Akwụkwọ nsọ
Ita 14


Isi 14

Ajọọ-omume nke ndị ahụ wee weta ọbụbụ-ọnụ nʼala ahụ—Koriantamọ wee gaa nʼịlụ-agha megide Gịlied, emesịa Lịb, ma emesịa Shịz—Ọbara na nnukwu-igbu-mmadụ wee jupụta ala ahụ.

1 Ma ugbua a malitere inwe nnukwu aọbụbụ-ọnụ nʼala ahụ n’ihi ajọọ-omume nke ndị ahụ, nʼime nke, ọbụrụ na mmadụ ga-atọgbọ ngwa-ọrụ ya ma-ọbụ mma-agha ya nʼelu ebe ntụkwasị-ihe ya, ma-ọbụ nʼelu ebe nke ọ ga-edebe ya, lee, nʼechi ya, ọ gaghị achọta ya, oke nnukwu ka ọbụbụ-ọnụ ahụ dị nʼala ahụ.

2 Ya mere onye ọbụla jidesiri aka ya abụọ ike nʼihe nke bụ nke ya, ma ha achọghị ịgbazi ihe ọbụghị ma ha chọrọ ịgbazinye ihe; ma nwoke ọbụla debere isi-mma agha ya nʼaka nri ya, na nchekwa nke ihe-onwunwe ya na ndụ nke ya na ndị nwunye ya na ụmụ ya.

3 Ma ugbua, mgbe ohere nke afọ abụọ gasịrị, na mgbe Shared nwụsịrị, lee, e nwere nwanne-nwoke nke Shared biliri ma o nyere Koriantamọ ịlụ-agha, nʼime nke Koriantamọ meriri ya ma chụọ ya ọsọ ruo na ọzara nke Ekịsh.

4 Ma o wee ruo na nwanne-nwoke nke Shared nyere ya ịlụ-agha nʼime ọzara nke Ekịsh ahụ; ma ịlụ-agha ahụ diziri egwu karịa, ma ọtụtụ puku dara site na mma-agha.

5 Ma o wee ruo na Koriantamọ gbara ha gburu-gburu ruo nʼọzara ahụ; ma nwanne-nwoke nke Shared zọrọ-ije site nʼọzara ahụ pụọ nʼabalị ma gbuo otu akụkụ nke ndị-agha nke Koriantamọ, mgbe ha n̄ụbigara mmanya oke.

6 Ma ọ bịaruru nʼala nke Morọn, ma debe onwe ya nʼelu oche-eze nke Koriantamọ.

7 Ma o wee ruo na Koriantamọ biri nʼime ọzara ahụ ya na ndị-agha ya nʼohere nke afọ abụọ, nʼime nke o nwetara nnukwu ume o nyere ndị-agha ya.

8 Ugbua nwanne-nwoke nke Shared, onye aha ya bụụrụ Gịlied, natakwara nnukwu ume o nyere ndị-agha ya, n’ihi ihe ntugwa nzuzo nile.

9 Ma o wee ruo na onye isi nchụ-aja ya gburu ya mgbe ọ nọdụrụ nʼelu oche-eze ya.

10 Ma o wee ruo na otu onye nke ihe ntugwa nzuzo nile ahụ gburu ya nʼụzọ nzuzo nta, ma nwetara onwe ya ala-eze ahụ; ma aha ya bụụrụ Lịb; ma Lịb bụụrụ nwoke nke toro nnukwu ogologo, karịa onye ọbụla ọzọ nʼetiti ndị ahụ nile.

11 Ma o wee ruo na nʼafọ nke mbụ nke Lịb, Koriantamọ gbagotara rute nʼala nke Moron, ma nye Lịb ịlụ-agha.

12 Ma o wee ruo na ọ lụsoro Lịb ọgụ, nʼime nke Lịb kụrụ ya ihe nʼaka nke mere na e meruru ya arụ; otu o sila dị, ndị-agha nke Koriantamọ gara nʼiru chụso Lịb, nke mere na ọ gbagara na oke-ala nile dị nʼelu ikpere-mmiri ahụ.

13 Ma o wee ruo na Koriantamọ chụrụ ya ọsọ; ma Lịb nyere ya ịlụ-agha nʼelu ikpere-mmiri ahụ.

14 Ma o wee ruo na Lịb mekpara ndị-agha nke Koriantamọ arụ, nke mere na ha gbapụkwara ọzọ gaa nʼọzara nke Ekịsh ahụ.

15 Ma o wee ruo na Lịb chụrụ ya ọsọ ruo mgbe ọ bịaruru nʼala dị larịị nke Egọsh. Ma Koriantamọ akpọrọwo ndị nile tinyere onwe ya mgbe ọ na-agbafe nʼiru Lịb nʼakụkụ ala ahụ nke ọ gbagara.

16 Ma mgbe ọ bịaruworo nʼala ahụ dị larịị nke Egọsh o nyere Lịb ịlụ-agha, ma ọ kụgidere ya ihe ruo mgbe ọ nwụrụ; otu o sila dị, nwanne-nwoke nke Lịb bịara megide Koriantamọ nʼonodu ya, ma ịlụ-agha ahụ dịziri egwu karịa, nʼime nke Koriantamọ gbapụkwara ọzọ nʼiru ndị-agha nke nwanne-nwoke nke Lib.

