Akwụkwọ nsọ
Moses 8


Isi 8

(Februarị 1831)

Metusela na-ebu amụma—Noa-na ụmụ ya ndịkom e kwusaa ozi-ọma—Oke ajọọ omume a karịa—Ndị mmadụ anabataghị oku a kpọrọ maka nchegharị—Chineke enye iwụ-ọkụ nke mbibi nke anụ arụ dum site n’ide mmiri ahụ.

1 Na ụbọchị nile nke Inọk wee bụrụ nari afọ anọ na iri afọ atọ.

2 Na o wee ruo na e wepụghị aMetusela, nwa nwoke nke Inọk, ka e wee mezuo ọgbụgba-ndụ nile ahụ nke Onye-nwe meworo nye Inọk; n’ihi n’ezie o mere ọgbụgba-ndụ nye Inọk na Noa ga-abụ mkpụrụ nke úkwù ya nile.

3 Na o wee ruo na Metusela buru amụma na site n’úkwù ya nile ka ala-eze nile nke ụwa ga-esi gbalite (site na Noa), na o wee were otuto nye onwe ya.

4 Na oke ụnwụ wee bịa n’ime ala ahụ, na Onye-nwe wee bụọ ụwa ọnụ jiri ọbụbụ-ọnụ nke oke iwe, na ọtụtụ ndị bi n’ime ya wee nwụọ.

5 Na o wee ruo na Metusela biri otu narị na iri afọ asatọ, na wee mụta Lemek;

6 Na Metusela wee bie narị asaa na iri afọ asaa na abụọ, wee mụta ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom.

7 Na ụbọchị dum nile nke Metusela wee bụrụ narị itoolu na iri afọ isii na itoolu, na o nwụọ.

8 Na Lemek wee bie otu narị na iri afọ asatọ na abụọ wee mụta otu nwa nwoke.

9 Na o wee kpọọ aha ya aNoa, na-asị: Nwa nwoke nke a ga-akasi anyị obi gbasara ọrụ anyị na mgbalị nke aka anyị nile, n’ihi ala ahụ nke Onye-nwe bbụworo-ọnụ.

10 Na Lemek wee bie mgbe ọ mụtasịrị Noa, narị afọ ise na iri itoolu na isé, wee mụta ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom.

11 Na ụbọchị nile nke Lemek wee buru nari afọ asaa na iri asaa na asaa, na o wee nwụọ.

12 Na Noa wee dịrị narị afọ anọ na iri ise wee amụta Jefet; na mgbe iri afọ anọ na abụọ gasịrị o wee mụta bShem site na nwanyị ahụ nke bụụrụ nne Jefet, na mgbe o dịịrị narị afọ ise o wee mụta cHam.

13 Na aNoa na ụmụ ya ndịkom wee bn̄aa Onye-nwe ntị, kwere kwa n’okwu ya, na e wee kpọ ha cụmụ ndịkom nke Chineke.

14 Na mgbe ndị mmadụ ndịa malitere ịmụba n’elu iru nke ụwa, na e wee mụọ ụmụ ndịnyom nye ha, aụmụ ndịkom nile nke ndị mmadụ wee hụ na ụmụ ndịnyom nile ndị ahụ mara mma, na ha wee kpọrọ ha ndị nwunye, ọbụna dịka ha họọrọ.

15 Na Onye-nwe wee sị Noa: Ụmụ ndịnyom nke ụmụ gị ndịkom e arewo onwe ha; n’ihi lee iwe m adịwo ọkụ megide ụmụ ndịkom nke ndị mmadụ n’ihi na ha an̄aghị ntị n’olu-okwu m.

16 Na o wee ruo na Noa buru amụma, wee kụzie kwa ihe nile nke Chineke, ọbụna dịka ọ dịworo na mmalite.

17 Na Onye-nwe wee sị Noa: Mụọ m agaghị aanọgide ya na mmadụ oge nile, n’ihi na ọ ga-ama na banụ arụ nile ga-anwụ anwụ; emesịa ụbọchị ya nile ga-abụ otu nari na iri afọ abụọ; na ọbụrụ na ndị madụ agaghị echegharị, aga m ezite cide mmiri nile ahụ n’elu ha.

