Akwụkwọ nsọ
Ihe esere ese na-ụdị ha dịbu nke 1


Otu ihe e Sere-ese n’Ụdị Izizi ha Dịbu Sitere n’Akwụkwọ nke Abraham

Nke 1

Foto, oyiyi
Ihe esere ese na-ụdị ha dịbu nke 1

Nkọwa

Ụdị nke 1. Mụọ-ozi nke Onye-nwe

Ụdị nke 2. E kedoro Abraham n’elu otu ebe ịchụ-aja.

Ụdị nke 3. Onye nchụ-aja ife-arụsị nke Elkena na-agba mbọ ịchụlite Abraham dịka ihe ịchụ-aja.

Ụdị nke 4. Ebe ịchụ-aja ahụ maka ndị nchụ-aja ife-arụsị iji chụọ-aja na-eguzo n’iru chi nile nke Elkena, Libna, Mamakra, Korash na Fero.

Ụdị nke 5. Chi arụsị nke Elkena.

Ụdị nke 6. Chi arụsị nke Libna.

Ụdị nke 7. Chi arụsị nke Mamakra.

Ụdị nke 8. Chi arụsị nke Korash.

Ụdị nke 9. Chi arụsị nke Fero.

Ụdị nke 10. Abraham n’ime Ijipt.

Ụdị nke 11. E sere ya ka ọ nọchite anya ogidi nile nke elu-igwe, dịka ndị Ijipt ghọtara ya.

Ụdị nke 12. Rakeyang, nke pụtara mbara, ma-ọbụ mbara nke elu-igwe ofe isi anyị nile; mana n’okwu nke a, n’ihe metụtara isi-ọkwu a, ebum n’obi ndị Ijipt bụ ka o riba-ama Shama, ịdị elu, ma-ọbụ elu-igwe nile, nke ya na okwu Hibru Shamayem hatara n’ịbụ otu ihe.