Akwụkwọ nsọ
Ndepụta nke Okwukwe 1


Ndepụta nke Okwukwe
Nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ a

History of the Church (Akụkọ nke Nzukọ-nsọ), Vol. 4, pp. 535–541

Isi 1

1 Anyị akwere na bChineke, Nna mgbe Ebighi-ebi, na cn’Ọkpara Ya, Jisus Kraịst, na dMụọ Nsọ.

2 Anyị kwere na-aga-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ihi mmehie anke aka ha, na ọbụghị n’ihi bnjehie Adam.

3 Anyị kwere na site na aAja Mgbaghara mmehie nke Kraịst, mmadụ nile ga-enweta bnzọpụta, site na cnrube isi nye diwu nile na eemume-nsọ nile nke Ozi-ọma.

4 Anyị kwere na ụkpụrụ mbụ nile na aemume-nsọ nile nke Ozi-ọma bụ: nke mbụ, bOkwukwe n’ime Onye-nwe Jisus Kraịst; nke abụọ, cNchegharị; nke atọ, dBaptism site na-imikpu n’ime mmiri maka ensachapụ nke mmehie nile; nke anọ, Ibikwasị faka nile n’isi maka gonyinye nke Mụọ Nsọ.

5 Anyị kwere na a aga-akpọrịrị nwoke site na Chineke, site bn’ibu amụma, na site na-ibikwasị caka nile n’isi site na ndị ahụ bụ ndị nọ n’iji dikike, eikwusa Ozi-ọma na ilekọta n’ime femume-nsọ nile dị ya.

6 Anyị kwere n’otu anhazi ahụ nke dịbuuru n’ime Nzukọ-nsọ mgbe ochie, ịkpọ ha aha, bndị-ozi, cndị amụma, dndị ụkọ chukwu, ndị nkụzi, endị nkwusa ozi-ọma, na ndị ọzọ gaa.

7 Anyị kwere an’onyinye nke basụsụ dị iche iche, cibu-amụma, dmkpughe, eọ́hụ̀ nile, fịgwọ nrịrịa, gịsụgharị asụsụ, na ndị ọzọ gaa.

8 Anyị kwere na aBible bụ bokwu nke Chineke ọbụrụ raa na atụgharịrị asụsụ ya cnke ọma; anyị kwekwara dAkwụkwọ nke Mọmọn ịbụ okwu nke Chineke.

9 Anyị kwere ihe nile nke Chineke akpugheworo, ihe nile Ọ na ekpughe ugbua, anyị kwekwara na Ọ gaje bikpughe ọtụtụ oke ihe na ihe nile dị mkpa gbasara Ala-eze nke Chineke.

10 Anyị kwere na amkpokọta nke Israel na mweghachi nke Agbụrụ bIri ahụ; na a ga-ewu cZaịon (Jerusalem Ọhụrụ ahụ) n’elu ala kọntinenti nke Amerika; na Kraịst gaje dịchị-eze n’onwe ya n’elu ụwa; na, ụwa ka a ega-agbanwe ọhụrụ na nweta kwa febube gparadaịs ya.

11 Anyị chọrọ ka a mata na aohere ahụ bụ nke anyị nke ife Chineke Pụrụ Ime Ihe nile ofufe dịka bọchịchọ nke cmụọ anyị siri dị, hapụkwara mmadụ nile otu ohere ahụ, ka ha dfee ofufe otu, ebe, ma-ọbụ ihe ha chọrọ.

12 Anyị kwere na-ịnọ n’okpuru ndị-eze, ndị-isi nduzi, ndị ọchịchị, ndị ikpe, n’irubere, inye ugwu, na ịkwado aiwu.

13 Anyị kwere an’ịkwụ wa aka ọtọ, ezi okwu, bịdị ọcha mmekọrịta, na-enye onyinye, ezigbo omume, na cimere mmadụ dum ihe ọma; n’ezie, anyị nwere ike ịsị na anyị na-eso dịdọ aka na ntị nke Pọl—Anyị kwere ihe nile, anyị nwere eolile-anya ihe nile, anyị ediwo ọtụtụ ihe, nwekwara olile-anya inwe ike fidi ihe nile. Ọ bụrụ na onwere ihe ọbụla gbụ ezigbo omume, kwesịrị ịhụnanya, ma-ọbụ e kwuru nke ọma ma-ọbụ kwesịrị ọjịja mma, anyị na-achụso ihe ndị a nile.

Joseph Smith.