Akwụkwọ nsọ
Moses 6


Isi 6

(Novemba–Disemba 1830)

Mkpụrụ nke Adam e dobe akwụkwọ nke ncheta—Ụmụ-ụmụ ya ndị ezi omume ekwusaa nchegharị—Chineke ekpughee onwe ya nye Inọk—Inọk ekwusaa ozi-ọma ahụ—Atụmatụ nke nzọpụta ka e kpughere nye Adam—O wee nata baptism na ọkwa nchụ-aja.

1 Ma aAdam wee n̄aa ntị n’olu okwu nke Chineke, ma o wee kpọkuo ụmụ ya ndịkom ka ha chegharịa.

2 Ma Adam wee mara nwunye ya ọzọ, o wee mụọ nwa nwoke, ma o wee kpọọ aha ya aSet. Ma Adam wee too aha nke Chineke; n’ihi na ọ sịrị: Chineke enyewo m mkpụrụ ọzọ, ịnọchi Ebel, onye nke Ken gburu.

3 Ma Chineke kpughere onwe ya nye Set, ma o nupụghị isi, mana Ọ chụrụ aaja kwesịrị ka-anakwere, dịka nke nwa nne ya nwoke Ebel. Na nye ya ka-amụkwaara nwa nwoke, ma o wee kpọ aha ya Inọs.

4 Na mgbe ahụ ndịkom ndịa malitere aịkpọ aha nke Onye-nwe, ma Onye-nwe wee gọzie ha;

5 Ma e dobere aakwụkwọ nke ncheta, n’ime nke e dekọtara, n’asụsụ nke Adam, n’ihi na e nyewo ka ha ra bụ ndị nile na-akpoku Chineke ka ha dee site na mụọ nke bnkwalite.

6 Na site na ha ka ụmụ ha bụrụ ndị a kuziworo ịgụ na ide akwụkwọ, bụ ndị nwere asụsụ dị ọcha ma na-emerụghị emerụ.

7 Ugbua aỌkwa Nchụ-aja nke a kwa, nke dị na mmalite ga-adị kwa na ọgwụgwụ nke ụwa.

8 Ugbua amụma nke a ka Adam kwuru, dịka aMụọ Nsọ kpalitere ya, ma bakwụkwọ agbụrụ nke cụmụ Chineke ka e dobere. Na nke a bụ dakwụkwọ nke ọgbọ nile nke Adam, na-asị: N’ụbọchị ahụ nke Chineke kere mmadụ, n’oyiyi nke Chineke ka o mere ya;

9 Na aonyinyo nke arụ onwe ya; nwoke na nwanyị ka o kere bha, ma gọzie ha, ma kpọọ caha ha Adam, n’ụbọchị ahụ mgbe e kere ha, ha wee bụrụ kwa dmkpụrụ-obi nile dị ndụ n’ime elu ala ahụ nke bụ eihe mgbakwasị ụkwụ nke Chineke.

10 Ma aAdam biri otu narị afọ na iri atọ, ma mụta nwa nwoke na-oyiyi nke ya, dịka bonyinyo nke ya, ma kpọọ aha ya Set.

11 Ma ụbọchị nile nke Adam, mgbe ọ mụtasịworo Set, wee bụrụ nari afọ asatọ, ma ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom;

12 Ma ụbọchị nile nke Adam biri wee bụrụ narị afọ itoolu na iri afọ atọ, ma o wee nwụọ.

13 Set wee bie otu narị afọ na afọ ise, ma mụta Inọs, ma o wee buo amụma n’ụbọchị ya nile, o wee kuziere nwa ya Inọs n’ụzọ nile nke Chineke; ya mere Inọs wee buo kwa amụma.

14 Ma Set wee bie, mgbe ọ mụtasịworo Inos, narị afọ asatọ na asaa, ma wee mụta ọtụtụ ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom.

15 Ma ụmụ nke mmadụ wee dị ọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ n’elu iru nile nke ala. Ma n’ụbọchị ndị ahụ nile Setan nwere oke aike ọchịchị n’etiti ndị mmadụ, ma na-akpalite iwe ọkụ n’ime obi ha nile; na site na mgbe ahụ gawa agha nile na ịkwafu ọbara wee bịa; na iwelite aka nke mmadụ imegide nwa nne ya nwoke, na-inye ya n’ọnwụ, n’ihi ọrụ nile nke bnzuzo, na-achọ maka ike.

16 Ụbọchị nile nke Set wee bụrụ narị afọ itoolu na iri na abụọ, ma o wee nwụọ.