18 Na n’ụbọchị ndị ahụ e nwere andị mmadụ-bụ enyi n’elu ụwa, na ha wee chọọ Noa ka ha wepụ ndụ ya; mana Onye-nwe nọnyeere Noa, na bike nke Onye-nwe nọkwasịrị ya.

19 Na Onye-nwe wee achie bNoa echichi na-igbaso cusoro nke ya onwe ya, na wee nye ya iwu na ọ ga-agapụ na dna-ama-ọkwa ozi-ọma ya nye ụmụ nke mmadụ, ọbụna dika e nyere ya Inọk.

20 Na o wee ruo na Noa kpọkuworo ụmụ nke ndị mmadụ na ha aga-echegharị; mana ha an̄aghị ntị n’okwu ya nile;

21 Na kwa, mgbe ha nụsiworo ihe ọ kwuworo, ha wee bịa n’iru ya na-asị: Lee anyị bụ ụmụ ndịkom nke Chineke; ọbụ n’anyị ewereghị nye onwe anyị ụmụ ndịnyom nke ndị mmadụ? Na ọbụ n’anyị anaghị aeri na an̄ụ, na na-alụ nwunye na na-enye n’alụlụ di? Na ndị nwunye anyị na-amụ ụmụ nye anyị, na otu ndị ahụ bụ ndị dị ukwuu, ndị dị dịka ndị mgbe ochie, ndị a maara nnukwu ọmụma. Na ha an̄aghị-ntị n’okwu nile nke Noa.

22 Na Chineke wee hụ na aajọọ omume nke ndị mmadụ adịwo ukwuu n’ime ụwa; na n’onye ọbụla ka afụliri-elu n’ime nchepụta echiche nile nke buche obi ya, na-abụ nanị ihe-ojoo na-esepụghị-aka.

23 Na o wee ruo na Noa gaworo n’iru an’ikwusa ozi-ọma ya nye ndị mmadụ ahụ, na-asị: N̄aa nụ ntị ma kwere okwu m nile;

24 aKwere nụ na chegharịa site na mmehie unu nile na ka e bmee unu baptism n’aha nke Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ọbụna dịka nna anyị ha, na unu ga-anata Mụọ Nsọ, ka unu wee nwee ihe nile ka e mere ka ọ cpụta ìhè; na ọbụrụ na unu emeghị nke a, ide-mmiri ahụ nile ga-abịakwasị unu; na-agbanyeghị ha an̄aghị nti.

25 Na Noa wee chegharịa, o wee gbuo ya mgbu n’obi n’Onye-nwe meworo mmadụ n’elu ụwa, na o wee wute ya n’obi.

26 Na Onye-nwe wee sị: Aga m aebibi mmadụ onye nkem keworo, site n’iru nke ụwa, ma mmadụ na anụmanụ, na ihe nile na-akpụ-akpụ, na anụ-ufe nile nke ikuku; n’ihi na Noa chegharịrị na m keworo ha, na na m meworo ha; ọ kpọkuwo kwa m; n’ihi na ha achọwo iwepụ ndụ ya.

27 Na site otua Noa wee chọta aamara n’anya nile nke Onye-nwe; n’ihi na Noa bụụrụ onye ezi-omume, bzuo kwa oke n’ọgbọ nke ya, na ya na Chineke so cna-ejegharị, dịka ụmụ ya ndịkom atọ Shem, Ham, na Jefet mekwara.

28 Ụwa arere ure n’iru Chineke, na wee jupụta n’aghara.

29 Na Chineke wee lekwasị anya n’elu ụwa, na lee, o rere-ure, n’ihi na anụ arụ nile e metọwo ụzọ nke ya n’elu ụwa.

30 Na Chineke wee sị Noa: Nsọtụ nke anụ arụ nile abịawo n’iru m, n’ihi na ụwa ejupụtawọ n’ọgba-aghara, na lee aga m aebibi anụ arụ nile site n’elu ụwa.