Akwụkwọ nsọ
Abraham 2


Isi 2

Abraham wee hapụ Ua ịga Kenean—Jehova apụtakwute ya na Heran—Ngọzi nile nke ozi-ọma ka ekwere mkpụrụ ya nkwa na site na mkpụrụ ya nye mmadụ nile— O wee garuo Kenean na gawazie ruo Ijipt.

1 Ugbua Onye-nwe Chineke mere ka ụnwụ ahụ dịrị nnukwu n’ala nke Ua, nke mere na aHeran nwanne m nwoke, nwụrụ; mana bTira, nna m, ka bi n’ala nke Ua, nke ndị Kaldea.

2 Na o wee ruo na mụ, Abraham, wee kpọrọ aSerai ịbụ nwunye m, na bNehọ, nwanne m nwoke, wee kpọrọ Mịlka ịbụ nwunye ya, onye bụụrụ nwa nwanyị nke Heran.

3 Ugbua Onye-nwe aasịwo m: Abraham, site n’ala gị pụọ, na site na ndị ikwu gị, na site n’ụlọ nna gị, garuo n’ala nke m ga-egosi gị.

4 Ya mere m wee hapụ ala nke aUa, nke ndị Kaldea, ị ga n’ala nke Kenean; na m wee kpọrọ Lọt, nwa nwanne m nwoke, na nwunye ya, na Seraị nwunye m; nakwa bnna m sochiri m azụ, gaa n’ala ahụ nke anyị kpọrọ Heran.

5 Na ụnwụ ahụ wee dajụọ; na nna m wee nọdụ na Heran na biri ebe ahụ, n’ihi na-enwere ọtụtụ igwe ewu na atụrụ na Heran; na nna m tụgharịkwara ọzọ aife arụsị ya, ya mere ọ gara n’iru ibiri na Heran.

6 Mana mụ, Abraham, na aLọt, nwa nwanne m nwoke, wee kpee ekpere nye Ọnye-nwe, na Onye-nwe wee bpụtakwute m, na wee sị m: Bilie, na kpọrọ Lọt tinyere onwe gị; n’ihi na ezubewo m ịkpọrọ gị pụọ site na Heran, na ime gị onye-ozizi iburu caha m na dala dị iche nke m ga-enye mkpụrụ gị nke ga-esochi gị maka inwere ya ruo mgbe nile na-adigide, mgbe ha na-an̄a ntị nye olu-okwu m.

7 N’ihi n’abụ m Onye-nwe Chineke gị; elu-igwe bụ ebe obibi m; ụwa bụ aihe mgbakwasị ụkwụ m; ana m agbatipụ aka m n’ofe oke osimiri, na ọ na-erubere olu-okwu m isi; a na m eme ka ikuku na ọkụ bụrụ bụgbọ-ala nke m; a na m asị ugwu ukwu-si n’ebe a pụọ—na lee, a na e wepụ ha site n’ifufe gburu-gburu, n’otu ntabi anya, na-mberede.

8 Aha m bụ aJehova, na a bmaara m ọgwụgwụ site na mmalite, ya mere aka m ga-ekpuchite gị.

9 Na aga m eme mba dị ukwuu site na gị, na a ga m aagọzi gị karịa ihe atụ, na mee aha gị ka ọ dị ukwuu n’etiti mba nile, Ị ga-abụ kwa ngọzi nye mkpụrụ gị ga-esochi gị, n’ihi n’aka ha nile ka ha ga-eburu ije-ozị nke a na bỌkwa Nchụ-aja nye mba nile;

10 Na aga m agọzi ha site n’aha gị; n’ihi na ka ha ra bụ ndị na-anata aOzi-ọma nke a ka a ga-akpọ aha na-ịgbaso aha nke gị, a ga-akọwa ha dịka bmkpụrụ gị, ha ga-ebili elu na gọzie gị dịka cnna ha;

11 M aga-agọzi kwa ndị na-agọzi gị, ndị na-abụ gị ọnụ ka m ga-abụ kwa ọnụ; na n’ime gị (nke bụ, n’ime Ọkwa Nchụ-aja gị) na n’ime bmkpụrụ gị (nke bụ, Ọkwa Nchụ-aja gị), n’ihi enyewo m gị nkwa na cihe ruru ya nke a ga-anogide n’ime gị, na n’ime mkpụrụ gị (nke bụ ịsị, mkpụrụ ya, ma-ọbụ mkpụrụ nke arụ ya) ka ezi na ụlọ nile nke ụwa ga-esi nwee ngọzi, ọbụna jiri ngọzi nile nke Ozi-ọma, nke bụ ngọzi nile nke nzọpụta, ọbụna nke ndụ ebighi-ebi.