17 Ma Inọs wee bie iri afọ itoolu, ma mụta aKenan. Ma Inọs na ụmụ Chineke ndị ọzọ fọdụrụ wee si na ala ahụ nke a na-akpo Shụlọn pụọ wee biri n’ala nke e kwere na nkwa, nke ọ kpọrọ aha ya dịka aha nwa ya nwoke si dị, onye nke ọ kpọworo Kenan.

18 Ma Inọs wee bie, mgbe ọ mụtasịworo Kenan, narị afọ asatọ na iri na ise, ma wee mụta ọtụtụ ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom nile. Ma ụbọchị nile nke Inọs wee buru narị afọ itoolu na ise, ma o wee nwụọ.

19 Ma Kenan wee bie iri afọ asaa, ma wee mụta Mahalalel; ma Kenan wee bie, mgbe ọ mụtasịworo Mahalalel narị afọ asatọ na iri afọ anọ, wee mụtakwa ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom nile. Ma ụbọchị nile nke Kenan wee bụrụ narị afọ itoolu na iri, ma o wee nwụọ.

20 Na Mahalalel wee bie ndụ iri afọ isii na ise, na wee mụta Jared; ma Mahalalel wee bie narị afọ asatọ na iri afo-atọ mgbe ọ mụtasịworo Jared, ma mụta ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom. Afọ nile kwa nke Mahalalel wee bụrụ narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise, o wee nwụọ kwa.

21 Ma Jared wee bie otu narị afọ na iri afọ isii na abụọ, ma wee mụta aInọk; Jared wee bie kwa narị afọ asatọ mgbe ọ mụtasịworo Inọk, mụta kwa ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom. Ma Jared wee kuziere Inọk n’ụzọ nile nke Chineke.

22 Na nke a bụ akwụkwọ akụkọ agbụrụ nke ụmụ ndịkom nke Adam, onye nke bụkwaara anwa nwoke nke Chineke, onye nke ya na Chineke n’onwe ya kparịtara ụka.

23 Ma ha bụkwaara andị na-ekwusa ozi-ọma nke ezi-omume, na wee kwuo-okwu bbuo kwa amụma, ma kpọkue mmadụ nile, ebe nile, ka ha cchegharịa, ma dokwukwe kwa ka a kụziri nye ụmụ nke mmadụ.

24 Ma o wee ruo n’ụbọchị nile nke Jared dịịrị narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ, ma o wee nwụọ.

25 Inọk wee bie iri afọ isii na ise, ma wee mụta aMetusela.

26 Ma o wee ruo na Inọk jegharịrị ije n’ala ahụ n’etiti ndị mmadụ ahụ; ma mgbe ọ na-ejegharị, Mụọ nke Chineke wee si n’elu-igwe rịdata, ma wee binyere ya.

27 Ma o wee nụ olu-okwu si n’elu-igwe, na-asị: Inọk nwa m nwoke, buo amụma nye ndị a, ma sị ha—Chegharịa nụ, n’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru: Ana m aeweso ndị mmadụ a iwe, na iwe m adịwo kwa ọkụ imegide ha; n’ihi na obị ha nile e siwo ike, na bntị ha nile akpọchiwo na-ịnụ ihe, anya ha nile capụghị kwa ịhụ ụzọ ruo ebe dị anya;

28 Ma banyere ọtụtụ ọgbọ nile ndị a, siterị na mgbe ụbọchị ahụ m keworo ha, ka ha akpafusiworo, ma ha agọnarịwo m, ha achọwokwa ndụmọdụ nile nke ha n’ime ọchịchịrị; ma n’ime ihe-arụ ha nile ka ha chepụtaworo igbu mmadụ, ha anaghị edobekwa iwu nsọ nile, nke m nyeworo nna ha, Adam.

29 Ya mere, ha an̄ụworị iyi nye onwe ha, na site ana-in̄ụ iyi ha, ha ewetawo ọnwụ n’isi ha nile; na otu bala-mụọ ka m kwadoworo maka ha, ma ọbụrụ na ha echegharịghị.

30 Ma nke a bụ iwu-ọkụ, nke m zipụworo na mmalite nke ụwa, site n’ọnụ nke m, site na ntọ-ala nke ụwa, na site n’ọnụ nile nke ndị odibo m, nna unu ha, ka m nyeworo iwu-ọkụ ahụ, ọbụna dịka aga ezipụ ya n’ime ụwa, ruo na nsọtụ ya nile.

