Akwụkwọ nsọ
Moses 7


Isi 7

(Disemba 1830)

Inọk kuziri, duzie ndị mmadụ ahụ, mee kwa ka ugwu ukwu nile megharịa arụ—E hiwere nnukwu obodo nke Zaịọn—Inọk buru-ụzọ hụ ọbịbịa Ọkpara nke Mmadụ, aja mgbaghara mmehie ọ chụrụ, na mbilite n’ọnwụ nke Ndị-nsọ—O wee buru-ụzọ hụ Mweghachi ahụ, Mkpokọta ahụ, Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ahụ, na nlọta nke Zaịọn.

1 Na o wee ruo na Inọk gara n’iru n’okwu ya na-asị: Lee nna anyị Adam kụziri ihe ndị a nile, na ọtụtụ ekwerewo ma ghọwo aụmụ ndịkom nke Chineke, ma ọtụtụ ekwenyeghị, na laworị n’iyi n’ime mmehie ha nile, na ha na-elepụ anya jiri bịtụ-egwu n’ime ịta ahụhụ n’ihi oke iwe dị ọkụ nke ọnụma nke Chineke nke a ga-awụkwasị n’elu ha.

2 Ma site n’oge ahụ gawa n’iru Inọk malitere na-ebu amụma, na-asị ndị mmadụ ahụ, na: Dịka mgbe m na-ejegharị, na wee guzo n’elu ebe Mahuja, ma bekuo Onye-nwe, ebe ahụ ka otu olu-okwu sitere n’elu-igwe pụta, na-asị—gị onwe gị tụgharịa, na gị onwe gị gaa n’elu ugwu Simiọn.

3 Na o wee ruo na m tụgharịrị, na rigoruo n’elu ugwu ahụ; na dịka m guzooro n’elu ụgwu ahụ, m wee hụ n’elu-igwe nile ghe-oghe, na e jiri aebube wee yikwasị m;

4 Na m wee hụ Onye-nwe; o wee guzokwa m n’iru, na o wee kwuoro m okwu mụ na ya, ọbụna dịka mmadụ na-ekwu okwu otu na ibe ya, airu na iru; na o wee sị m: bLee anya, na m ga-egosi gị ụwa ruo ọtụtụ ọgbọ nile.

5 Na o wee ruo na m hụrụ n’ime ndagwurugwu nke Shum, na lee oke ọnụọgụgụ ndị mmadụ ndị biiri n’ime ụlọ ikwuu nile ndị bụụrụ ndị nke Shum.

6 Na-ọzọ Onye-nwe wee sị m: Lee anya; na m wee lee anya na mpaghara elu-elu, na m wee hụ ndị mmadụ nke Kenean ndị bi n’ụlọ ikwuu nile.

7 Na Onye-nwe wee sị m: Buo amụma; m wee buokwa amụma na-asị: Lee ndị mmadụ nke Kenean, ndị ọnụ ọgụgụ ha dị ukwuu, ga-aga n’iru n’usoro agha megide ndị nke Shum, ha ga-egbu kwa ha bụ ndị a ga-ebibi kpam kpam; na ndị Kenean ga ekewasị onwe ha n’ala ahụ, ala ahụ ga-abụkwa ala àgà na nke na-agaghị amịta mkpụrụ, ọ dịghị kwa ndị ọzọ ga-ebi ebe ahụ ma ọbụghị ndị Kenean.

8 N’ihi lee, Onye-nwe ga-eji nnukwu okpomọkụ bụọ ala ahụ ọnụ na ịbụ ala ahụ nke na-agaghị amịta mkpụrụ ga-aga n’iru ruo mgbe nile, na e nwere aịdị ojii nke bịakwasịrị n’elu ụmụ nile nke Kenean, nke na-eledara ha anya n’etiti ndị mmadụ nile.

9 Na o wee ruo na Onye-nwe sịrị m: Lee anya; na m wee lee anya, na a hụrụ m ala nke Sharọn, na ala nke Inọk, na ala nke Omna, na ala nke Heni, na ala nke Shem, na ala nke Hanọ, na ala nke Hananiha na ndị nile bi n’ime ha;

10 Na Onye-nwe wee sị m: Jekwuru ndị a, ma sị ha—aChegharịa nụ, ma ọbụghị otu a aga m apụta jiri ọbụbụ-ọnụ tie ha ihe otiti, na ha wee nwụọ.

