Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ime ka a mata


Nhọta nile Sitere na Ntụgharị Asụsụ nke Bible nke Joseph Smith Mere

Ndịa na-eso bụ mpaghara nile a họọrọ ahọ nke Ntụgharị-asụsụ Joseph Smith mere site na Ntụgharị-asụsụ Eze James nke Bible (NAJS). Onye-nwe kwalitere mụọ Onye-amụma Joseph Smith iweghachi ezi-okwu nile nye ihe nile e dere na Bible na-aghọwo ihe furu efu ma-ọbụ a gbanwere ke mgbe e dere okwu izizi nile na ha. Ezi-okwu nile ndị a e weghachiri mere ka ozizi doo anya mezitụkwa nghọta nke akwụkwọ-nsọ. Ihe ọgụgụ nile a họọrọ maka Nduzi ahụ ga-enye aka imezitụ nghọta gị banyere akwụkwọ-nsọ nile na-eleghị anya na asụsụ nke a na-atụgharị ha.

N’ihi na Onye-nwe kpugheere Joseph Smith ụfọdụ ezi-okwu nke ndị izizi dere ha dekọtaworo na mbụ, Ntụgharị-asụsụ nke Joseph Smith a dịghị dịka ntụgharị-asụsụ ọbụla ọzọ nke Bible n’ime ụwa. N’uche nke a, okwu ahụ ntụgharị-asụsụ ka e jiri mee ihe n’ụzọ sara mbara dịkwa iche karịa ka o na-adi oge nile, n’ihi na ntụgharị asụsụ Joseph Smith bụ mkpughe karịa ntụgharị-asụsụ nke onwe ya site n’otu asụsụ baa na nke ọzọ. Maka imata karịa banyere NAJS, hụ Ntụgharị-asụsụ Joseph Smith (NAJS) dị na ndepụta a, bi, dii, nke isi okwu nile dị n’ime Nduzi ahụ.

Nkọwa site na-ịma-atụ ndị a na-eso na-egosi otu ihe ịma-atụ a họọrọ site na NAJS.

Foto, oyiyi
Ihe-ngosi

NAJS, Matiu 4:1, 5-6, 8-9 (tụlee ihe dị iche na Matiu 4:1, 5-6, 8-9; mgbanwe nile dị otua ka e mere na Luk 4:2, 5–11)

(Mụọ ahụ duuru Jisus, ọbughị Setan duuru ya.)

1 Mgbe ahụ Jisus ka Mụọ ahụ duuru rigo, nime ọzara ka ya na Chineke nọrịa.

5 Mgbe ahụ Mụọ ahụ buuru Jisus baa n’ime nnukwu obodo nsọ ahụ, Mụọ ahụ wee guzokwa ya n’elu akụkụ nke temple.

6 Mgbe ahụ ekwensu wee bịakwute ya sị kwa, Ọbụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, tụda onwe gị n’ala; n’ihi na-edewo ya, Ọ ga-enye ndị mụọ-ozi ya iwu gbasara gị; ọbụ kwa n’ime aka ha nile ka ha ga-ebuli gị elu, adịghị ama ama n’oge ọbụla ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

8 Ọzọ kwa, Jisus wee nọdụ n’ime Mụọ, ma o wee kpọrọ ya gaa n’elu nnukwu ugwu dị oke elu, gosi kwa ya ala-eze nile nke ụwa na ebube ha.

9 Ekwensu wee bịakwute kwa ya ọzọ, sị kwa, Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị, ma ọbụrụ na ị ga-ada n’ala sekpuo kwa ra m.

Ntunyere nke a dị na mkpụrụ mbipụta akwụkwọ buru ibu bụ ihe ọgụgụ ahụ dị na ntụgharị-asụsụ Joseph Smith mere site na Bible nsọ nke Eze James. N’ihi na ntụgharị-asụsụ ya weghachiri okwu nile nye ihe e dere ede n’ime Bible, ọnụ ọgụgụ nke ama-okwu nwere ike ịdị iche site na mbipụta ahụ ị na eji.

Ndị nọ n’ime akara mkpuchi bụ ntụnyere dị n’ime Bible nsọ nke gị nke ị ga-atụle ihe dị iche na ntụgharị-asụsụ Joseph Smith.

Okwu a na-akọwa ozizi ahụ Joseph Smith mere ka o doo anya jiri ntụgharị-asụsụ ya.

Nke a bụ ihe e dere ede ahụ dịka Joseph Smith tụgharịrị-asụsụ ya.