31 Na mgbe Inọk nụworo okwu ndị a nile, o wee hulata onwe ya n’ala, n’iru Onye-nwe, wee kwuo kwa okwu n’iru Onye-nwe na-asị: Gịnị mere na m achọtawo iru-ọma n’anya gị ma abụ m nwantakịrị, ma ndị mmadụ nile akpọwo m asị; n’ihi na ọnụ m adị arọ ikwu okwu; ya mere abụ m nwa odibo gị?

32 Ma Onye-nwe wee sị Inọk gaa n’iru mee kwa dịka m nyeworo gị n’iwu, ma ọdịghị onye ga-adupu gị arụ. Meghee aọnụ gị, ọ ga-ejupụta kwa, ma aga m enye gị ihe ị ga-ekwu, n’ihi na anụ arụ nile nọ n’aka m nile, ma a ga m eme otu dị mụ mma.

33 Kwuoro ndị mmadụ a: aHọrọ nụ taa, ife Onye-nwe Chineke ofufe onye mere unu.

34 Lee Mụọ m nọkwasịrị n’elu gị, ya mere okwu gị nile ka m ga-eme ka o zie-ezi; ma augwu ukwu nile ga-esi n’iru gị gbalaga, bosimiri nile ga-esi n’ụzọ ha chigharịa; ma gị ga-anọgide n’ime m, ma mụ onwe m n’ime gị; ya mere soro m cna-ejegharị.

35 Ma Onye-nwe wee kwuo okwu nye Inọk, sị kwa ya: Were aja gwakọta na mmiri tee n’anya gị nile, sachaa kwa ha, ị ga-ahụ kwa ụzọ. Ma o wee mee otu ahụ.

36 Ma o wee hụ amụọ ahụ nile nke Chineke keworo; ma o wee hụkwa ihe nile ndị ahụ na-anaghị ahụ anya n’anya nke bụdị okike; ma site na mgbe ahụ gaa-n’iru ka okwu ahụ bịara n’ezi n’ala ahụ: Onye cọhụ-ụzọ ka Onye-nwe kulitere nye ndị ya.

37 Ma o wee ruo na Inọk jegharịrị n’ala ahụ n’etiti ndị mmadụ ahụ, na-eguzo n’elu ugwu nile na n’ebe nile dị elu, ma na-eji olu okwu dị elu, tie mkpu, na-agba ama imegide ọrụ ha nile; ma ndị mmadụ nile ka e amejọrọ n’ihi ya.

38 Ma ha bịarukwara nso ịnụrụ okwu ya n’elu ebe nile ahụ dị elu, na-agwa ndị na-edebe ụlọ ikwuu nile, na-asị: nọdụ nụ ma na-edebe ụlọ ikwuu nile, ebe anyị ga-aga n’iru ịhụ onye ọhụ-ụzọ, n’ihi na ọ na-ebu amụma, ma ihe anyị na-amaghị a dịwọ na-ala ahụ; nwoke isi mmebi abịawo n’etiti anyị.

39 Ma o wee ruo na mgbe ha nụworo olu ya, ọ dịghị onye metụrụ ya aka n’arụ; n’ihi na egwu bịakwasịrị ha nile bụ ndị nụworo ihe o kwuru, n’ihi na ya na Chineke so na-ejegharị.

40 Ma otu nwoke wee bịakwute ya, onye nke aha ya bụụrụ Mahija, wee sị ya, “Gwa anyị n’ụzọ doro anya onye ị bụ, na n’ebe isi na-abịa?

41 Ma o wee sị ha: Esi m n’ala nke Kenan, ala nke ndị nna m ha, ala nke ezi-omume ruo n’ụbọchị nke a. Ma nna m akụziworo m n’ụzọ nile nke Chineke.

42 Na o wee ruo, na mgbe m na-ejegharị site n’ala nke Kenan, n’akụkụ osimiri ọwụwa anyanwụ, m wee hụ ọhụ; na lee, elu-igwe nile ka m hụworo, na Onye-nwe wee gwa m okwu, wee nye kwa m iwu-nsọ; ya mere, n’ihi nke a, idobe iwu-nsọ ahụ, ka m na-ekwupụta okwu ndị a nile.

43 Ma Inọk wee gaa n’iru n’okwu ya na-asị: Onye-nwe onye nke gwara m okwu, ọbụ kwa ya bụ Chineke nke elu-igwe, ọ bụ kwa ya bụ Chineke m na Chineke unu, unu bụ kwa ụmụnne m, ma gịnị mere unu ji na enye onwe unu nile andụmọdụ, na na-agọnarị Chineke nke elu-igwe?

