Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jenesis 9


NAJS, Jenesis 9:10–15 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 9:3–9)

(A ga-ejide mmadụ inye nkọwasi n’ihi igbu mmadụ na kwa n’ihi ịla ndụ anụmanụ n’iyi.)

10 Kama, ọ bara nke anụ arụ nile nke m nyeworo unu maka ihe oriri, ka a ga-akwafu n’elu ala, nke na-ewere ndụ ha, ma ọbara ha ka unu na-agaghị eri.

11 Na ezie, a gaghị akwafu ọbara, ma-ọbụghị nanị maka ihe oriri, iji zọpụta ndụ unu nile; ọ bụ kwa n’aka unu ka m ga-achọ ọbara nke anụmanụ ọbụla.

12 Na onye ahụ nke na-akwafu ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-akwafu ọbara ya; n’ihi na mmadụ agaghị akwafu ọbara nke mmadụ.

13 N’ihi na iwu-nsọ ka m na-enye, na mmadụ ọbụla ga-echekwa ndụ nke mmadụ, n’ihi na ọ bụ na onyinyo nke m ka m mere mmadụ.

14 Iwu-nsọ ka m na-enye kwa unu, mụa nụ ọmụmụ baa kwa nụ ụba; wepụta nụ ọmụmụ n’uju n’elu ụwa, baa kwa nụ ụba n’ime ya.

15 Chineke wee gwa kwa Noa na ụmụ ya ndịkom okwu, sị, Lee, mụ onwe m kwa, a ga m ehiwe ọgbụgba-ndụ mụ na gị, nke m mere nye nna gị Inok, gbasara mkpụrụ gị nke na-eso gị n’azụ.

NAJS, Jenesis 9:21–25 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 9:16–17)

(Eke na ogwurugwu ahụ ke e dobere n’elu-igwe dịka ihe ncheta nke ọgbụgba-ndụ Chineke mere nye Inọk na Noa. N’ụbọchị ndị ikpe-azụ ọgbakọ ozuzu oha nke nzukọ nke Onye e bụ ụzọ mụọ [Zaịọn nke Onye-nwe n’oge Inọk; hụ Moses 7] ga-esonye ndị ezi-omume n’elu ụwa.)

21 Eke na ogwurugwu ahụ ga-adị kwa n’igwe ojii; m ga-elekwasị kwa ya anya, ka m wee cheta ọgbụgba-ndụ ahụ nke mgbe nile na-adịgide, nke m meworo nye nna gị Inọk; na, mgbe ndị mmadụ ga-edobe iwu-nsọ m nile, Zaịọn ga-abịakwa ọzọ n’elu ụwa, nnukwu obodo nke Inọk nke m welileworo elu nye onwe m!

22 Nke a bụ kwa ọgbụgba-ndụ m nke na-adịgide, ka mgbe ụmụ ụmụ gị ga-anata ezi-okwu ahụ, leli kwa anya n’elu, mgbe ahụ ka Zaịon ga-eledata anya n’ala, elu-igwe nile kwa ga-akwagharị n’obi ụtọ, ụwa ga-ama kwa jijiji n’ọn̄ụ;

23 Na ọgbakọ nke ozuzu ọha nke nzukọ-nsọ nke onye e bu ụzọ mụọ ga-agbadata site n’ime elu-igwe pụta, nwere kwa ụwa, ọ ga-enwe kwa ọnọdụ ruo mgbe ọgwụgwụ ahụ bịara. Nkea bụ kwa ọgbụgba-ndụ m nke mgbe nile na-adịgide, nke m meworo mụ na nna gị Inọk.

24 Na eke na ogwurugwu ahụ ga-adị n’igwe ojii; m ga-ehiwe kwa ọgbụgba-ndụ m nye gị nke m meworo n’etiti mụ na gị, n’ihi ihe nile dị ndụ nke anụ arụ ọbụla nke ga-adị n’elu ụwa.

25 Chineke we sị kwa Noa, Nke a bụ akara nke ọgbụgba-ndụ nke m hiwere n’etiti mụ na gị, n’ihi anụ arụ nile nke ga-adị n’elu ụwa.