Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 2


Isi 2

Mọmọn wee duo ndị-agha nke Nifaị—Ọbara na igbu-ọtụtụ-mmadụ wee zachaa ala ahụ—Ndị nke Nifaị wee kwaa akwa ma ruo uju jiri mwute nke ndị a mara ikpe—Ụbọchị amara ha agafewo—Mọmọn wee nweta epekele nile nke Nifaị—Agha nile wee gaa nʼiru. Ihe dịka afọ 327 ruo 350 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo nʼime otu afọ ahụ a malitere inwe kwa agha ọzọ nʼetiti ndị Nifaị na ndị Leman. Ma na-agbanyeghị na m bụ nwata, a dị m ukwuu nʼogologo; ya mere ndị nke Nifaị họpụtara m ka m bụrụ onye-ndu ha, ma-ọbụ onye-ndu nke ndị-agha ha.

2 Ya mere o wee ruo na nʼafọ nke iri na isii agara m nʼiru i nọ nʼisi nke otu ndị-agha nke ndị Nifaị, imegide ndị Leman; ya mere narị afọ atọ na iri abụọ na isii agafewọrịị.

3 Ma o wee ruo na nʼafọ nke narị atọ na iri abụọ na asaa ndị Leman jiri nnukwu ike karịrị akarị bịakwasị anyị, nke mere na ha yiri ndị-agha m egwu; ya mere ha achọghị ịlụ ọgụ, ma ha malitere ịlaghachi-azụ chee iru na mba ndị dị nʼelu-elu.

4 Ma o wee ruo na anyị bịara nʼobodo-ukwu nke Angola, ma anyị weere onwunwe nke obodo-ukwu ahụ, ma mee nkwadobe nile ichekwa onwe-anyị megide ndị Leman. Ma o wee ruo na anyị jiri ike anyị wusie obodo-ukwu ahụ ike; mana na-agbanyeghị mwusike anyị nile ndị Leman ahụ bịakwasịrị anyị ma chụpụ anyị site nʼobodo-ukwu ahụ.

5 Ma ha chụpụkwara anyị site nʼala nke Devid ahụ.

6 Ma anyị zọghachiri ije ma bịa nʼala nke Joshua, nke dịịrị nʼoke-ala nile ọdịda-anyanwụ nʼakụkụ ikpere-mmiri ahụ.

7 Ma o wee ruo na anyị kpọbakọtara ndị nke anyị ọsọ-ọsọ dịka o kwere omume, ka anyị wee kpọkọta ha ọnụ nʼotu ìgwè.

8 Mana lee, ala ahụ jupụtara na ndị-ori na ndị Leman; ma na-agbanyeghị nnukwu mbibi ahụ nke koro nʼofe isi ndị m, ha echegharịghị site nʼajọọ-omume ha nile; ya mere e nwere ọbara na nnukwu igbu-mmadụ a gbasara gazuo iru nke ala ahụ nile, ma nʼakụkụ nke ndị Nifaị ma kwa nʼakụkụ nke ndị Leman; ma ọ bụụrụ otu ọgba aghara gazuo akụkụ iru nile nke ala ahụ.

9 Ma ugbua, ndị Leman nwere eze, ma aha ya bụụrụ Erọn; ma ọ kpọọrọ ndị-agha nke puku iri anọ na anọ bịa imegide anyị. Ma lee, ma akpọọrọ m puku iri anọ na abụọ guzogide ya. Ma o wee ruo na emeriri m ya mụ na ndị-agha m nke mere na ọ gbapụrụ site nʼiru m. Ma lee, ihe nile a e mere ya, ma narị afọ atọ na iri atọ agafewo.

10 Ma o wee ruo na ndị Nifaị malitere ichegharị site nʼajọọ-omume ha, ma malite iti mkpu ọbụna dịka Samuel onye-amụma sịworo buo ya nʼamụma; n’ihi na lee ọdịghị onye nwere ike idebe ihe ahụ bụ nke ya, maka ndị-ori, na ndị mpụnarị ihe, na ndị ogbu-mmadụ, na nka mmegharị-anya, na amusu ahụ nke dị nʼala ahụ.

11 Otu a a malitere inwe iru uju na ịkwa akwa-arịrị nʼala ahụ nile n’ihi ihe nile ndị a, ma nke ka nke nʼetiti ndị nke Nifaị.

12 Ma o wee ruo na mgbe mụ, Mọmọn, hụrụ ịkwa akwa-arịrị ha na iru uju ha na mwute ha nʼiru Onye-nwe, mkpụrụ-obi m malitere in̄ụrị-ọn̄ụ nʼime m, ebe m matara obi ebere nile na ogologo-ntachi-obi nile nke Onye-nwe, ya mere a na-eche na ọ ga-emere ha ebere ka ha wee bụrụ kwa ndị ezi-omume ọzọ.

13 Mana lee an̄ụrị m nke a bụ nʼefu, n’ihi na amwute ha abụghị ruo na nchegharị, n’ihi ịdị-mma nke Chineke; kama ọ bụụrụ inwe mwute nke bndị a mara ikpe, n’ihi na Onye-nwe anaghị ekwe ha oge nile inweta can̄ụrị nʼime mmehie.

