Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 1


Akwụkwọ nke Mọmọn

Isi 1

Amarọn wee kụziere Mọmọn gbasara akụkọ-ndekọta nsọ ndị ahụ—agha wee malite nʼetiti ndị Nifaị na ndị Leman—Ndị Nifaị Atọ ahụ a kpọpụrụ ha—Ajọọ-omume, ekweghị-ekwe, mgba-asị, na amụsu wee were ọnọdụ. Ihe dịka afọ 321 ruo 326 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, aMọmọn na-eme bakụkọ-ndekọta nke ihe ndị nke m hụworo ma nụ, ma kpọọ ya Akwụkwọ nke Mọmọn.

2 Ma ihe dịka nʼoge ahụ nke aAmarọn zolitere akụkọ-ndekọta nile ahụ nye Onye-nwe, ọ bịakwutere m, (mụ ebe m gbara ihe dịka afọ iri, ma a malitere m inwe bmmụta nʼihe ụfọdụ nʼịgbaso ụdị ọmụmụ nke ndị m) ma Amarọn sịrị m: Ahụrụ m na ị bụ nwa anya-udo, ma na-achọpụta ihe ọsọ-ọsọ.

3 Ya mere, mgbe ị gbara ihe dịka iri afọ abụọ na anọ ọ ga-adị m mma ka ị cheta ihe nile nke ị chọpụtaworo gbasara ndị a; ma mgbe ị gbara afo ole ahụ gaa nʼala Antum, garuo otu ugwu-nta nke a ga-akpọ aShịm; ma nʼebe ahụ ka m debeere nye Onye-nwe nkanye nsọ nile gbasara ndị a.

4 Ma lee, ị ga-ewere aepekele nile nke Nifaị nʼonwe gị; ma nke fọdụrụ ka ị ga-ahapụ nʼebe ahụ ha dị; ma ị ga-akanye nʼelu epekele nke Nifaị ihe nile nke ị chọpụtaworo gbasara ndị a.

5 Ma mụ, Mọmọn, ebe m bụ agbụrụ nke aNifaị, (ma aha nna m bụụrụ Mọmọn) echetara m ihe ndị nke Amarọn nyere m nʼiwu.

6 Ma o wee ruo na mụ, ebe m dị afọ iri na otu, nna m kpọrọ m baa nʼala dị na ndịda-ndịda, ọbụna ruo nʼala nke Zarahemla.

7 Iru nke ala ahụ nile e jiriwo ụlọ-ụlọ kpuchie ya, ma ndị ahụ dị imerime ọfọdụrụ ntakịrị, ka ha dị ka aja nke oke osimiri ahụ.

8 Ma o wee ruo nʼafọ nke a, a malitere inwe agha nʼetiti ndị Nifaị, ndị nke ihe mejupụtara ha bụ ndị Nifaị na ndị Jekọb na ndị Josef na ndị Zorọm; ma agha nke a dịịrị nʼetiti ndị Nifaị, na ndị Leman na ndị Lemuel na ndị Ịshmel.

9 Ugbua ndị Leman na ndị Lemuel na ndị Ịshmel a kpọrọ ha ndị Leman, ma otu abụọ ahụ bụụrụ ndị Nifaị na ndị Leman.

10 Ma o wee ruo na agha malitere ịdị nʼetiti ha nʼoke-ala nile nke Zarahemla, nʼakụkụ mmiri nile nke Saịdọn.

11 Ma o wee ruo na ndị Nifaị akpọkọtawo nnukwu ọnụ-ọgụgụ nke ndị mmadụ ọnụ, ọbụna ịkarị ọnụ-ọgụgụ nke iri puku atọ. Ma o wee ruo na ha nwere nʼime otu afọ nke a ọtụtụ agha, nʼime nke ndị Nifaị meriri ndị Leman ma gbuo ọtụtụ ha.

12 Ma o wee ruo na ndị Leman weghachịrị atụmatụ ha azụ, ma e nwere udo e kwekọrịtara nʼala ahụ; ma udo dịịrị nʼoghere nke ihe dịka afọ anọ, nke mere na-enweghị ịkwafu ọbara.

13 Mana ajọọ-omume weere ọnọdụ nʼelu iru nke ala ahụ nile, nke mere na Onye-nwe kpọpụrụ andị na-eso-ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya, ma ọrụ nke ọrụ-ebube nile na nke ọgwụgwọ-ọrịa kwụsịrị n’ihi ajọọ-omume nke ndị ahụ.

14 Ma enweghị aonyinye ndị sitere nʼaka Onye-nwe, ma bMụọ Nsọ abịakwasịghị onye ọbụla n’ihi ajọọ-omume ha na cekweghị-ekwe ha.

15 Ma mụ, ebe m gbara afọ iri na ise na ebe m nwetụrụ anya-udo, ya mere Onye-nwe letara m, ma e detụrụ m ọnụ ma mata maka ịdị mma nke Jisus.

16 Ma a gbara m mbọ ikwusara ndị a ozi-ọma, mana e kpuchịrị ọnụ m, ma a jụrụ na m ga-ekwusara ha ozi-ọma; n’ihi na lee ha kpachaara-anya anupu-isi megide Chineke ha; ma ndị na-eso-ụzọ ahụ a hụrụ nʼanya a bkpọpụrụ ha site nʼala ahụ, n’ihi ajọọ-omume ha.

17 Ma a nọgidere m nʼetiti ha, mana e gbochiri na m ga-ekwusara ha ozi-ọma, n’ihi obi ike ha nile; ma n’ihi obi ike ha nile a abụrụ ala ahụ ọnụ nʼihi ha.

18 Ma ndị-ori Gadiantọn a, ndị nọ nʼetiti ndị Leman, jupụtara ala ahụ, nke mere na ndị nile bi nʼime ya malitere izolite aakụ ha nile nʼime ala; ma ha malitere ịmị amị, n’ihi na Onye-nwe abụwo ala ahụ ọnụ, nke mere na ha enweghị kwa ike ijide ha, ma-ọbụ dota kwa ha ọzọ.

19 Ma o wee ruo na e nwere mgba-asị nile, na amụsu nile, na mmegharị-anya nke ike ekwensu nile; na ike nke ajọọ-onye ahụ ka e webatara nʼelu ala ahụ nile, ọbụna ruo na mmejupụta nke okwu nile nke Abịnadaị, na kwa Samuel onye nke Leman.