Akwụkwọ nsọ
Ita 9


Isi 9

Ala-eze ahụ wee na-agafee site nʼotu onye ruo nʼonye ọzọ site nʼagbụrụ, mgba-okpuru, na igbu-mmadụ—Ema hụrụ Ọkpara nke Ezi-omume—Ọtụtụ ndị-amụma kwusara nchegharị—Otu ụnwụ na agwọ ọtanye-nsi nile buteere ndị ahụ ajọọ-ahụhụ.

1 Ma ugbua mụ, Moronaị, na-aga nʼiru nʼakụkọ-ndekọta m. Ya mere, lee, o wee ruo na n’ihi antụgwa nzuzo nile nke Ekịsh na ndị enyi ya, lee, ha kwaturu ala-eze nke Ọma.

2 Otu o sila dị, Onye-nwe meere Ọma ebere, ya na ụmụ ya ndị nwoke na kwa ụmụ ya ndị nwanyị ndị nke na-achọghị mbibi ya.

3 Ma Onye-nwe dọrọ Ọma aka-na-ntị na nrọ ka ọ pụọ site nʼala ahụ; ya mere Ọma pụrụ site nʼala ahụ ya na ezi na ụlọ ya, ma gaa njem ọtụtụ ụbọchị, ma bịafeta ma gafee nʼakụkụ ugwu nke aShịm, ma bịafeta site bnʼebe ahụ nke e bibiri ndị Nifaị, ma site nʼebe ahụ gaa chee iru nʼọwụwa-anyanwụ, ma bịaruo ebe nke a na akpọ Ablọm, nʼakụkụ ikpere-mmiri, ma nʼebe ahụ ọ rụnyere ụlọ ikwuu ya, na kwa ụmụ ya ndị nwoke, na ụmụ ya ndị nwanyị, na ndị nile ya na ha bi, ma ọbụghị nanị Jared na ezi na ụlọ ya.

4 Ma o wee ruo na e tere Jared mmanụ ịbụ eze na-achị ndị ahụ nʼaka nke ajọọ-omume; ma o nyere Ekịsh nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.

5 Ma o wee ruo na Ekịsh chọrọ ndụ nke ọgọ ya nwoke, ma ọ chọrọ enyem-aka site nʼaka ndị ahụ ọ dụrụ-isi site nʼịn̄ụ-iyi nke ndị mgbe ochie, ma ha nwetara isi nke ọgọ ya nwoke, dịka ọ nọdụrụ nʼoche-eze ya, na-ege ndị ya ntị.

6 N’ihi na nnukwu ka mgbasa nke ihe ọjọọ na otu nzuzo a dị na o mebiworịị obi nile nke ndị ahụ nile; ya mere e gburu Jared nʼelu oche-eze ya, ma Ekịsh chịrị nʼọnọdụ ya.

7 Ma o wee ruo na Ekịsh malitere ikwoso nwa ya nwoke ekworo, ya mere, ọ kpọchịdere ya nʼụlọ-mkpọrọ, ma debe ya na ntakịrị nri ma-ọbụ erighị nri ruo mgbe agụụ gburu ya.

8 Ma ugbua nwanne-nwoke nke onye ahụ tara ahụhụ ọnwụ, (ma aha ya bụụrụ Nịmra) were iwe megide nna ya n’ihi ihe ahụ nke nna ya meworo nwanne ya nwoke.

9 Ma o wee ruo na Nịmra kpọkọtara ọnụ-ọgụgụ ndị nwoke dị ntakịrị, ma gbapụ site nʼala ahụ, ma gafeta ma binyere Ọma.

10 Ma o wee ruo na Ekịsh mụtara ụmụ-nwoke ndị ọzọ, ma ha nwetara obi nile nke ndị ahụ, na-agbanyeghị ha an̄ụworo ya iyi ime ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche dịka ihe nke ọ chọrọ.

11 Ugbua ndị nke Ekịsh chọsịrị uru ike, ọbụna dịka Ekịsh siri chọsie inweta ike ike; ya mere, ụmụ-nwoke nke Ekịsh nyere ha ego, site na nke a ha dọkpụpụtara akụkụ nke karịrị nʼime ndị ahụ ka ha soro ha.

