Akwụkwọ nsọ
Moses 3


Isi 3

(Jun–Oktoba 1830)

Chineke kere ihe nile na mụọ tutu ha adịrị n’ụdị okike n’elu ụwa—O kere mmadụ, anụ arụ nke mbụ, n’elu ụwa—Nwanyị bụ onye inye-aka kwesịrị nwoke ahụ.

1 Otua ka esi wee amesịa elu-igwe na ala na bụsụụ ha nile.

2 Na n’ụbọchị nke asaa, mụ, Chineke, kwụsịrị ọrụ m, na ihe nile nke m mewororị; ma m wee azuo ike n’ụbọchị bnke asaa site n’ọrụ m nile, ma ihe nile nke m meworo wee gwụsịa, na mụ, Chineke, wee hụ na ha dị mma;

3 Na mụ, Chineke, wee agọzie ụbọchị nke asaa, dookwa ya nsọ; n’ihi n’ime ya ka m zuworo ike site bn’ọrụ m nke mụ, Chineke keworo na meworo.

4 Na ugbua, lee, asị m gị, na nke a bụ ọgbọ nile nke elu-igwe na nke ụwa, mgbe e kere ha, n’ụbọchị ahụ nke mụ, Onye-nwe Chineke, meworo elu-igwe na ụwa ahụ,

5 Na osisi nta ọbụla nke ọhịa atutu ya adịrị n’ụwa, na ihe ọkụkụ ọbụla nke ọhịa tutu ya e too. N’ihi na mụ, Onye-nwe Chineke, bkere ihe nile, ndị m kwuworo maka ha, na cmụọ, tutu ha adịrị n’ụdị okike ya, n’elu iru nke ụwa. N’ihi mụ, Onye-nwe Chineke, emebeghị ka mmiri zoo n’elu iru nke ụwa. Ma mụ, Onye-nwe Chineke, dekeworị ụmụ nile nke mmadụ, ma ọ dịbeghị kwa mmadụ dị ga-arụ eọrụ ubi; n’ihi n’ime felu-igwe ka m gkeworo ha; ma ọ dịbeghịkwa anụ-arụ dị n’elu ụwa, ọ dịghị kwa n’ime mmiri, ọ dịbeghị kwa n’ime ikuku;

6 Mana mụ, Onye-nwe Chineke, wee kwuo okwu, ma aigirigi siri n’ala kwụgo n’elu ma wụsa mmiri n’iru ala nile.

7 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpụọ mmadụ site an’uzuzu ala ahụ, ma kunye ume n’oghere imi ya nile ume nke ndụ; ma bmmadụ wee bụrụ cmkpụrụ-obi dị ndụ, anụ arụ nke dmbụ n’elu ụwa, nwoke mbụ kwa; na-agbanyeghị, ihe nile dị tutu e kee ha; kama na mụọ ka e keworo ha na mee ha dịka okwu m siri dị.

8 Na mụ, Onye-nwe, Chineke, wee kụọ ubi nke a gbara ogige na mpaghara ọwụwa-anyanwụ na aIden, na n’ebe ahụ ka m tinyere nwoke ahụ nke m kpụworo.

9 Na site n’ala ka mụ, Onye-nwe Chineke, mere ka osisi ọbụla pupụta n’ụdị okike ya, nke dị mma nye anya nile nke mmadụ; mmadụ wee nwekwa ike ịhụ ya. O wee bụrụkwa mkpụrụ obi dị ndụ, n’ihi na o dị na mụọ n’ụbọchị ahụ nke m keworo ya, n’ihi na ọ nọgidere n’ime ụdị ahụ nke mụ, Chineke, kere ya, e, ọbụna ihe nile nke m kwadobere maka mmadụ iji mee ihe; ma mmadụ wee hụ na ọ dị mma na-iri eri. Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kụọkwa aosisi nke ndụ n’etiti ogige ubi ahụ, nakwa bosisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.

10 Na mụ, Onye-nwe Chineke, mere ka osimiri site na Iden pụọ ị wụsa mmiri n’ubi ahụ, na site ebe ahụ e kewasịrị ya, ma o wee ghọọ aisi mmiri anọ.

11 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpọọ nke mbụ Paịshon, ma ọ na-agafe ala nile nke Havila, gburu gburu, ebe mụ, Onye-nwe Chineke, keworo ọla-edo ebe ọdị ukwuu.

12 Ma ọla-edo nke ala ahụ dị mma, ebe ahụ kwa ka bdellium na nkume onyx dị.

13 Na aha osimiri nke abụọ ka a kpọrọ Gaịhọn; nke ahụ bụ nke na-agafe ala nile nke Etiopịa gburu gburu.

14 Na aha osimiri nke atọ bu Hidekel, nke ahụ bụ nke na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Asirịa. Na osimiri nke anọ bụ Yufretis.

15 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee were mmadụ ahụ, tinye kwa ya n’ime ubi Iden ahụ a gbara ogige, ịrụ ọrụ ya na idebe ya.

16 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee nye mmadụ ahụ iwu, na-asi: Site n’osisi ọbụla nke dị n’ubi ahụ a gbara ogige ka ị ga na-eri nri.

17 Mana site n’osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila ya, na-agbanyeghị, i nwere ike aịhọrọ n’onwe gị, n’ihi na-enyere gị ya; mana, cheta na m megidere ya, n’ihi bn’ụbọchị ahụ ị ga-eri site na ya Ị cga-anwụ n’ezie.

18 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị Onye ahụ m Mụrụ aNanị Ya, na-ọdịghị mma ka mmadụ ahụ nọdụ nanị ya, ya mere, aga m emere ya bonye inye aka kwesịrị ya.

19 Ma site n’ala mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpụọ anụ ọhịa nile ọbụla, na anụ ufe nile nke ikuku, ma nye ha iwu ka ha bịakwute Adam; ka a hụ ihe ọ ga-akpọ ha; na ha bụkwa mkpụrụ obi nile dị ndụ; n’ihi na mụ, Chineke, kunyere n’ime ha ume nke ndụ, na nye iwu na ihe ọbula Adam kpọrọ ihe ekere eke ọbụla dị ndụ nke ahụ ga-abụ aha nye ya.

20 Ma Adam wee nye anụ ụlọ nile aha, na anụ ufe nke ikuku, na anụ ọhịa ọbụla; mana nye Adam, ọ dịghị onye inye-aka kwesịrị ya nke a chọtara.

21 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee mee ka ụra miri emị dakwasị Adam, na o wee rahụ ụra, na m wee were otu n’ime ọgịrịga ya nile mechiekwa anụ arụ na-ọnọdụ ya;

22 Na ọgịrịga ahụ nke mụ, Onye-nwe Chineke weworo site na mmadụ ahụ ka m ji wee mee anwanyị, ma kpọta ya nye mmadụ ahụ.

23 Na Adam wee sị: Nke a ka m mataworo ugbụ a bụ ọkpụkpụ nke ọkpụkpụ m nile, na aanụ-arụ nke anụ-arụ m; a ga-akpọ ya Nwanyị, n’ihi na-esi na nwoke ahụ wepụta ya.

24 Ya mere na nwoke ga-ahapụ nna na nne ya ma arapara n’arụ nwunye ya; ma ha ga-abụ botu anụ-arụ.

25 Na ha abụọ wee bụrụ ndị gba ọtọ, nwoke ahụ na nwunye ya, ma ihere emeghị ha.