11 Na o wee nye m iwu-nsọ na m ga ana-eme baptism n’aha nke Nna, na nke Ọkpara nke jupụtara bn’amara na ezi-okwu, na cMụọ Nsọ, nke na-agba ama banyere Nna na Ọkpara ahụ.

12 Na o wee ruo na Inọk gara-n’iru na-akpọku mmadụ nile ahụ, ma-ọbụghị ndị Kenean ka ha chegharịa;

13 Na otu a ka aokwukwe nke Inọk dịịrị ukwuu na o duziri ndị nke Chineke, ma ndị iro ha bịara ịlụso ha agha; na o kwuru okwu nke Onye-nwe, na ụwa wee maa jijiji, na bugwu ukwu nile wee gbalaga, ọbụna dịka iwu ya siri dị; na cosimiri nile nke mmiri ka a tụgharịrị iru site n’ụzọ ha; na ịgbọ-ụja nke ọdụm nile ka-anụworo site n’ime ọzara; na mba nile wee tụa nnukwu egwu, otu a ka dịdị-ike jupụtara n’okwu nke Inọk, na otu a ka ọ dị ukwuu bụ ike nke asụsụ nke Chineke nyeworo ya.

14 Otu ala sikwara n’ime ogbu osimiri ukwu ahụ pụtalite, na oke ịdị ukwuu ka egwu nke ndị-iro nile nke ndị nke Chineke dịrị nke mere ha jiri gbalaga guzokwa n’ebe tere anya na na-ejegharị n’elu ala ahụ nke siri n’ime ogbu osimiri ukwu ahụ pụtalite.

15 Na andị mmadụ-bụ-enyi nke ala ahụ guzokwa n’ebe tere anya; na ịbụ-ọnụ gapụrụ n’elu mmadụ nile ndị lụsoro Chineke ọgụ;

16 Na site n’oge ahụ gaa n’iru e nwere ibu-agha nile na ịkwafu ọbara n’etiti ha; mana Onye-nwe bịara binyere ndị ya, na ha wee biri n’ezi-omume.

17 aEgwu nke Onye-nwe wee dịrị n’elu mba nile, otu a ka ọ dị ukwuu bụ ebube nke Onye-nwe, nke dịworị n’elu ndị ya. Na Onye-nwe bgọziri ala ahụ, e wee gọzie ha n’elu ugwu ukwu nile, na n’elu ebe nile dị elu na ha mere nke ọma.

18 Na Onye-nwe wee kpọọ ndị ya aZaịọn, n’ihi na ha nwere botu obị na otu uche, na biri n’ime ezi-omume; na e nweghị ogbenye n’etiti ha.

19 Na Inọk gara n’iru na-ekwusa ozi-ọma ya n’ezi-omume nye ndị nke Chineke. Na o wee ruo n’ụbọchị ya nile na o wuru otu nnukwu obodo nke a kpọrọ, Nnukwu Obodo nke Ịdị-nsọ, ọbụna Zaịọn.

20 Na o wee ruo na Inọk na Chineke kwurịtara okwu; na o wee sị Onye-nwe: N’ezie aZaịọn ga-ebi na-enweghị mmekpa-arụ ruo mgbe nile. Mana Onye-nwe wee sị Inọk: Zaịọn ka m gọziworo, mana ndị fọdụrụ na ndị mmadụ ahụ ka m bụworo ọnụ.

21 Na o wee ruo na Onye-nwe gosịrị Inọk ndị nile bi n’ime ụwa; na o wee hụ, na lee, Zaịọn, na mgbe oge na-aga, ana-eweliworo ya elu baa n’ime elu-igwe. Na Onye-nwe sịrị Inọk: Lee ebe obibi nke m ruo mgbe nile.

22 Na Inọk hụkwara ndị ahụ nke fọdụrụ n’ime ndị mmadụ ahụ nke bụụrụ ụmụ ndịkom nile nke Adam; na ha bụụrụ ngwakọta nke mkpụrụ nile nke Adam ewezuga ma o bụụrụ mkpụrụ nke Ken, n’ihi na mkpụrụ nke Ken dịịrị aoji, na o nweghị ọnọdụ n’etiti ha.

