Akwụkwọ nsọ
Moses 1


Nhọta nile sitere n’Akwụkwọ nke Moses

Ihe e wetara site na ntụgharị asụsụ nke Bible dịka e kpughere ya nye Joseph Smith Onye-amụma, Jun 1830–Februarị 1831.

Isi 1

(Jun 1830)

Chineke kpughee onwe ya nye Moses—E nwogharịa Moses—Ya na Setan ezukọta—Moses wee hụ ọtụtụ ụwa nile ndị mmadụ bi na ha—Ụwa nile na-enweghị ọnụ ogụgụ ka Ọkpara ahụ kere—Ọrụ na otuto Chineke bụ iweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ.

1 Okwu nile nke Chineke, nke O akwuru nye bMoses n’oge ahụ mgbe e welitere Moses gaa n’elu nnukwu ugwu dị oke elu,

2 Ma o wee ahụ Chineke biru na iru, ya na ya ekwukọrịta okwu, ma cebube nke Chineke nọkwasịrị Moses, ya mere Moses nwere ike dịnagide iru ya.

3 Ma Chineke gwara Moses na-asị: Lee abụ m Onye-nwe Chineke aPụrụ Ime Ihe nile, bEnweghị ọgwụgwụ bụ aha m; n’ihi na enweghị m mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ngwụcha nke afọ nile, na nke a ọbụghị enweghị ọgwụgwụ?

4 Na, lee, gị onwe gị bụ nwa m nwoke, ya mere alee anya, ma aga m egosi gị ọrụ-aka nke baka m nile, mana ọ bụghị ha nile, n’ihi na cọrụ m nile enweghị dọgwụgwụ, na otu ahụ kwa ka eokwu m nile dị, n’ihi na ha anaghị akwụsị.

5 Ya mere, ọdịghị onye ga-ahụ ọrụ m nile, ma ọbụghị ma ọ hụrụ otuto m nile; ma ọ dịghị onye ga-ahụ otuto m nile, ma emesịa ya anọgide n’anụ arụ n’elu ụwa.

6 Ma enwere m ọrụ nye gị, Moses, nwa m nwoke; ma gị onwe gị dị ana-oyiyi nke bỌkpara m Mụrụ Nanị ya; ma Ọkpara m Mụrụ Nanị ya bụ, ga-abụ kwa cOnye-nzọpụta, n’ihi na o juputara dn’amara na eezi-okwu; mana ọ fdịghị Chineke dị ma ọbụghị m, ma ihe nile na-apụta ìhè n’irum, n’ihi na gamaara m ha nile.

7 Na ugbụ a lee, otu ihe nke a ka m na-egosi gị, Moses, nwa m nwoke, n’ihi na gị onwe gị nọ n’ime ụwa, ma ugbụ a ka m na egosi gị ya.

8 Na o wee ruo na Moses lere anya, ma hụ aụwa ahụ nke ekere ya n’elu ya, ma Moses bhụrụ ụwa ahụ na ebe nsọtụ ya nile, na ụmụ nile nke mmadụ ndị dị ugbụ a na ndị ekeworo eke; gbasara ndị a ka o nwere oke cịtụ n’anya na iju-anya.

9 Na iru nke Chineke wezugara onwe ya site n’ebe Moses nọ nke mere na ebube ya anọkwasịghị Moses; ma Moses ka a hapụrụ nye onwe ya. Ma mgbe a hapụrụ ya nye onwe ya, o wee daa n’elu ala.

10 Na o wee ruo na ọ bụ na oghere oge ọtụtụ awa tutu Moses enweta kwa aịdị ike nke arụ ya ọzọ dịka mmadụ, ma o wee kwuo okwu nye onwe ya sị: Ugbụ a n’ihi nke a mere ka m mara na mmadụ benweghị ihe ọbụ, ihe nke mụ na-echebughị.

11 Mana ugbụ a anya m nile ahụwo aChineke; mana ọbụghị anya m nile nke bụdi okike, mana ọbụ anya m nile nke mụọ, n’ihi na anya m nile nke anụ arụ agaraghị enwe ike hụ, n’ihi na agaara m cakpọnwụ ma dnwụọ n’iru ya; mana ebube ya nọkwasịrị m; ma m wee hụ eiru ya n’ihi na fe nwoghara m enwogha n’iru ya.

12 Ma o wee ruo na mgbe Moses kwuworo okwu ndị a nile, lee aSetan wee bịa bna-anwa ya ọnwụnwa, na-asị: Moses nwa nke mmadụ, kpọọrọ m isi ala.

