Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 9


Isi 9

Moronaị wee kpọkuo ndị nke na-ekweghị na Kraịst ka ha chegharịa—O wee kwupụta Chineke nke ọrụ-ebube nile, onye-na-enye mkpughe nile ma na-awụpụtakwasị ndị okwukwe onyinye nile na ihe iriba-ama nile—Ọrụ-ebube nile na-akwụsị n’ihi ekweghị-ekwe—ihe iriba-ama na-eso ndị nke kwere ekwe—A na-agba ndị mmadụ ume inwe amamihe na idebe iwu-nsọ nile ahụ. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua, ana m ekwu kwa gbasara ndị ahụ na-ekweghị na Kraịst.

2 Lee, unu ga-ekwere nʼụbọchị nke nleta unu—lee, mgbe Onye-nwe ga-abịa, e, ọbụna annukwu ụbọchị ahụ mgbe a ga-afụkọta bụwa ọnụ dịka akwụkwọ afụkọtara afụkọta, ma ihe nile dị nʼime ya cga-agbaze site nʼoke ọkụ na-eresike, e, na nnukwu ụbọchị ahụ mgbe a ga-akpọta unu iguzo nʼiru Nwa-atụrụ nke Chineke—mgbe ahụ unu ga-asị na ọdịghị Chineke dị?

3 Mgbe ahụ unu ga-aga nʼiru na-agọnarị Kraịst ahụ, ma-ọbụ unu nwere ike ile Nwa-atụrụ nke Chineke ahụ? Unu nwere ike ibinyere ya na mmata nke ikpe-ọmụma nke mụọ unu nke ọma? Unu chere na unu ga-enwe an̄ụrị ibinyere Onye nsọ ahụ, mgbe a tara mkpụrụ-obi unu ahụhụ na mmata nke ikpe-ọmụma nke mụọ na unu nọgidere nʼijehie iwu ya nile?

4 Lee, asị m unu na unu ga-anọ nʼọnọdụ nhuju-anya karịa nʼibinyere Chineke ahụ dị nsọ na onye ziri-ezi, nʼọmụma nke iru-inyi unu nʼiru ya, karịa ka unu ga anọ ibinyere amkpụrụ-obi nile ndị a mara ikpe bnʼala-mụọ.

5 N’ihi na lee, mgbe a ga-akpọta unu ịhụ aịgba-ọtọ unu nʼiru Chineke, na kwa ebube nke Chineke, na ịdị nsọ nke Jisus Kraịst, ọ ga amụnye-kwasị unu ire ọkụ na anaghị-ekwe-mmenyụ.

6 O mgbe ahụ unu ndị ana-anaghị ekwe ekwe, btụgharịkwute nụ Onye-nwe; kpọkuo Nna nnukwu mkpọku nʼaha nke Jisus, na mgbe ụfọdụ a ga-enweta unu cnʼenweghị ntụpọ, ịdị-ọcha, ịma mma, na ọcha, ebe a sachaworo unu site nʼọbara nke dNwa-atụrụ ahụ, na nnukwu na ụbọchị ikpe-azụ ahụ.

7 Ma ọzọ ana m agwa unu ndị ana-agọnarị mkpughe nile nke Chineke, ma sị na-ewezugawo ha, na enweghị mkpughe ọbụla dị, ma-ọbụ amụma nile, ma-ọbụ onyinye nile, ma-ọbụ ọgwụgwọ, ma-ọbụ ịkwu nʼasụsụ nile, na bịsụgharị asụsụ nile;

8 Lee asị m unu, onye nke na-agọnarị ihe ndị a amaghị aozi-ọma nke Kraịst; e, ọ gụbeghị akwụkwọ-nsọ nile; ọbụrụ otu ahụ, ọ bghọtaghị ha.

9 Ma ọ bụ na anyị anaghị agụ na Chineke bụ aotu ihe ahụ ụnyahụ, taa, na ruo mgbe nile, ma nʼime ya ọ dịghị mgbanwe dị ọbụghị ma enwere onyinyo nke ịgbanwe agbanwe?

10 Ma ugbua, ọbụrụ na unu echeliteworo onwe unu otu chi onye na-agbanwe agbanwe, na nʼime onye nke e nwere onyinyo nke ịgbanwe agbanwe, mgbe ahụ ka unu cheliteworo onwe unu otu chi onye na abụghị Chineke nke ọrụ-ebube nile.

11 Mana lee, aga m egosị unu otu Chineke nke ọrụ-ebube nile, ọbụna Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb; ma ọ bụ otu aChineke ahụ onye kere elu-igwe nile na ụwa, na ihe nile nke dị nʼime ha.

12 Lee, o kere Adam, ma site na aAdam ka bọdịda nke mmadụ siri bịa. Ma n’ihi ọ dịda nke mmadụ ahụ ka Jisus Kraịst jiri bịa, ọbụna Nna na Ọkpara; ma n’ihi Jisus Kraịst ka cmgbapụta nke mmadụ siri bịa.