23 Na mgbe nke a gasịrị e wee welite Zaịọn baa n’ime aelu-igwe, Inọk wee bhụ, na lee, mba cnile nke ụwa nọdụrụ n’iru ya.

24 Na ọgbọ kwuru ọgbọ wee bịa; ma Inọk dịrị elu na e akuliwo kwa ya elu, ọbụna n’obi nke Nna ahụ, na nke Ọkpara nke Mmadụ ahụ; na lee, ike nke Setan nọọrọ n’elu iru nile nke ụwa.

25 Na o wee hụ ndị mụọ-ozi ka ha si n’elu-igwe na-arịdata; na o wee nụ olu-okwu dị elu na-asị: Ahụhụ, ahụhụ ga-adịrị ndị nile na-ebi n’ụwa.

26 Na o wee hụ Setan; na o ji nnukwu aụdọ-igwe n’aka ya, na o jiwo bọchịchịrị kpuchie iru nke ụwa nile; na o leliwo anya elu wee chịa kwa ọchị, na cndị mụọ-ozi ya nile wee n̄ụrịa.

27 Na Inọk wee hụ andị mụọ-ozi ka ha si n’ime elu-igwe na-arịdata, bna-agba ama banyere Nna ahụ na Ọkpara; na Mụọ Nsọ ahụ wee dakwasị ọtụtụ, na e wee welite ha elu site n’ike nile nke elu-igwe baa n’ime Zaịọn.

28 Na o wee ruo na Chineke nke elu-igwe ledatara anya n’elu ndị ahụ nke fọdụrụ na ndị mmadụ ahụ, na o wee bee akwa; Inọk agbawokwa ama maka ya, na-asị: Olee otu osi bụrụ na elu-igwe nile na-ebe akwa, na na-akwapụta anya-mmiri ha nile dịka mmiri-ozuzo n’elu ugwu ukwu nile?

29 Na Inọk wee sị Onye-nwe: Olee otu o si bụrụ na i nwere ike aibe-akwa, ebe ọbụ na gị onwe gị dị nsọ, na-esite ebighi-ebi nile ruo ebighi-ebi nile?

30 Na ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee bụ na mmadụ ga-agụta ọnụ irighiri nile nke ụwa, e, nde nile nke aụwa nile dị otu a, ọ gaaraghị abụ mmalite nke ọnụ ọgụgụ nke ihe nile i bkeworo, na akwa mgbochi gị nile ka a gbasawokwara, mana gị onwe gị nọ ebe ahụ, ma obi gị nọ ebe ahụ; na kwa gị onwe gị ziri-ezi; gị onwe gị dị obi ebere dị kwa obi-ọma ruo mgbe nile;

31 Na i werewo Zaịọn gaa n’obi nke gị onwe gị, site n’okike gị nile, site n’ebighi-ebi nile ruo n’ebighi-ebi nile; na ọ dịghị ma ọbụghị audo, bikpe ziri-ezi, na cezi-okwu ka ebe obibi nke oche-eze gị bụ; na ebere ga-agapụ n’iru nke gị na ọ gaghị enwe nsọtụ; o’lee otu o si bụrụ na i nwere ike ibe-akwa?

32 Onye-nwe wee sị Inọk: Lee ụmụ nne gị ndị a, ha bụ ọrụ-aka nke aaka m nile, na enyere ha bọmụma ihe ha, n’ụbọchị ahụ m keworo ha; na n’ime Ubi Iden ahụ, ka m nyeworo mmadụ cohere nhọrọ ya;

33 Na nye ụmụnne gị ka m sịworo, na nyewokwa iwu-nsọ, na ha aga-ahụrịta onye ọbụla n’ibe ya n’anya, na na ha kwesịrị ịhọrọ m, bụ Nna ha; mana lee, ha bụ ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ha na-akpọkwa ọbara nke aka ha asị;

34 Na aọkụ nke iwe-ọkụ m e nwuruwo imegide ha; na n’ime enweghị mmasị m dị ọkụ, aga m ezibata bide mmiri nile n’elu ha, n’ihi na iwe m dị-egwu adịwo ọkụ imegide ha.

35 Lee, Abụ m Chineke; aNwoke nke Ịdị-nsọ ka aha m bụ; Nwoke Onye-Ndụmọdụ ka aha m bụ; na Enweghị-ọgwụgwụ na Ebighi-ebi ka baha m bụ kwa.