17 Ugbua aha nke nwanne-nwoke nke Lịb bụụrụ Shịz. Ma o wee ruo na Shịz chụrụ Koriantamọ ọsọ, ma ọ kwaturu ọtụtụ obodo-ukwu, ma o gburu ma ndịnyom ma ụmụ-ntakịrị, ma ọ gbara obodo-ukwu ndị ahụ ọkụ.

18 Ma e nwere ịtụ-egwu nke Shịz, nʼakụkụ nile nke ala ahụ; e, iti-mkpu gazuru site nʼakụkụ nile nke ala ahụ—Onye ga-enwe ike guzoro nʼiru ndị-agha nke Shịz? Lee, ọ na-azachasị ala ahụ nʼiru ya!

19 Ma o wee ruo na ndị ahụ malitere ịgbakọta ọnụ n’igwe ndị-agha nile, nʼakụkụ iru nile nke ala ahụ.

20 Ma e kewara ha ekewa; ma otu akụkụ nʼime ha gbafere gakwuru ndị-agha nke Shịz, ma otu akụkụ nʼime ha gbafere gakwuru ndị-agha nke Koriantamọ.

21 Ma nnukwu na ịnọ-ọdụ ka ịlụ-agha ahụ dịworo, ma ogologo ka ọnọdụ nke ịkwafu-ọbara ahụ na nnukwu igbu-mmadụ dịworo, nke mere na iru nke ala ahụ nile jupụtara anʼarụ nile nke ndị nwụrụ-anwụ.

22 Ma nʼike na ọsọ-ọsọ ka ịlụ-agha ahụ dịịrị nke mere na ọdịghị onye fọdụrụ ga-eli ndị ahụ nwụrụ-anwụ, ma ha zọghachiri ije site nʼịkwafu ọbara ruo nʼịkwafu ọbara, na-ahapụ arụ nile ma nke ndịkom, ma ndịnyom, ma ụmụ-ntakịrị a wụsasịrị nʼelu iru nke ala ahụ, ka ha ghọọ ihe oriri nye aikpuru nile nke anụ-arụ.

23 Ma ísì ya gazuru nʼelu iru nke ala ahụ, ọbụna nʼelu iru nile nke ala ahụ; ya mere o sogburu ndị ahụ nʼehihie ma nʼabalị, n’ihi ísì dị nʼebe ahụ.

24 Otu o sila dị, Shịz akwusịghị ịchụ Koriantamọ ọsọ; n’ihi na ọ n̄ụwo-iyi ibọrọ onwe ya ụbọ nʼarụ Koriantamọ maka ọbara nke nwanne ya nwoke, nke e gbuworọrịị, na okwu nke Onye-nwe nke bịakwutere Ita na Koriantamọ agaghị ada site na mma-agha.

25 Ma otu a, anyị na-ahụ na Onye-nwe letara ha nʼuju nke iwe ya, ma ajọọ-omume ha na ihe arụ nile akwadowọrịị ụzọ maka mbibi mgbe nile na-adigide ha.

26 Ma o wee ruo na Shịz chụgara Koriantamọ ọsọ nʼakụkụ ọwụwa-anyanwụ, ọbụna ruo nʼoke-ala dị nʼakụkụ ikpere-mmiri, ma nʼebe ahụ o nyere Shịz ịlụ-agha nʼohere nke ụbọchị atọ.

27 Ma oke egwu ka mbibi nke dị nʼetiti ndị-agha nke Shịz dịịrị nke mere na ndị ahụ malitere ịtụ egwu-mberede, ma malite ịgbafu nʼiru ndị-agha nile nke Koriantamọ; ma ha gbagara nʼala nke Korịho, ma zachapụ ndị nile bi nʼime ya nʼiru ha, ndị nile nke na-ekweghị isoro ha.

28 Ma ha rụnyere ụlọ ikwuu ha na ndagwurugwu nke Korịho; ma Koriantamọ rụnyere ụlọ-ịkwuu ya nile na ndagwurugwu nke Shaa. Ugbua ndagwurugwu nke Shaa ahụ dịịrị nso nʼugwu Komno; ya mere, Koriantamọ kpọkọtara ndị-agha ya nile ọnụ nʼelu ugwu Komno ahụ, ma gbuoro ndị-agha nke Shịz opi iji kpọbata ha nʼịlụ-agha.

29 Ma o wee ruo na ha bịarutere, mana a chụghachị-kwara ha ọzọ; ma ha bịakwara nke ugboro abụọ, ma a chụghachịkwara ha ọzọ nke ugboro abụọ. Ma o wee ruo na ha bịa-kwara ọzọ nke ugboro atọ, ma ịlụ-agha ahụ dịziri egwu karịa.

30 Ma o wee ruo na Shịz kụrụ Koriantamọ ihe nʼelu arụ nke mere na o nyere ya ọtụtụ mmeru-arụ miri-emi; ma Koriantamọ, ebe ọ tufuworo ọbara ya, dara mba, ma e bupụrụ ya dịka a ga-asị na o nwụrụ anwụ.

31 Ugbua ntụfu nke ndịkom, ndịnyom na ụmụ-ntakịrị nʼakụkụ abụọ nile ahụ buru oke ibu nke mere na Shịz nyere ndị nke ya iwu ka ha ghara ịchụ ndị-agha nile nke Koriantamọ ọsọ; ya mere ha laghachịrị nʼebe izu ike ha.