Akwụkwọ nsọ
Abraham 3


Isi 3

Abraham a mụta banyere anyanwụ, ọnwa, na kpakpando nile site na Urim na Tumim—Onye-nwe ekpugheere ya ụdị ebighi-ebi nke mụọ nile—Ọ mụtara maka ndụ tutu a bịa n’ụwa, ebu-ụzọ chie echichi, Okike, nhọrọ nke Onye-mgbapụta, na ọnọdụ ndụ nke ugboro abụọ nke mmadụ.

1 Na mụ, Abraham, jidere aUrim na Tumim, nke Onye-nwe Chineke m nyeworo m, na Ua nke ndị Kaldea;

2 Na m wee hụ akpakpando nile, na ha dị karị ukwuu, na n’otu n’ime ha dịkarịsịrị nso n’oche-eze nke Chineke; na e nwere ọtụtụ ndị dị ukwuu ndị dị ya nso;

3 Na Onye-nwe wee sị m: Ndị a bụ ndị na-achị achị; na aha nke ahụ dị ukwuu bụ aKolab, n’ihi na ọ dị nso nye m, maka na abụ m Onye-nwe Chineke gị: E debewo m nke a ka ọ na-achị ndị ahụ nile bụ ndị bụ nke otu usoro ahụ dịka nke ahụ gị onwe gị na-eguzo n’elu ya.

4 Na Onye-nwe wee sị m, site na Urim na Tumim ahụ, na Kolab dịịrị na ịgbaso usoro nke Onye-nwe, dịka oge ya nile na mgbe nile n’ime ịgba okirikiri dị n’ime ya; otu ịgba okirikiri ahụ bụụrụ otu aụbọchị nye Onye-nwe, na-igbaso usoro ya nke ịgụ-oge, ebe ọ na abụ otu puku bafọ dịka oge ahụ nke e nyere nke ahụ nke gị onwe gị na-eguzo n’elu ya. Nke a bụ ịgụ-oge nke Onye-nwe dịka otu ịgụ-oge nke Kolab siri dị.

5 Na Onye-nwe wee sị m: Urukpu ahụ nke bụ ìhè ahụ dị nta karịa, dị nta karịa nke ahụ nke ga na-achị ehihie, ọbụna abalị, dị elu ma-ọbụ dị ukwuu karịa nke ahụ nke gị onwe gị na-eguzo n’elu ya gbasara ịgụ oge, n’ihi na ọ na-aga n’usoro nwayọ karịa; nke a bụ n’usoro n’ihi na ọ na-eguzo n’elu ofe ụwa nke gị onwe gị na-eguzo n’elu ya, ya mere, ịgụ-oge nke ya adịghị ọtụtụ dịka otu ọnụ-ọgụgụ nke ụbọchị ya nile, na nke ọnwa nile, na nke afọ nile.

6 Na Onye-nwe wee sị m: Ugbua, Abraham, ezi-okwu aabụọ ndị a dị adị, lee anya gị nile na-ahụ ya, e nyewo gị ya ịmata oge nile nke nhazi, na oge a kara aka, e, oge akara aka nke ụwa nke gị onwe gị na-eguzo n’elu ya, na oge a kara aka nke ìhè ahụ nke kacha nke e debere ịchị ehihie, na oge akara aka nke ìhè nke ka ịdị nta nke e debere ịchị abalị.

7 Ugbua oge ahụ a kara aka nke ìhè ahụ nke ka ịdị nta bụ oge dị ogologo karịa dịka ọ gbasara ịgụ-oge ya karịa ịgụ oge ahụ nke ụwa nke Ị na-eguzo n’elu ya.

8 Na n’ebe ezi-okwu abụọ ndịa dị, a ga-enwe ezi-okwu ọzọ n’elu ha, nke ahụ bụ, a ga-enwe urukpu ọzọ nke ịgụ oge nke ya ga-adị kwarị ogologo karịa;

9 Na otu a ka a ga-enwe ịgụ oge nke otu urukpu n’elu nke ọzọ, ruo mgbe Ị ga-abịa nso rute Kolab, Kolab nke bụ n’ịgbaso ịgụ-oge nke Onye-nwe; Kolab nke e debere nso nye oche-eze nke Chineke, ịchị urukpu ndị ahụ nile ndị bụ nke otu ausoro ahụ dịka nke ahụ ị na-eguzo n’elu ya.

10 Na e nyewo gị ya ịmara maka oge a kara aka nke kpakpando nile ndị e debeworo inye ìhè, ruo mgbe ị na-abịaru oche-eze Chineke nso.

11 Otu a ka mụ, Abraham, akwurịtara okwu mụ na Onye-nwe, iru na iru, dịka otu onye na onye ọzọ na-ekwurịta; na o wee gwa m banyere ọrụ nile nke aka ya nile meworo;

12 Na o wee sị m: Nwa m nwoke, nwa m nwoke (na aka ya ka a gbatipụtara), lee aga m egosi gị ihe ndịa nile. Na o wee tụkwasị aka ya n’elu anya m nile, na m wee hụ ihe ndị ahụ nile nke aka ya nile meworo, nke dịịrị ọtụtụ, na ha mụbara n’iru anya m nile, na e nwereghi m ike ịhụ nsọtụ ha.

13 Na o wee sị m: Nke a bụ Shinehah, nke bụ anyanwụ. Na o wee sị m: Kokab, nke bụ kpakpando. Na o wee sị m: Olea, nke bụ ọnwa ahụ. Na o wee sị m: Kokaubeam, nke na-egosị kpakpando nile, ma-ọbụ nnukwu ìhè nile ahụ, nke dịịrị n’ime mbara ahụ nke elu-igwe.