12 Ma a malitere inwe ịlụ-agha nʼetiti ụmụ-nwoke nile nke Ekịsh na Ekịsh, nke nọgidere nʼohere nke ọtụtụ afọ, e, ruo na mbibi nke ọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ndị nke ala-eze ahụ nile, e, ọbụna ha nile, ma ọbụghị nanị mkpụrụ-obi iri atọ, na ndị nke gbapụrụ ha na ụlọ nke Ọma.

13 Ya mere, a kpọghachịkwara Ọma ọzọ nʼala nke nketa ya.

14 Ma o wee ruo na Ọma malitere ika nka; otu o sila dị, na nka ya ọ mụtara Ema; ma o tere Ema mmanụ ịbụ eze ịchị nʼọnọdụ ya.

15 Ma mgbe o tesịworo Ema mmanụ ịbụ eze ọ hụrụ udo nʼala ahụ nʼohere nke afọ abụọ, ma ọ nwụrụ, ebe ọ hụworo ọtụtụ afọ karịrị akarị, ndị nke jupụtara na mwute. Ma o wee ruo na Ema chịrị nʼọnọdụ ya, ma mejupụta nzọ-ụkwụ nile nke nna ya.

16 Ma Onye-nwe malitere iwepụ ọbụbụ-ọnụ ahụ site nʼala ahụ, ma ụlọ nke Ema mere nke-ọma karịa nʼokpuru ọchịchị nke Ema; ma nʼohere nke iri afọ isii na abụọ ha esịwọrịị ike karịa, nke mere na ha bara ọgaranya karịa—

17 Ebe e nwere ụdị mkpụrụ-osisi nile dị iche iche, ma nke akụkụ-ubi, na nke silk nile, na nke ọmarịcha akwa linen, na nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ihe ndị dị oke-ọnụ ahịa.

18 Ma kwa ụdị igwe-ehi nile, nke oke-ehi nile, na ehi nile dị iche iche, na nke atụrụ, na nke ezi nile, na nke ewu nile, na kwa ọtụtụ ụdị anụmanụ nile ndị ọzọ ndị nke bara uru maka nri nke mmadụ.

19 Ma ha nwekwara aịnyịnya nile, na anụ nile dịka ịnyịnya, ma e nwere enyi nile na kurilọm nile na kumọm nile; ha nile baara mmadụ uru, nke ka nke enyị nile ahụ na kurilọm na kumọm nile.

20 Ma otu a Onye-nwe wụpụtara ngọzi ya nile nʼala ahụ, nke bụ ala a ahọọrọ karịa ala ndị ọzọ nile; ma o nyere iwu na onye ọbụla nke ga-enwere ala ahụ ga-enwere ya nye Onye-nwe, ma-ọbụ a bga-ebibi ha mgbe ha chazuru nʼajọọ-omume; n’ihi na nʼelu ụdị ahụ, ka Onye-nwe kwuru: aga m awụpụta uju nke iwe m.

21 Ma Ema kpere ikpe nʼezi-omume ụbọchị ya nile, ma ọ mụtara ọtụtụ ụmụ-nwoke na ụmụ-nwa-nwanyị, ma ọ mụtara Koriantọm, ma o tere Koriantọm mmanụ ịchị nʼọnọdụ ya.

22 Ma mgbe o teworo Koriantọm mmanụ ịchị nʼọnọdụ ya o biri afọ anọ, ma ọ hụrụ udo nʼala ahụ; e, ma ọ hụrụ ọbụna aỌkpara nke Ezi-omume, ma wee n̄ụrịa ma nwee otuto nʼụbọchị ya; ma ọ nwụrụ nʼudo.

23 Ma o wee ruo na Koriantọm gara-ije na nzọ-ụkwụ nile nke nna ya, ma wuo ọtụtụ obodo-ukwu siri ike, ma kụziere ndị ya ihe nke dị mma nʼụbọchị ya nile. Ma o wee ruo na o nweghị ụmụ ọbụna ruo mgbe o kara nka karịa.