14 Ma ha ejighi aobi etiwara etiwa na mụọ nke nchegharị bịakwute Jisus, mana ha bkọchara Chineke, ma chọọ ịnwụ. Otu o sila dị ha ga-eji mma-agha gbaa lịka lịka maka ndụ ha nile.

15 Ma o wee ruo na mwute m laghachịkwutara m ọzọ, ma ahụrụ m na aụbọchị nke bamara ha sooro ha cgafee, ma na arụ ma na mụọ; n’ihi na ahụrụ m ọtụtụ-puku nʼime ha e gbudara na nnupụ-isi pụtara ìhè megide Chineke ha, ma kpokọlite ha dịka nsị-anụ nʼelu iru nke ala ahụ. Ma otu a narị afọ atọ na iri anọ na anọ agafeworịị.

16 Ma o wee ruo na nʼafọ nke narị atọ na iri anọ na ise ndị Nifaị malitere ịgbapụ site nʼiru ndị Leman; ma a chụrụ ha ọsọ ruo mgbe ha bịaruru ọbụna nʼala nke Jashọn, tutu o wee kwe omume ịkwusị ha na nlaghachị-azụ ha.

17 Ma ugbua, obodo-ukwu nke Jashọn dịịrị nso anʼala ebe Amarọn debeworo akụkọ-ndekọta nile nye Onye-nwe, ka e wee ghara ibibi ha. Ma lee agawo m dịka okwu nile nke Amarọn siri dị, ma e werewo m epekele nile nke Nifaị, ma dee akụkọ-ndekọta dịka okwu nile nke Amarọn siri dị.

18 Ma nʼelu epekele nile nke Nifaị e dere m nkọwasị juru-eju maka ajọọ-omume na ihe arụ nile; mana nʼelu aepekele ndị a, enwere m ndidi ide nkọwasị juru-eju maka ajọọ-omume ha na ihe arụ nile, n’ihi na lee, ọnọdụ esepụghị-aka nke ajọọ-omume na ihe arụ nile na adị nʼiru nke anya m abụọ site nʼoge m tozuworo ihu ụzọ nile nke mmadụ.

19 Ma ahụhụ dịrị m n’ihi ajọọ-omume ha; n’ihi na mkpụrụ-obi m ejupụtawọrịị na mwute n’ihi ajọọ-omume ha, ụbọchị m nile; otu o sila dị, a matara m na a aga-ebulite m elu nʼụbọchị ikpe-azụ.

20 Ma o wee ruo na nʼafọ nke a, ndị nke Nifaị ka a chụkwara-nta ha ọzọ ma chụpụ ha. Ma o wee ruo na a chụgharịrị anyị ruo mgbe anyị bịaworo nʼelu-elu ruo nʼala nke a kpọrọ Shem.

21 Ma o wee ruo na anyị wusiri obodo-ukwu nke Shem ike, ma anyị kpọbatara ndị anyị dịka o kwere omume, na eleghị-anya anyị nwere ike ịzọpụta ha site na mbibi.

22 Ma o wee ruo na nʼafọ nke narị atọ na iri anọ na isii ha malitere ịbịakwasị kwa anyị ọzọ.

23 Ma o wee ruo na a gwara m ndị m okwu, ma jiri nnukwu idi ike gbaa ha ume, nke ga-eme na ha ga eguzo nʼatụghị egwu nʼiru ndị Leman ma alụọ ọgụ maka ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụlọ ha nile, na ebe obibi ha nile.

24 Ma okwu m nile kpọtere ha nʼụdị igosị atụghị-egwu, nke mere na ha agbapụghị site nʼiru ndị Leman, ma jiri atụghị-egwu guzogide ha.

25 Ma o wee ruo na anyị lụrụ ọgụ jiri ndị-agha dị puku iri atọ i megide ndị-agha nke puku iri ise. Ma o wee ruo na anyị guzoro nʼiru ha jiri ụdị ịkwụsị ike nke mere na ha gbafuru site nʼiru anyị.

26 Ma o wee ruo na mgbe ha gbapụworo, anyị kpọọrọ ndị-agha anyị chụọ ha ọsọ, ma zute kwa ha ọzọ, ma merie ha; otu o sila dị ume nke Onye-nwe adịnyereghị anyị; e, a hapụrụ anyị nʼonwe anyị, nke mere na Mụọ nke Onye-nwe adịnyereghị anyị; ya mere anyị abụrụwo ndị na-adịghị ike dịka ụmụnne anyị.

27 Ma obi m nwere mwute n’ihi nnukwu oke ọdachị nke ndị m, n’ihi ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile. Mana lee, anyị gara nʼiru megide ndị Leman na ndị-ori nke Gadiantọn, ruo mgbe anyị nwetaghachikwara ala nile ndị nke nketa anyị ọzọ.

28 Ma afọ nke narị atọ na iri anọ na iteghete agafewọrịị. Nʼafọ nke narị atọ na iri ise anyị mere nkwekọrịta anyị na ndị Leman ma ndị-ori nile nke Gadiantọn, nʼime nke anyị kewasịrị ala nile nke nketa anyị.

29 Ma ndị Leman nyere anyị ala nke dị nʼelu-elu e, ọbụna ruo anʼọnụ-ụzọ dị mkpafa nke dubara nʼala dị nʼala-ala. Ma anyị nyere ndị Leman ala nile ahụ dị na ndịda-ndịda.