14 Na o wee bụrụ n’ime oge abali-mgbe Onye-nwe kwuru okwu ndịa nile nye m: M ga-eme ka ị abaa ụba, na bmkpụrụ gị nke na-esochi gị, dịka ndị a; na ọbụrụ na i nwere-ike ịgụta cọnụ-ọgụgụ nke aja nile otu ahụ ka ọnụ-ọgụgụ nke mkpụrụ gị ga-adị.

15 Na Onye-nwe wee sị m: Abraham, ana m egosi unu ihe ndịa nile tutu unu abanye n’ime Ijipt, ka i wee maa ọkwa okwu nile ndịa.

16 Ọbụrụ na ihe abụọ dị, ma e nwere otu nke dị elu karịa nke ọzọ, a ga-enwe ihe nile ndị ka ịdị ukwuu dị elu karịa ha; ya mere aKolab bụ nke kachasị n’ime Kokaubeam nile nke ị hụworo, n’ihi na ọ dịkarịsịrị nso nye m.

17 Ugbua, ọbụrụ na e nwere ihe abụọ, otu dị elu karịa nke ọzọ, na ọnwa dị elu karịa ụwa, mgbe ahụ o nwere ike bụrụ na otu urukpu ma-ọbụ kpakpando nwere ike ịdị elu karịa ya; na o nweghị ihe Onye-nwe Chineke gị ga-ewere n’obi ya ime mana ọ ga-aemerịrị ya.

18 Ka o sila dị na o mere kpakpando nke ka ịdị ukwuu; otu a kwa, ọbụrụ na-enwere mụọ abụọ, na otu ga-enwe akọn’uche karịa nke ọzọ, mana mụọ abụọ ndịa, na-agbanyeghị na otu ga-enwe akọn’uche karịa nke ọzọ, ha enweghị mmalite; ha dịworị adị, ha agaghị enwe ọgwụgwụ, ha ga-adigide ma emesịa, n’ihi na ha bụ anolam, ma-ọbụ ebighi-ebi.

19 Na Onye-nwe wee sị m: Ezi-okwu abụọ ndị a dị-adị, na-enwere mụọ abụọ, otu na-enwe akọn’uche karịa nke ọzọ, a ga-enwe nke ọzọ ga-enwe akọn’uche karịa ha; abụ m Onye-nwe Chineke gị, enwere m akọn’uche akarịa ha nile.

20 Onye-nwe Chineke gị zigara mụọ-ozi ya ka ọ anapụta gị site n’aka nile nke onye nchụ-aja nke Elkena.

21 E bi m n’etiti ha nile; Ugbua ya mere, agbadawo m bịakwute gị ikwupụta nye gị aọrụ nile nke aka m nile meworo, nke n’ime ya bamamihe m karịsịrị ha nile, n’ihi na ana m achị n’elu-igwe nile dị n’elu, na n’ala dị n’okpuru, n’ime amamihe nile na mkpachapụ-anya, n’elu akọn’uche nile ahụ anya gị nile hụworo site na mmalite; a gbadatara m na mmalite n’etiti akọ n’uche nile ahụ nke ị hụworo.

22 Ugbụ a Onye-nwe egosịwo m, Abraham, aakọn’uche ahụ nile a haziworo btutu ụwa adịrị; na n’etiti ndị a e nwere ọtụtụ n’ime cndị a maara nke ọma na ndị dị ukwuu;

23 Na Chineke hụrụ mkpụrụ-obi ndị a na ha dị mma, na o wee guzoro n’etiti ha, na o wee sị: Ndị a ka m ga-eme ndị-ọchịchị nke m; n’ihi na o guzooro n’etiti ndị ahụ bụụrụ mụọ nile, na o wee hụ na ha dịịrị mma; na o wee sị m: Abraham, gị onwe gị bụ otu n’ime ha; a ahọrọworị gị tutu a mụọ gị.

24 Na aotu onye wee guzo n’etiti ha ebe ahụ nke dịịrị na oyiyi nke Chineke, na o wee sị ndị ahụ nọnyeere ya: Anyị ga-agbada, n’ihi na e nwere oghere ebe ahụ, na anyị ga-ewere site n’ihe nile ndịa, na banyị ga-eme otu cụwa n’elu ebe ndị a nwere ike ibi;

25 Na anyị aga-anwale ha jiri nke a, ịhụ ma ha bga-eme ihe nile bụ ihe ọbụla Onye-nwe Chineke ha ga-enye ha n’iwu;

26 Na ha ndị nke debeworo ohere ndụ anke mbụ ha ka a ga-atụkwasịrị n’elu ha; na ha ndị nke na-edebeghị ohere ndụ nke mbụ ha a gaghị enwe otuto n’ime otu ala-eze ha na ndị ahụ bụ ndị debeworo ohere ndụ nke mbu ha; na ndị ahụ bụ ndị na-edebe ohere ndụ bnke abụọ ga-enwe cotuto a ga-atụkwasịrị ha n’elu isi ha nile ruo mgbe nile na mgbe nile.

27 Na aOnye-nwe wee sị: Onye ka m ga-eziga? Na otu onye wee zaa dịka bỌkpara nke Mmadụ: Ebea ka m nọ, ziga m. Na conye-ọzọ wee zaa na si: Ebea ka m nọ, ziga m. Na Onye-nwe wee sị: Aga m eziga onye nke mbụ.

28 Na onye anke abụọ were iwe, na o debeghị ohere ndụ nke mbụ ya; na, n’ụbọchị ahụ, bọtụtụ wee sochie ya.