13 Ma n’ihi mgbapụta nke mmadụ, nke sitere na Jisus Kraịst bịa, a na akpọghachị ha nʼebe Onye-nwe nọ; e, nke a bụ ụzọ nke esị nʼagbapụta mmadụ nile, n’ihi na ọnwụ nke Kraịst na-eme ka ambilite-nʼọnwụ mezuo, nke na-eweta na mmezu mgbapụta site bnʼụra agwụgh-agwụ, site nʼụra nke a ga-akpọte mmadụ nile site nʼike nke Chineke mgbe opi ga ada; ma ha ga-apụta, ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ha nile ga eguzoro nʼiru oche-ikpe ya, ebe a gbapụtara ha ma tọpụ ha site cnʼagbụ ebighi-ebi nke ọnwụ a, ọnwụ nke bụ ọnwụ nke arụ.

14 Ma mgbe ahụ ka aikpe nke Onye Nsọ ahụ ga-abịakwasị ha; ma mgbe ahụ ka oge ahụ ga-abịa mgbe onye nke bruru inyị ga-anọgide nʼiru inyi; ma onye nke bụ onye ezi-omume ga-anọgide kwa nʼezi-omume; onye nke nwere an̄ụrị ga-anọgide kwa nʼan̄ụrị; ma onye nke na-enweghị an̄ụrị ga-anọgide kwa na-enweghị an̄ụrị.

15 Ma ugbua, O unu nile ndị cheliteworo nye onwe unu otu chi onye na aenweghị ike ime ọrụ-ebube nile, aga m ajụ unu, ihe nile ndị a ha a gafewo, nke m kwuworo maka ha? Nsọtụ ahụ ọ bịawo? Lee asị m unu, E-e; ma Chineke akwusịbeghị ịbụ Chineke nke ọrụ-ebube nile.

16 Lee, ihe nile nke Chineke meworo ha atụghị unu nʼanya? E, onye nwere ike ịghọta aọrụ ịtụ nʼanya nile nke Chineke?

17 Onye ga-asị na ọ bụghị ọrụ-ebube na site anʼokwu ya elu-igwe na ụwa ga-adị; na site nʼike nke okwu ya e bkere mmadụ site cnʼuzuzu nke aja; na site nʼike nke okwu ya ka e meworo ọrụ-ebube nile?

18 Ma onye ga-asị na Jisus Kraịst emeghị ọtụtụ nnukwu aọrụ-ebube nile? Ma e nwere ọtụtụ nnukwu ọrụ-ebube nile e jiri aka nile nke ndị-ozi mee.

19 Ma ọbụrụ na e nwere aọrụ-ebube nile e mere mgbe ahụ, gịnị mere Chineke jiri kwusị ịbụ Chineke nke ọrụ-ebube nile ma na-abụ kwa Onye na anaghị agbanwe agbanwe? Ma lee, asị m unu ọ naghị agbanwe agbanwe; ọbụrụ otu ahụ ọ ga-akwụsị ịbụ Chineke; mana ọ kwusịghị ịbụ Chineke, ma-ọbụ Chineke nke ọrụ-ebube nile.

20 Ma ihe mere o jiri kwusị ime aọrụ-ebube nile nʼetiti ụmụ nke mmadụ bụ n’ihi na ha na-ala-azụ n’ihi ekweghị-ekwe, ma pụọ site nʼezigbo ụzọ, ma ha amaghị Chineke nʼime onye nke ha bga-atụkwasị obi.

21 Lee, asị m unu na onye ọbụla nke kwere na Kraịst, na-enweghị obi abụọ nʼihe ọbụla, aihe ọbụla ọ ga-arịọ Nna nʼaha nke Kraịst a ga-enye ya ihe ahụ; ma nkwa nke a dịrị mmadụ nile, ọbụna ruo na nsọtụ nile nke ụwa.

22 N’ihi na lee, otu a ka Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke gwara ndị na-eso-ụzọ ya ndị ga-anọdụ, e, na kwa gwa ndị na-eso-ụzọ ya nile, na ọnụnụ nke igwe-mmadụ ahụ: aGaa nụ nʼime ụwa nile, ma kwusaa ozi-ọma ahụ nye ihe ọbụla e kere eke;

23 Ma onye nke kwere ma e mee ya baptism a ga-azọpụta ya, mana onye nke na-ekweghị a aga-ama ya ikpe.

24 Ma aihe iriba-ama ndị a ga-eso ndị nke kwere ekwe—nʼaha m ka ha ga-achụpụ bmụọ-ọjọọ nile; ha ga-eji ire ọhụrụ kwuo okwu; ha ga-ewelite agwọ nile; ma ọbụrụ na ha n̄ụọ ihe ọbụla na egbu-mmadụ ọ gaghị emerụ ha arụ; ha ga-ebịkwasị ndị ọrịa caka ma ha ga-enweta arụ-ike ọzọ;

25 Ma onye ọbụla nke ga-ekwere nʼaha m, na enweghị obi abụọ nʼihe ọbụla, ya ka m aga-akwadoro okwu m nile, ọbụna nye nsọtụ nile nke ụwa.