12 Ugbua, mgbe Onye-nwe wezugaworo onwe ya site n’ịgwa m okwu, na wezugawo iru ya site na m, m wee kwuo n’ime obi m: Nwa odibo gị a achọsiwo gị ike; ugbụ a achọtawo m gị;

13 Gị onwe gị zitaworo mụọ-ozi gị aịnapụta m site na chi nile nke Elkena, na aga m eme nke ọma ịn̄a ntị́ nye olu okwu gị, ya mere mee ka nwa odibo gị bilie na gawa n’udo.

14 Si otu a mụ, Abraham, wee gaa dịka Onye-nwe gwaworo m, na Lọt tinyere m; na mụ, Abraham, dịịrị airi afọ isii na abụọ mgbe m siri na Heran pụọ.

15 Na mụ kpọọworo aSeraị, onye nke m lụrụ ịbụ nwunye m mgbe m nọọrọ na bUa, na Kaldea, na Lọt, nwa nwoke nke nwanne m nwoke, na ihe onwunwe nile nke anyị chịkọtaworo, na mkpụrụ-obi nile ndị anyị cgbanweworo na Heran, na wee bịa n’ụzọ ịga ala nke dKenean, na wee bie n’ụlọ-ikwuu nile mgbe anyị bịaworo n’ụzọ anyị;

16 Ya mere, ebighi-ebi bụụrụ mkpuchite anyị na aoke nkume anyị na nzọpụta anyị, dịka anyị na-azọ njem anyị site na Heran n’ụzọ nke Jeshọn, ịbịaru n’ala nke Kenean.

17 Ugbua mụ, Abraham, wee wuo otu aebe ịchụ-aja n’ala nke Jeshọn, na nye Onye-nwe onyinye, na kpee ekpere ka e nwee ike tụgharịa bụnwụ ahụ site n’ụlọ nke nna m, ka ha wee ghara ịla n’iyi.

18 Na mgbe ahụ anyị wee gafee site na Jeshọn site n’ime ala ahụ ruo n’ebe nke Sekem; ọ dịịrị na mbara ala nile nke Mọre, na anyị abịaworị n’ime oke-ala nile nke ala andị Kenean, m wee chụọ kwa baja ebe ahụ n’ime mbara ala nile nke Mọre, na wee kpọkuo Onye-nwe jiri obi nile, n’ihi na anyị abataworị n’ala ahụ nke mba nke a na-efe arụsị.

19 Na Onye-nwe pụtakwutere m n’ọzịza nke ekpere m nile, na wee sị m: Mkpụrụ gị ka m ga-enye aala nke a.

20 Na mụ, Abraham, wee bilie site n’ebe ịchụ-aja ahụ nke m rụworo nye Onye-nwe, na site ebe ahụ kwapụ gaa n’elu ugwu ukwu na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke aBetel, na tunye ụlọ-ikwuu m ebe ahụ, Betel n’ọdịda anyanwụ, na bHaị n’ọwụwa anyanwụ; na n’ebe ahụ ka m wuru ebe ịchụ-aja ọzọ nye Onye-nwe, na ckpọkuo kwa aha nke Onye-nwe ọzọ.

21 Na mụ, Abraham, jere njem, na-aga kwa ebe ala-ala; na e nwere ịga n’iru nke ụnwụ n’ime ala ahụ; na mụ, Abraham, wee kpebie ịgbada baa n’ime Ijipt, ibi nwa mgbe nta n’ebe ahụ, n’ihi n’ụnwụ ahụ ghọrọ nnukwu nsogbu.

22 Na o wee ruo na mgbe m bịaruru nso ịbanye n’ime Ijipt, Onye-nwe wee sị m: Lee, aSeraị, nwunye gị, bụ nwanyị mara mma nke ukwu ile anya;

23 Ya mere ọ ga-eru, na mgbe ndị Ijipt ga-ahụ ya, ha ga-asị—Ọ bụ nwunye ya; na ha ga-egbu gị, mana ha ga-azọpụta ya na ndụ; ya mere hụrụ na Ị ga-eme n’ụdị a:

24 Mee ka ọ sị ndị Ijipt, ọ bụ nwanne gị nwanyị, ka ọ bụ, na mkpụrụ-obi gị ga-adị ndụ.

25 Na o wee ruo na mụ Abraham, gwara Seraị, nwunye m, ihe nile Onye-nwe gwaworo m—Ya mere sị ha, a na m arịọ gị, nwanne m nwanyị ka ị bụ, ka o wee dịrị m mma n’ihi gị, na mkpụrụ-obi m ga-adị ndụ n’ihi gị.