke ha.

5 Ma o wee ruo na Onye-nwe Chineke mere ka enwe aoke ikuku ga-efekwasị nʼelu mmiri ahụ nile, chee iru nʼala nke e-kwere-na-nkwa; ma otu a ka a tụgharịrị ha nʼelu mfegharị mmiri nile nke osimiri ahụ nʼiru ikuku ahụ.

6 Ma o wee ruo na ha e liri ha ọtụtụ oge nʼime omimi nile nke oke osimiri ahụ, n’ihi ugwu-ukwu nke mfegharị mmiri nile nke bịakwasịrị ha, na kwa nnukwu na oke ikuku mmiri nile dị egwu nke ịdị-egwu nke ikuku ahụ kpatara.

7 Ma o wee ruo na mgbe e liri ha nʼime omimi ahụ, onweghị mmiri ọbụla nke nwere ike imerụ ha arụ, ebe ụgbọ-mmiri ha nile asiri ike dịka efere, na kwa ha siri ike dịka bụgbọ nke Noa; ya mere mgbe ọtụtụ mmiri gbara ha gburu-gburu ha kpọkuru Onye-nwe, ma o welite kwara ha ọzọ nʼelu mmiri nile ahụ.

8 Ma o wee ruo na ikuku ahụ adịghị mgbe ọbụla ọ kwụsịrị ife chee iru nʼala ahụ e kwere-na-nkwa mgbe ha nọ nʼelu mmiri nile ahụ; ma otu a ka a nyagara ha nʼiru ikụkụ ahụ.

9 Ma ha abụrụ abụ otuto nye Onye-nwe, e, nwanne-nwoke nke Jared bụrụ abụ otuto nye Onye-nwe, ma o bkelere ma too Onye-nwe ogologo ụbọchị ahụ nile; ma mgbe abalị bịara, ha akwụsịghị ito Onye-nwe.

10 Ma otu a ka anyagharịrị ha; ma ọdịghị ajọọ-anụmanụ nke osimiri nwere ike ịkụwa ha, ma-ọbụ nnukwu-anụ mmiri dị ka azụ nke nwere ike imebi ha; ma ha nwere ìhè esepụghị-aka, ma ọ bụ nʼelu mmiri ahụ ma-ọbụ nʼokpuru mmiri ahụ.

11 Ma otu a ka a nyagharịrị ha, narị ụbọchị atọ na iri anọ na anọ nʼelu mmiri ahụ.

12 Ma ha kwụsịrị nʼelu ikpere-mmiri nke ala ahụ e kwere na nkwa. Ma mgbe ha zọgideworo ụkwụ ha nʼelu ikpere-mmiri nile nke ala ahụ e kwere na nkwa ha kpọrọ isi ala nʼelu iru nke ala ahụ, na mere onwe ha umeala nʼiru Onye-nwe, ma bepụta anya-mmiri nke ọn̄ụ nʼiru Onye-nwe, n’ihi igwe nke ebere ya nile dị nro nʼarụ ha.

13 Ma o wee ruo na ha gagharịrị nʼelu iru nke ala ahụ, ma malite ịkọ ala ahụ.

14 Ma Jared nwere ụmụ-nwoke anọ; ma a kpọrọ ha Jekọm, na Gịlga, na Maha, na Oraịha.

15 Ma nwanne-nwoke nke Jared mụtakwara ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị.

16 Ma andị enyi nile nke Jared na nwanne ya nwoke nke ọnụ-ọgụgụ ha bụ ihe dịka mkpụrụ-obi iri abụọ na abụọ; ma ha mụkwara ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị tutu ha eruo nʼala ahụ e kwere na nkwa; ma ya mere ha malitere ịdị ọtụtụ.

17 Ma a kụziiri ha aịga ije nʼobi umeala nʼiru Onye-nwe; ma a bkụzịkwaara ha ihe site nʼelu.

18 Ma o wee ruo na ha malitere ịgbasasị nʼelu iru nke ala ahụ, na ịmụba na ịkọ ala ahụ; ma ha gbasiri ike nʼala ahụ.

19 Ma nwanne-nwoke Jared malitere ịka nka, ma hụ na ya ga-agbada rịrị nʼala ili na nso-nso; ya mere ọ gwara Jared: Ka anyị kpọkọta ndị nke anyị ka anyị wee gụọ ha ọnụ, ka anyị mata site nʼaka ha ihe ha ga-achọ nʼaka anyị tutu anyị agbada nʼala ili anyị.

20 Ma otu ọ kwesịrị a kpọkọtara ndị ahụ ọnụ. Ugbua ọnụ-ọgụgụ ụmụ-nwoke nile na ụmụ-nwanyị nile nke nwanne-nwoke nke Jared dị mkpụrụ-obi iri abụọ na abụọ; ma ọnụ-ọgụgụ nke ụmụ-nwoke nile na ụmụ-nwanyị nile nke Jared dị iri na abụọ, ebe o nwere ụmụ-nwoke anọ.

21 Ma o wee ruo na ha gụrụ ndị ha ọnụ; ma mgbe ha gụchaworo ha ọnụ, ha chọrọ nʼaka ha ihe ndị nke ha chọrọ ka ha mee tutu ha agbada n’ili ha nile.

22 Ma o wee ruo na ndị ahụ chọrọ nʼaka ha ka ha atee otu nwa ha nwoke mmanụ ka ọ bụrụ eze na-achị ha.

23 Ma ugbua lee, nke a na ewute ha. Ma nwanne-nwoke nke Jared sịrị ya: Nʼezie ihe nke a ana-eduba nʼibu-oru.

24 Mana Jared gwara nwanne ya nwoke: Kwere ka ha nwee eze. Ma ya mere ọ sịrị ha: Họpụta nụ site nʼetiti ụmụ anyị ndị nwoke otu eze, ọbụna onye unu chọrọ.

25 Ma o wee ruo na ha họtara ọbụna nwa-mbụ nke nwanne-nwoke nke Jared; ma aha ya bụụrụ Pegag. Ma o wee ruo na ọ jụrụ ma ọ chọghị ịbụ eze ha. Ma ndị ahụ chọrọ ka nna ya manye ya, mana nna ya achọghị; ma o nyere ha iwu na ha ekwesịghị ịmanye onye ọbụla ịbụ eze ha.

26 Ma o wee ruo na ha họọrọ ụmụnne-nwoke nile nke Pegag, ma ha achọghị.

27 Ma o wee ruo na ọbụghị ma ụmụ-nwoke nile nke Jared ha chọrọ, ọbụna ha nile ma ọbụghị nanị otu; ma Oraịha e tere ya mmanụ ịbụ eze na-achị ndị ahụ.

28 Ma ọ malitere ịchị, ma ndị ahụ malitere ime nke-ọma; ma ha bara ọgaranya karịa.

29 Ma o wee ruo na Jared nwụrụ, na kwa nwanne ya nwoke.

30 Ma o wee ruo na Oraịha gara ije nʼumeala nʼiru Onye-nwe, ma chetara ụdị nnukwu ihe nile nke Onye-nwe meworo nna ya, ma kwa kụziere ndị ya ụdị nnukwu ihe nile Onye-nwe meworo ndị nna ha.