26 Ma ugbua, lee, onye nwere ike iguzo imegide ọrụ nile nke Onye-nwe? aOnye nwere ike ịgọnarị ihe nile o kwuru? Onye ga-ebilite imegide ike kacha ike nile nke Onye-nwe? Onye ga-elelị ọrụ nile nke Onye-nwe? Onye ga-elelị ụmụ nke Kraịst? Lee, unu nile ndị bna-elelị ọrụ nile nke Onye-nwe, n’ihi na unu ga-echegide echiche ma laa nʼiyi.

27 O mgbe ahụ elelịkwala, ma echekwala echiche kama n̄aa-ntị nʼokwu nile nke Onye-nwe, ma rịọ Nna nʼaha nke Jisus maka ihe ọbụla nke unu ga-achọ. Enwela obi-abụọ, kama na-ekwere, ma malite dịka nʼoge mgbe ochie nile, ma abịakwute Onye-nwe jiri bobi unu nile, ma crụpụta nzọpụta nke unu jiri egwu na ịma jijiji nʼiru ya.

28 aMara ihe nʼụbọchị nile nke mnwale unu, wezuga onwe unu na adịghị ọcha nile; arịọla, ka unu wee mefuo ya bnʼọchịchọ-nke-anụ-arụ unu nile, kama jiri nụ ịgbasi ike nke akwaa-akwụrụ rịọ, ka unu ghara ịdanye nʼọnwụnwa, kama na unu ga-efe cChineke nke ezi-okwu dị ndụ.

29 Hụ na aemeghị unu baptism nʼezughị-oke; hụ na unu eketaghị-oke nʼoriri-nsọ nke Kraịst bnʼezughị-oke; kama hụ na unu mere ihe nile cnʼitozu-oke, ma mee ya nʼaha nke Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ; ma ọbụrụ na unu mee nke a, ma anọgide ruo ọgwụgwụ, agaghị achụpụ unu ma ọlị.

30 Lee, ana m agwa unu okwu dịka m na aekwu site na ndị nwụrụ-anwụ; n’ihi na a matara m na unu ga-anata okwu m nile.

31 Amala m ikpe n’ihi aezughị-oke m, ma-ọbụ nna m, n’ihi ezughị-oke ya, ma-ọbụ ndị nke deworo tutu ya edee; kama nye Chineke ekele na o mewo ka ezughị-oke anyị nile pụta ìhè nye unu, ka unu wee mụta ịma ihe karịa ka anyị maworo.

32 Ma ugbua, lee, anyị edewo akụkọ-ndekọta nke a dịka anyị siri mụta, na mkpụrụ-akwụkwọ nile nke a na-akpọ nʼetiti anyị, aaka-akwụkwọ-ndị-Ijipt e dezigharịrị edezịgharị, ebe e nyedatara ya ma gbanwe ya site nʼaka anyị, dịka ụdị ikwu okwu anyị siri dị.

33 Ma ọbụrụ na epekele anyị nile buwororịị ibu dịka o siri kwesi anyị gaara ede nʼasụsụ ndị Hibru, mana nke ndị Hibru ahụ anyị agbanwewo kwa ha; ma ọbụrụ na anyị nwererịị ike dee nʼasụsụ ndị Hibru, lee, unu agaraghị enwe ezughị-oke nʼakụkọ-ndekọta anyị.

34 Mana Onye-nwe matara ihe ndị nke anyị deworo, ma kwa na ọdịghị ndị ọzọ matara asụsụ anyị; ma n’ihi na ọdịghị ndị ọzọ matara asụsụ anyị, ya mere ọ kwadowo aụzọ maka nsụgharị ya.

35 Ma ihe ndị a e dere ha ka anyị wee wezuga uwe-mwụda anyị nile nʼọbara nke ụmụnne anyị ndị laworo-azụ n’ihi aekweghị ekwe.

36 Ma lee, ihe ndị a nke anyị achọworo gbasara ụmụnne anyị, e, ọbụna ịkpọghachị ha na mmata nke Kraịst, bụ dịka ekpere nile nke ndị nsọ nile ndị biworo nʼala ahụ siri dị.

37 Ma ka Onye-nwe Jisus Kraịst mee ka e wee zaa ekpere ha nile dịka okwukwe ha siri dị; ma ka Chineke Nna cheta ọgbụgba-ndụ ahụ nke o meworo ya na ụlọ nke Israel; ma ka o wee gọzie ha ruo mgbe nile, site nʼokwukwe nʼaha nke Jisus Kraịst. Amen.