24 Ma o wee ruo na nwunye ya nwụrụ, ebe ọ gbara otu narị afọ na abụọ. Ma o wee ruo na Koriantọm kpọrọ ka ọ bụrụ nwunye ya, na nka ya, otu nwa-agbọghọbịa, ma mụta ụmụ-nwoke na ụmụ-nwanyị; ya mere ọ biri ruo mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri afọ anọ na abụọ.

25 Ma o wee ruo na ọ mụtara Kom, ma Kom chịrị iri afọ anọ na iteghete, ma ọ mụtara Het; ma ọ mụtakwara ụmụ-nwoke ndị ọzọ na ụmụ-nwanyị.

26 Ma ndị ahụ gbasasịkwara ọzọ nʼelu iru nile nke ala ahụ, ma a malitekwara ọzọ inwe nnukwu ajọọ-omume karịa nʼelu iru nke ala ahụ, ma Het malitere isonye nʼime atụmatụ nzuzo nile nke mgbe ochie ahụ ọzọ, ibibi nna ya.

27 Ma o wee ruo na ọ kwadara nna ya nʼọchịchị, n’ihi na ọ jiri mma-agha nke ya gbuo ya; ma ọ chịrị nʼọnọdụ ya.

28 Ma ndị-amụma nile bịara nʼala ahụ ọzọ, na-ekwusara ha nchegharị—na ha ga-edozirịrị ụzọ nke Onye-nwe ma-ọbụ ọbụbụ-ọnụ ga-abịakwasị nʼelu iru nke ala ahụ, e, ọbụna a ga-enwe nnukwu ụnwụ, nʼime nke a ga-ebibi ha ma ọbụrụ na ha echegharịghị.

29 Mana ndị ahụ ekweghị okwu nile nke ndị-amụma nile ahụ, kama ha chụpụrụ ha; ma ụfọdụ nʼime ha ka ha tụbara nʼime olulu nile ma hapụ ha ka ha laa nʼiyi. Ma o wee ruo na ha mere ihe nile ndị a dịka iwu nke eze Het ahụ siri dị.

30 Ma o wee ruo na a malitere inwe ụkọ-nri nʼala ahụ, ma ndị nile bi nʼime ya a malitere ibịbị ha ọsọ-ọsọ karịa n’ihi ụkọ-nri ahụ, n’ihi na enweghị mmiri ozuzo nʼelu iru nke ala ahụ.

31 Ma agwọ-nsi nile bịarutekwara nʼelu iru nke ala ahụ, ma tanye ọtụtụ mmadụ nsi. Ma o wee ruo na igwe-anụ ha nile malitere ịgbapụ nʼiru agwọ-nsi nile ahụ, chee iru nʼala dị na ndịda-ndịda, nke ndị Nifaị na-akpọ aZarahemla.

32 Ma o wee ruo na e nwere ọtụtụ ha ndị nwụrụ nʼụzọ ahụ; otu o sila dị, e nwere ụfọdụ ndị nke gbagara nʼala nke dị na ndịda-ndịda.

33 Ma o wee ruo na Onye-nwe mere ka aagwọ ndị ahụ kwụsị ịchụ ha ọsọ, kama ka ha gbagide ha ogige otu ndị ahụ na-agaghị enwe ike igafe, na onye ọbụla ga a nwa anwa ịgafee ga ada site nʼagwọ-ọtanye-nsi nile ahụ.

34 Ma o wee ruo na ndị ahụ soro ụzọ-njem nke anụmanụ nile ndị ahụ, ma richapụ ozu nile nke ndị nke dara nʼakụkụ ụzọ, ruo mgbe ha richapụrụ ha nile. Ugbua mgbe ndị ahụ hụrụ na ha ga-alarịrị nʼiyi ha malitere aichegharị site nʼajọọ-omume ha nile ma kpọkuo Onye-nwe.

35 Ma o wee ruo na mgbe ha meworo onwe ha aumeala otu o kwesịrị nʼiru Onye-nwe, o zitara mmiri-ozuzo nʼelu iru nke ala ahụ; ma ndị ahụ malitekwara ịdị-ndụ ọzọ, ma a malitere inwe mkpụrụ-osisi na mba ndị dị nʼelu-elu, na na mba ndị nke gbara gburu-gburu. Ma Onye-nwe gosipụtara ike ya nye ha nʼichekwa ha site nʼụnwụ.