13 Na O wee ruo na Moses lekwasịrị. Setan anya ma sị: Onye ka ị bụ? N’ihi lee abụ anwa ndịkom nke Chineke, n’oyiyi nke Ọkpara ahụ a Mụrụ Nanị ya; ma olee ebe ebube gị dị nke na m ga-akpọrọ gị isi ala?

14 N’ihi lee, enweghịrị m ike ilekwasị Chineke anya, ma-ọbụghị na ebube ya ga-abịakwasị m, ma e wee anwogharịa m n’iru ya. Mana enwere m ike ilekwasị gị anya na mmadụ nke anụ arụ. Ọ bụghị otu a, n’ezie?

15 Ngọzi na-adịrị aha nke Chineke m, n’ihi na Mụọ ya e wezugachaghị onwe ya n’arụ m, ma-ọbụghị otu a o lee ebe ebube gị dị, n’ihi na ọbụ ọchịchịrị nye m? Ma aga m ekpe ikpe n’etiti gị na Chineke; n’ihi na Chineke asịwo m: aKpọọrọ Chineke Isi Ala, n’ihi nanị ya ka Ị bga-efe.

16 Si ebe a lawa, Setan; eduhiela m; n’ihi na Chineke sịrị m: Gị onwe gị dị an’oyiyi nke Onye m Mụrụ Nanị ya.

17 Ma o nyewokwa m iwu nsọ nile mgbe ọ kpọrọ m oku site an’ọhịa osisi nta ahụ na-ere ọkụ, na-asị: bKpọkuo Chineke n’aha Onye m Mụrụ Nanị ya ma sekpuoro m.

18 Na ọzọ Moses wee sị: Agaghị m akwụsị ịkpọku Chineke. Enwere m ihe ndị ọzọ m ga-achọ site n’aka ya: n’ihi na ebube ya anọkwasịwo m, ya mere enwere m ike ikpe ikpe n’etiti ya na gị. Si ebe a pụọ, Setan.

19 Na ugbụ a, mgbe Moses kwuworo okwu ndị a nile, Setan jiri oke olu tie mkpu, ma na-ekwugharị n’ụzọ dị egwu n’elu ụwa, ma nye iwu, na-asị; abụ m aOnye ahụ Amụrụ nanị ya, sekpuoro m.

20 Ma o wee ruo na Moses malitere na-atụ egwu nke ukwuu, ma dịka ọ malitere ịtụ egwu, o wee hụ ịdị-ilu nke aala mụọ. Na-agbanyeghị, bna-ikpọku Chineke, o wee nweta ume, ma o wee nye iwu na-asị: Si ebe m nọ pụọ, Setan, n’ihi na otu Chineke nke a nanị ka m ga-esekpuru, nke bụ Chineke nke ebube.

21 Na ugbụ a, aSetan wee malite ima jijiji, ala wee maakwa jijiji, ma Moses nwetara ume, wee kpọkuo kwa Chineke, na-asị: N’aha nke onye ahụ a Mụrụ Nanị ya, si ebe a pụọ, Setan.

22 Na o wee ruo na Setan jiri oke olu tie mkpu, jiri ịkwa akwa, na ịkwa arịrị, ana-ịta ikekere-eze; na o wee si ebe ahụ pụọ, ọbụna site n’iru Moses, nke na ọ hụghị kwa ya.

23 Ma ugbụ a banyere ihe nke a, Moses agbawo ama; mana n’ihi ajọọ-omume, e nweghị ya n’etiti ụmụ mmadụ.

24 Na o wee ruo na mgbe Setan pụworo site n’iru Moses, na Moses welitere anya ya nile n’elu-igwe, na-ijupụta na aMụọ Nsọ, nke na-agba ama banyere Nna na Ọkpara ahụ.

25 Ma na-ịkpọku aha nke Chineke, o wee hụ ebube ya ọzọ, n’ihi na ọ nọkwasịwo ya, ma ọ nụrụ olu okwu nke na-asị: Ngọzi na-adịrị gị Moses, n’ihi mụ Onye Pụrụ Ime Ihe nile, ahọrọwo gị, ma a ga-eme ka i dị ike karịa ọtụtụ ammiri nile, n’ihi na ha ga-erube isi nye biwu gị ka a ga-asị na ị bụụrụ cChineke.

26 Na hụrụ, anonyeere m gị, ọbụna ruo na ọgwụgwụ nke ụbọchị gị nile; n’ihi na ị aga-anapụta ndị nke m site bn’oru, ọbụna cIsrael ndị m dhọọworo.

27 Na o wee ruo, na mgbe olu-okwu ahụ ka na-ekwu okwu, Moses wee lee anya ya gburu gburu ahụkwa ụwa, e, ọbuna ụwa nile, ma ọ dịghị irighiri ya nke na-ọhụghị, ghọta ha site na mụọ nke Chineke.