36 Ya mere, enwere m ike ịgbasapụta aka nile na jigide ihe nile ekere-eke nke mụ onwe m meworo; na aanya m ga-adupu kwa ha, na n’etiti ọrụ-aka nile nke aka m onwebeghị oke bajọọ omume dịworo dịka n’etiti ụmụnne gị.

37 Mana lee, mmehie ha nile ga-adị n’elu isi nile nke ndị nna ha; Setan ga-abụ nna ha, na nhuju-anya ga-abụ mbibi ha; na elu-igwe dum ga-ebe akwa n’elu ha, ọbụna ọrụ-aka nile nke aka m nile; ya mere ọbụ n’elu-igwe nile a gaghị ebe-akwa, na-ịhụ na ndị a ga-ata ahụhụ?

38 Mana lee, ndị a anya gị nọ n’elu ha ga-agabiga n’ime ide mmiri nile ahụ; na lee aga m akpọchi ha; aụlọ mkpọrọ ka m kwadoworo n’ihi ha.

39 Na aonye-ahụ nke m họọworo a rịọwo arịrịọ n’iru m. Ya mere, ọ na-ata ahụhụ n’ihi mmehie ha nile; ọbụrụraa na ha ga-echegharị n’ụbọchị ahụ nke bOnye m họọworo ga-alọghachi kwute m, na ruo n’ụbọchị ahụ ha ga-anọ n’ime cịta ahụhụ.

40 Ya mere, n’ihi nke a ka elu-igwe nile ga-ebe akwa, e na ọrụ-aka nile nke aka m nile.

41 Na o wee ruo na Onye-nwe kwuru ọkwu nye Inọk, na gwa Inọk omume nile nke ụmụ mmadụ; Ya mere Inọk matara, na lere anya n’elu ajọọ omume ha, na nhuju-anya ha, na wee bee akwa, na gbasapụta ogwe aka ya abụọ, na aobi ya wee zaa saa mbara dịka ebighi-ebi; na afọ ya nile jupụtara n’ebere, na ebighi-ebi nile mara jijiji.

42 Na Inọk wee hụ aNoa na bezi na ụlọ ya; na ụmụ ụmụ nke ụmụ ndịkom nile nke Noa ka a ga-azọpụta jiri nzọpụta nke arụ.

43 Ya mere Inọk wee hụ na Noa ewuwo otu aụgbọ mmiri; na n’Onye-nwe egosiwo ya iru-ọma, na jidewo ya n’aka nke ya; mana n’elu ndị ahụ nke fọdụrụ n’ime ndị ajọọ mmadụ ide mmịrị nile ahụ wee bịa lomie ha.

44 Na dịka Inọk hụworo nke a, o wee nwee ịdị ilu nke mkpụrụ-obi, na o wee bee akwa n’ihi ụmụnne ya, wee sịkwa elu-igwe nile: A agaghị m ekwe ka a kasie m obi; mana Onye-nwe wee sị Inọk: Welite obi gị elu, n̄ụrịa kwa; na lee anya.

45 Na o wee ruo na Inọk lere anya; wee hụ site na Noa, ezi na ụlọ nile nke ụwa; na o wee bekuo Onye-nwe, na-asị: Olee mgbe ụbọchị nke Onye-nwe ga-abịa? Olee mgbe a ga-akwafu ọbara nke onye ezi-omume ahụ, ka e wee adoo ha nile bụ ndị na-eru uju nsọ na ha nwee ndụ ebighi-ebi?

46 Na Onye-nwe wee sị: Ọ ga-abụ an’etiti oge a kara-aka, n’ụbọchị nile nke ajọọ omume na ịbọ-obo.

47 Na lee, Inọk wee hụ ụbọchị ahụ nke ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ, obụna na anụ arụ; na mkpụrụ-obi ya wee n̄ụrịa, na-asị: E kuliwo ndị ezi-omume elu, na aNwa-atụrụ ahụ ka e gbuworo site na ntọ-ala nke ụwa; na site n’okwukwe, anọ m n’obi nke Nna, na lee, bZaịọn nonyekwaara m.