44 Elu-igwe nile ka ya onwe ya mere, aala bụ bihe mgbakwasị ụkwụ ya; ma ntọ-ala ya bụ nke ya. Lee, ya onwe ya tọrọ ya, usuu nke ndị mmadụ ka o webataworo n’elu iru nke ya.

45 Na ọnwụ abịakwasịwọ ndị nna anyị ha; na-agbanyeghị anyị maara ha, ma anyị apụghị ịgọnarị, na ha ọbụna onye mbụ n’ime ha nile ka anyị maara, ọbụna Adam.

46 N’ihi na akwụkwọ nke ancheta ka anyị dewọrọ n’etiti anyị, na-igbaso ụdị ahụ nke mkpisi-aka nke Chineke nyeworo siri dị; ma ya ka e nyeworo n’asụsụ nke anyị.

47 Na mgbe Inọk na-ekwupụta okwu nile nke Chineke, ndị mmadụ ahụ wee maa jijiji, ha enweghị kwa ike iguzo n’iru ya.

48 Ma o wee sị ha: N’ihi na Adam adaworo, ka anyị ji wee dị; na site na ọdịda ya ka bọnwụ ji wee bịa; ma e wee mee anyị ndị ga-eketa oke nke nhuju anya na ahụhụ.

49 Lee Setan abịawo n’etiti ụmụ mmadụ, na ana-anwa ha ọnwụnwa ka ha fee ya ofufe; na ndị mmadụ aghọwo bnke anụ arụ, cnke mmetụta, na ndị na-eso ekwensu, na e dmechibidowo ha ụzọ site n’iru nke Chineke.

50 Mana Chineke emewo ka nna anyị ha mara na mmadụ nile garịrị echegharị.

51 Na o wee kpọkuo nna anyị Adam site n’olu okwu nke ya, na-asi: Abụ m Chineke; ọ bụ m mere ụwa, na ammadụ btutu ha adịrị n’anụ arụ.

52 Na o wee sịkwa ya: Ọbụrụ na ị ga-echigharịkwute m, na n̄aa ntị n’olu okwu m, kwere kwa, na chegharịa site na njehie gị nile, na amee baptism, ọbụna n’ime mmiri, n’aha nke Ọkpara M Mụrụ Nanị ya, onye nke jupụtara bn’amara na ezi-okwu, nke bụ cJisus Kraịst, daha nke ọ bụ nanị ya ka a ga-enye n’okpuru elu-igwe, nke enzọpụta ga-esi na ya bịakwute ụmụ nke mmadụ, ị ga-anata onyinye nke Mụọ Nsọ, na-arịọ ihe nile n’aha ya, na ihe ọbụla nke ị ga-arịọ a ga-enye gị ya.

53 Na nna anyị Adam wee kwuo okwu nye Onye-nwe, na sị: Gịnị mere na ndị mmadụ garịrị echegharị na mee baptism n’ime mmiri? Na Onye-nwe sịrị Adam: Lee aagbagharawo m gị njehie gị n’ime Ubi Iden.

54 Site n’ebe a ka okwu ahụ bịara n’ezi n’etiti ndị mmadụ ahụ, na aỌkpara Chineke bachụwọ aja mgbaghara mmehie n’ihi ikpe omụma nke ime mụọ nke mmalite, nke site na ya a gaghị asa ajụjụ mmehie nile nke ndị nne na nna ha n’elu isi nile nke ndị bụ cụmụ, n’ihi na ha zuru oke site na ntọ-ala nke ụwa.

55 Na Onye-nwe wee kwuo okwu nye Adam, na-asị. Ebe ọbụ na-amụrụ ụmụ gị n’ime mmehie, ọbụna otua mgbe ha malitere itolite, ammehie na-amụ n’ime obi ha nile, ha na-edetụkwa bihe ilu ahụ ire, ka ha wee mara ikwe ọnụ-ahịa ezi-ihe.

56 Na e nyewo ha i mara ezi-ihe site n’ihe ọjọọ; ya mere ha bụ andị na-anọchi anya nye onwe ha, na enyewo m gị iwu ọzọ na iwu-nsọ.