28 Na o wee hụkwa ndị nile na-ebi n’ime ha, ma ọdịghị mkpụrụ obi nke na-ọhụghị; ma ọ ghọtara ha site na Mụọ nke Chineke; ma ọnụ ọgụgụ ha nile dị ukwuu, ọbụna enweghị ngụta dịka aja ahụ dị na ikpere mmiri nke oke osimiri.

29 Na o wee hụ ọtụtụ ala nile; na ala nke ọbụla ka a kpọrọ aụwa; ma e nwere ndị nile bi n’iru ha.

30 Na o wee ruo na Moses kpọkuru Chineke na-asị: Gwa m, ana m arịọ gị, ihe mere ihe ndị a ji dị otu a, ọbụkwa site na gịnị ka iji mee ha?

31 Na lee, ebube nke Onye-nwe nọkwasịrị Moses, nke mere ka Moses guzoro n’iru nke Chineke, ma ya na ya ekwukọrịta okwu airu na iru. Ma Onye-nwe Chineke sịrị Moses: N’ihi bebum n’obi nke m ka m meworo ihe ndị a nile. Nke a bụ amamihe ma ọ na-adịgide n’ime m.

32 Na site an’okwu nke ike m, ka m keworo ha, nke bụ Ọkpara M Mụrụ Nanị Ya, onye nke jupụtara bn’amara na cezi-okwu.

33 Na aụwa nile na-enweghị ọnụ ọgụgụ ka m bkeworo; ma e kewokwa m ha n’ihi ebu m n’obi nke m; na site na Ọkpara ahụ ka m keworo ha, nke bụ onye ahụ m Mụrụ cNanị Ya.

34 Na nwoke ambụ ahụ n’etiti ndị nwoke nile ka m kpọworo bAdam, nke bụ cọtụtụ.

35 Mana ọbụ nanị nkọwasị banyere ụwa nke a, na ndị nile bi n’ime ya, ka m na-enye gị. N’ihi lee ha dị ọtụtụ ụwa nile ndị na-agafewo site n’okwu nke ike m. Ma ha dị ọtụtụ na-eguzo ugbụ a, na enweghị ngụta ka ha dị nye mmadụ; mana ha nile nwere ọnụ ọgụgụ nye m, n’ihi ha bụ nke m ma aama m ha.

36 Na o wee ruo na Moses kwuru okwu nye Onye-nwe, na-asị: Mee ebere nye nwa odibo gị, O Chineke, ma gwa m banyere ụwa nke a, ma ndị nile na-ebi n’ime ya, ma elu-igwe nile kwa, ma mgbe ahụ nwa odibo gị ga-enwe afọ ojuju.

37 Ma Onye-nwe Chineke kwuru okwu nye Moses, na-asi: aElu-igwe nile, ha dị ọtụtụ, ma ha agaghị ekwe ngụta nye mmadụ; mana ha nwere ọnụ ọgụgụ nye m, n’ihi ha bụ nke m.

38 Ma dịka otu ụwa na-agafe, na elu-igwe nile ya, ọbụna otu a ka ọzọ ga-abia; ma ọdịghị aọgwụgwụ dịịrị ọrụ m nile, ma ọbụkwanụ nye okwu m nile.

39 N’ihi lee, nke a bụ aọrụ m na bebube nke m iweta na mmezu canwụgh-anwụ na ndụ debighi-ebi nke mmadụ.

40 Ma ugbụ a, Moses, nwa m nwoke, aga m ekwu okwu nye gị banyere ụwa nke a nke gị onwe gị na-eguzo n’elu ya; ma i aga-ede ihe nile nke m ga-ekwu n’akwụkwọ.

41 Na n’ụbọchị mgbe ụmụ nke mmadụ ga-ewere okwu m nile n’ihe efu ma awezuga ọtụtụ n’ime ha site na akwụkwọ ahụ nke ị ga-ede, lee aga m ekuli onye ọzọ bdịka gị; ma aga-enwekwa cha ọzọ n’etiti ụmụ mmadụ—n’etiti ọtụtụ bụ ndị ga-ekwere.

42 (Okwu nile ndị a ka e akwuru nye Moses n’elu nnukwu ugwu ahụ, aha ya bụ nke na-agaghị amara n’etiti ụmụ mmadụ. Ma ugbụ a ekwuwo ha nye gị. Egosịkwala ha nye ndị ọbụla ma-ọbụghị nanị ndị ahụ bụ ndị kwere-ekwe. Ọbụna otu a Amen.)