48 Na o wee ruo na Inọk leworo anya n’elu aụwa; wee nụ olu-okwu sitere n’ime afọ ya nile na-asị: Ahụhụ, ahụhụ na-adịrị m, nne nke ndị mmadụ, enwewo m mgbụ, ike agwụwo m n’ihi ajọọ-omume nke ụmụ m. O lee mgbe m bga-ezu ike ma nwee nsacha site cn’iru-inyi nke siworo n’ime m pụọ? O lee mgbe Onye-okike m ga-edo m nsọ, ka m wee zuo ike, na ezi-omume wee biri n’elu iru m oge nta.

49 Na mgbe Inọk nụworo iru-uju nke ụwa, o wee bee akwa, ma bekuo Onye-nwe na-asị: O Onye-nwe, ọbụ na ị gaghị enwe ọmiko n’arụ ụwa? Ọbụ na ị gaghị agọzi ụmụ nke Noa?

50 Na o wee ruo na Inọk gara n’iru na mbeku ya nye Onye-nwe, na-asi: Ana m arịọ O Onye-nwe n’aha nke Onye Ị Mụrụ Nanị Ya, ọbụna Jisus Kraịst, ka i wee nwee obi-ebere n’arụ Noa na mkpụrụ ya, ka a ghara kwa iji ide mmiri kpuchie ụwa ọzọ.

51 Ma Onye-nwe enweghị ike ịjụ arịrịọ ya; o wee mee ọgbụgba-ndụ ya na Inọk, o wee n̄ụọ iyi nye ya jiri in̄ụ iyi na ya ga-akwụsị aide mmiri nile ahụ, na ya ga-eme ka ụmụ Noa mara nke a;

52 Na o wee zipụ iwu-ọkụ nke na-enweghị mgbanwe, na andị fọdụrụ na mkpụrụ ya kwesịrị ka a chọta ha oge nile n’etiti mba nile, dịka ụwa ga-eguzo;

53 Na Onye-nwe wee sị: Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke Mesaịa ga-esi na mkpụrụ ya wee bịa; n’ihi na o kwuwo—Mụ onwe m bụ aMesaịa, bEze nke Zaịọn, cNkume nke Elu-igwe, nke sara mbara dịka ebighi-ebi; onye ahụ nke na-esi n’ọnụ-ụzọ-ama ahụ na dna-arịgota site na m a gaghị ada; ya mere, ngozi na-adịrị ha bụ ndị ahụ nke m kwuwororị maka ha, n’ihi na ha ga-apụta jiri eabụ nile nke ọn̄ụ nke na-adịgide.

54 Na o wee ruo na Inọk bekuru Onye-nwe na-asị: Mgbe Ọkpara nke Mmadụ ga-abịa n’anụ arụ, ụwa ọ ga-enwe izu-ike? Ana m arịọ gị gosi m ihe ndịa nile.

55 Na Onye-nwe wee sị Inọk: Lee anya, na o wee lee anya, ma hụ aỌkpara nke Mmadụ ka e buliri ya n’elu bobe, dịka omume nke ndị mmadụ siri dị;

56 Na o wee nụ otu olu-okwu dị ukwuu; na elu-igwe nile ka e kpuchiri; na ihe e kere eke nile nke Chineke wee ruo-uju; na ụwa wee asụa-ude; na nkume nile wee gbawaa, na ndị-nsọ nile wee bbilie, na e wee ckpube ha okpu-eze dn’aka-nrị nke Ọkpara nke Mmadụ jiri okpu-eze nke ebube.

57 Na ka ha ra bụ amụọ ahụ nile nọ bn’ụlọ mkpọrọ wee pụta na wee guzo n’aka-nri nke Chineke; na ndị fọdụrụ ka e dobere n’ụdọ-igwe nile nke ọchịchịrị ruo n’ikpe nke nnukwu ụbọchị ahụ.

58 Na ọzọ Inọk wee bee akwa ma bekuo Onye-nwe na-asị: Olee mgbe ụwa ga-ezu-ike?

59 Na Inọk wee hụ Ọkpara nke Mmadụ ahụ ka ọ na-arịgo n’elu iga-kwuru Nna ahụ; na o wee kpọkuo Onye-nwe na-asị: Ọ bụ na ị gaghị abịa ọzọ n’elu ụwa? N’ihi dịka na ị bụ Chineke, na amaara m gị, na ị n̄ụwo iyi nye m, na nyewo m iwu na m ga-arịọ arịrịọ n’aha onye ahụ nke Ị Mụrụ Nanị Ya; gị onwe gị e mewo m, i nyewo kwa oche-eze gị ịbụ ihe ruuru m, ọ bụghị dịka ihe kwesịịrị m, mana site n’amara nke gị onwe gị, ya mere, ana m ajụ gị ọbụ na ị gaghị abịa ọzọ n’elu ụwa?