57 Ya mere kụzie ya nye ụmụ gị, na mmadụ dum, n’ebe nile, garịrị aechegharị, ma-ọbụ ha enweghị ike iketa ala-eze Chineke, n’ihi n’ọdịghị ihe ọbụla bna-adịghị-ọcha ga-ebi ebe ahụ, ma-ọbụ cbiri n’iru ya; n’ihi, n’asụsụ nke Adam, dNwoke nke Ịdị-nsọ ka aha ya bụ, na aha nke Onye ahụ ọ Mụrụ Nanị Ya bụ eỌkpara nke Mmadụ, ọbụna Jisus Kraịst, fOnye na-ekpe ikpe ezi-omume, onye ga-abịa n’etiti oge a kara aka.

58 Ya mere enye m gị iwu-nsọ, ịkụziri aụmụ gị ihe ndị a nile n’egbochịghị, na-asị;

59 Site n’ihi njehie ka ọdịda ahụ bịara, ebe ọdịda ahụ wetara ọnwụ, na ebe ọbụ na-amụbatara unu n’ime ụwa site na mmiri, na ọbara, na amụọ ahụ, nke m meworo, na si-otua ghọọ nke buzuzu mkpụrụ-obi dị ndụ, ọbụna otu a ka a garịrị camụ unu ọzọ baa n’ime ala-eze nke elu-igwe, site na dmmiri na site na Mụọ, na e were ọbara sachaa unu, ọbụna ọbara nke Onye m Mụrụ Nanị Ya; ka e wee doo unu nsọ site na mmehie nile, na wee ekporie ndụ fn’okwu nile nke ndụ ebighi-ebi n’ime ụwa nke a, na ndụ ebighi-ebi n’ime ụwa nke na-abịa, ọbụna gebube nke anwụghị-anwụ.

60 N’ihi site na ammiri ahụ ka unu na-edobe iwu-nsọ; site na Mụọ ahụ ka a gụrụ unu na bndị ezi-omume, na site cn’ọbara ahụ ka e ddoworo unu nsọ;

61 Ya mere e nyewo ya ka o biri n’ime unu; onye-aka-ebe nke elu-igwe; aOnye nkasi-obi ahụ; ihe udo nile nke ebube anwụghị-anwụ; ezi-okwu nke ihe nile; nke ahụ nke na-akwalite ihe nile, nke na-eme ka ihe nile dị ndụ; nke ahụ nke maara ihe nile, na nwekwara ike nile dịka amamihe, ebere, ezi-okwu, ikpe ziri ezi na ikpe siri dị.

62 Na ugbụ a, lee, asị m unu: Nke a bụ aatụmatụ nke nzọpụta nye mmadụ nile, site n’ọbara nke Onye m Mụrụ bNanị ya, onye ga-abịa n’etiti oge a kara-aka.

63 Na lee, ihe nile nwere oyiyi nke ha, na ihe nile ka e keworo na mee ka ha ana-agba-ama banyere m, ma ihe nile nke ụwa nke a na ihe nile nke mụọ; ihe nile nke dị n’elu n’elu-igwe, na ihe nile nke di n’elu ụwa, na ihe nile nke dị n’ime ụwa, na ihe nile nke di n’okpuru ụwa, ma n’elu na n’okpuru: ihe nile na-agba-ama banyere m.

64 Na o wee ruo, na mgbe Onye-nwe na Adam, nna anyị kwusiworo okwu, Adam wee tikuo Onye-nwe, na aMụọ nke Onye-nwe wee buru ya pụọ, na buda ya n’ime mmiri, na wee nyibe ya n’okpuru bmmiri ahụ, na wee kpọpụta ya site na mmiri ahụ.

65 Na site otu a ka e mere ya baptism, na Mụọ nke Chineke wee rịdata n’elu ya, na site otu a ka a amụrụ ya site na Mụọ ahụ na ghọọ onye a kwalitere bn’ime ime mmadụ.

66 Na o wee nụ olu-okwu sitere n’elu-igwe pụta na-asi: E mewo gị abaptism jiri ọkụ, na Mụọ Nsọ. Nke a bụ bịgba-ama nke Nna ahụ, na Ọkpara ahụ, site ugbụ a gawa n’iru ruo mgbe nile;

67 Na gị onwe gị na-adị an’usoro dịka onye ahụ na-enweghị mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ọgwụgwụ nke afọ nile, site ebighi-ebi nile ruo ebighi-ebi nile.

68 Lee, gị onwe gị bụ aotu n’ime m, nwa nwoke nke Chineke; na site otu a ka mmadụ nile wee ghọọ bụmụ ndịkom nile nke m. Amen.