Akwụkwọ nsọ
Ihe esere ese na-ụdị ha dịbu nke 2


Otu Ihe e sere ese n’ụdị Izizi ha Dịbu Sitere n’Akwụkwọ nke Abraham

Nke 2

Foto, oyiyi
Ihe esere ese na-ụdị ha dịbu nke 2

Nkọwa

Ụdị nke 1. Kolab, nke na-egosi okike nke mbụ, dịkarịsịrị nso na selestịal, ma-ọbụ ebe obibi nke Chineke. Nke mbụ n’ọchịchị, nke ikpe-azụ banyere nke ịtụ oge. Ịtụ oge ahụ dịka ịtụ oge nke oge selestịal, nke oge nke selestịal na-egosipụta otu ụbọchị ịbụ otu kubit. Otu ụbọchị na Kolab hatara ka otu puku afọ dịka ịtụ ihe nke ụwa nke a siri dị, nke ndị Ijipt kpọrọ Ja-o-e.

Ụdị nke 2. Na-eguzoso Kolab, nke ndị Ijipt kpọrọ Oliblish, nke bụ nke na-eso n’isi ọchịchị okike dị nso na selestịal ahụ ma-ọbụ ebe ahụ nke Chineke bi; na-ejide ọtụghe-ụzọ nke ike, nakwa, gbasara urukpu ndị ọzọ nile; dịka e sitere n’aka Chineke kpughee nye Abraham, dịka na mgbe ọ na-achụ aja n’elu ebe ịchụ-aja, nke o wuru nye Onye-nwe.

Ụdị nke 3. Ka e mere ka ọ nọchite anya Chineke, ka ọ na-anọdụ n’elu oche-eze ya, jiri ike na ikike yiri ka uwe, jiri okpu-eze nke ìhè ebighi-ebi n’elu isi ya; na-anọchite kwa anya isi-ọkwu nile Ọtụghe-ụzọ nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ, dịka e kpughere ya nye Adam n’ime Ubi Iden, dịka kwa nye Set, Noa, Melkizedek, Abraham, na ndị nile bụ ndị e kpughewooro Ọkwa Nchụ-aja ahụ.

Ụdị nke 4. Na-abụ otu ihe nye okwu Hibru ahụ Rakeyang, nke na-egosipụta mbara, ma-ọbụ mbara nke elu-igwe nile; na-kwa otu ụdị ọnụ-ọgụgụ, na nke Ijipt na-apụta otu puku; na-abụ otu ihe nye ịtụ oge nke Oliblish, nke ya na Kolab hatara otu na-ịgba okirikiri ya na n’itụ oge ya.

Ụdị nke 5. Ka a kpọrọ n’asụsụ Ijipt Enish-go-on-dosh; nke a bụ kwa otu n’ime urukpu nile ahụ na-achị achị, ndị Ijipt na-ekwu kwa na o bụ Anyanwụ, na na-agbaziri ìhè ya site na Kolab site n’etiti nke Ki-a-vanrash, nke bụ isi Ọtụghe-ụzọ, ma-ọbụ n’asụsụ ọzọ, ike ọchịchị nke na-achị urukpu iri na ise ndị ọzọ e mere ka ha kwusie ike ma-ọbụ kpakpando nile, dịka kwa Floes ma-ọbụ Ọnwa, Ụwa na Anyanwụ na-ịgba okirikiri ha nile kwa afọ. Urukpu nke a na-anata ike ya site n’etiti nke Kle-flos-i-ses, ma-ọbụ Ha-ko-kau-beam, kpakpando nile nke ọnụ-ọgụgụ 22 na 23, na-anata ìhè site na-ịgba okirikiri nile nke Kolab.

Ụdị nke 6. Na-anọchite anya nke ụwa nke a na mpaghara anọ ya nile.

Ụdị nke 7. Nọchitere anya Chineke ka ọ na-anọdụ n’oche-eze ya, na-ekpughe site n’elu-igwe nile isi-ọkwu nile nke Ọtụghe-ụzọ nke Ọkwa Nchụ-aja; dịka, kwa, ihe iriba-ama nke Mụọ Nsọ nye Abraham, n’ụdị nke nduri.

Ụdị nke 8. Nwere edemede nile nke na-enweghị ike ikpughe nye ụwa; mana a ga-enwe ya n’ime Temple nsọ nke Chineke.

Ụdị nke 9. E kwesịghị ka e kpughee ya n’oge nke ugbụ a.

Ụdị nke 10. Na kwa ya.

Ụdị nke 11. Na kwa ya. Ma ọ bụrụ na ụwa achọpụta ọnụ-ọgụgụ ndị a, ka ọ dị otu ahụ. Amen.

Ụdị nile nke 12, 13, 14, 15, 16, 17, 18, 19, 20 na 21, ka a ga-enye mgbe oge nke dị Onye-nwe mma zuru.

Ntụgharị asụsụ nke a ka e nyere ruo ebe anyị nwere ihe ruru anyị inye n’oge nke ugbua.