60 Na Onye-nwe wee sị Inọk: Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ọbụna otu ahụ ka m ga-abịa n’ụbọchị ndị aikpe-azụ, n’ụbọchị nile nke ajọọ-omume na ịbọ-obo, imezu iyi ahụ nke m n̄ụworo nye gị banyere ụmụ nke Noa.

61 Na n’ụbọchị ahụ ga-abia nke ụwa aga-ezu ike, mana tutu ụbọchị ahụ elu-igwe nile bga-adị ojii, na cakwa mgbochi nke ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa, na elu-igwe nile ga-ama jijiji, na kwa ụwa; na oke mkpagbu ga-adị n’etiti ụmụ nke mmadụ, mana ndị nke m ka m dga-echekwa.

62 Na aezi-omume ka m ga-ezidata site n’ime elu-igwe; na bezi-okwu ka m ga-ezipụ gaa site n’ime cụwa, dịgba ama banyere Onye nke m Mụrụ Nanị ya; embilite n’ọnwụ ya site na ndị nwụrụ-anwụ; e, na kwa mbilite n’ọnwụ nke mmadụ nile; na ezi-omume na ezi-okwu ka m ga-eme ka ha zachaa ụwa dịka e ji ide mmiri, fikpokọta ndị nke m a họpụtara site n’akụkụ anọ nile nke ụwa, gaa n’ebe ahụ nke m ga-akwadobe, otu nnukwu Obodo dị Nsọ, ka ndị m wee kee ihe-okike n’úkwù ha nile, na na-elepụ anya maka oge nke m ga-abịa; n’ihi n’ebe ahụ ka ụlọ ofufe m ga-adị, a ga-akpọ kwa ya Zaịọn, Jerusalem gỌhụrụ.

63 Na Onye-nwe wee sị Inọk: Mgbe ahụ ka gị onwe gị na annukwu obodo gị dum ga-ezute ha ebe ahụ, anyị ga-anabata kwa ha n’obi anyị; ha ga-ahụ kwa anyị, na anyị ga-adakwasị n’olu ha nile, ha ga-adakwasị kwa n’olu anyị nile, na anyị ga-esutu ọnụ onye ọbụla na ibe ya;

64 Na n’ebe ahụ ka ebe obibi m ga-adị, na ọ ga-abụ Zaịọn, nke ga-abịa site n’ime ihe nile e kere-eke nke m meworo, na maka n’oghere nke otu apuku afọ ka ụwa bga-ezu-ike.

65 Na o wee ruo na Inọk hụrụ ụbọchị ahụ nke aọbịbịa Ọkpara nke Mmadụ, n’ụbọchị nile ikpe-azụ, ibi n’elu-ụwa n’ezi-omume maka oghere nke otu puku áfọ̀ ahụ;

66 Mana tutu ụbọchị ahụ o wee hụ oke mkpagbu nile n’etiti ndị ajọọ mmadụ, na o wee hụ kwa oke osimiri, na-esogburu ya, na o wee hụ obi nile nke ndị mmadụ na-aagharị pụ ha, ka ha na-elepụ anya n’egwu n’ihi bikpe nile nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile, nke ga-abịakwasị ndị ajọọ mmadụ.

67 Na Onye-nwe wee gosi Inọk ihe nile, ọbụna ruo n’ọgwụgwụ nke ụwa, na o wee hụ ụbọchị nke ndị ezi omume, oge awa ahụ nke mgbapụta ha, na nweta uju nke aọn̄ụ;

68 Na ụbọchị nile nke aZaịọn n’ime ụbọchị nile nke Inọk wee bụrụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.

69 Na Inọk na ndị ya sooro Chineke ajegharịa, na o bi kwaara n’etiti Zaịọn; na o wee ruo na Zaịọn adịghị kwa, n’ihi na Chineke anatawo ya n’elu baa n’obi nke ya onwe ya; na site mgbe ahụ ka okwu ahụ̀ jiri pụọ gawa na-asị Zaịọn Agbafuwo.