Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jenesis 17


NAJS, Jenesis 17:3–7, 11–12 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 17:3–12)

(Chineke hiwere ọgbụgba-ndụ nke ibi-úgwù ya na Abraham. Emume-nsọ nke baptism na ịgbaru-afọ nke ụmụ-ntakịrị ji abụ ndị nwere nkọwasị ka e kpughere nye Abraham.)

3 O wee ruo kwa, na Abram dara kpube iru ya n’ala, kpọkuo kwa aha nke Onye-nwe.

4 Chineke wee kwuoro ya okwu, na-asi, Ndị m agahiewo ụzọ site n’usoro iwu m nile, ha edebeghị kwa emume-nsọ m nile; nke m nyeworo ndị nna ha;

5 Ha achọpụtaghị kwa otute mmanụ nke m na olili ma-ọbụ baptism nke m jiri nye ha iwu;

6 Kama ha atugharịwo site n’iwu-nsọ ahụ, ma werewo nye onwe ha ọsịsa nke ụmụntakịrị na ọbara nke nfesa.

7 Ha ekwuwo kwa na ọbara nke Ebel onye ezi-omume ka a kwafuru n’ihi mmehie nile; ha amatabeghị ebe ha si nwee nkọwasị n’iru m.

11 Na m ga-ehiwe ọgbụgba-ndụ nke ibi-ugwu n’ebe ị nọ, ọ ga-abụkwa ọgbụgba-ndụ m n’etiti mụ na gị, na mkpụrụ gị na-eso gị na azụ, n’ọgbọ ha nile; ka i wee mara ruo mgbe nile na ụmụntakịrị enweghị nkọwasị n’iru m ruo mgbe ha dị afọ asatọ.

12 Na ị ga-achọta idebe kwa ọgbụgba-ndụ m nile nke m jiworo gbaa ndụ mụ na ndị nna gị ha; na ị ga-edobe iwu-nsọ nile nke m jiworo ọnụ m nye gị, na m ga-abụ Chineke nye gị na mkpụrụ gị na-eso gị na azụ.

NAJS, Jenesis 17:23 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 17:17)

(Abraham nụrịrị ọn̄ụ mgbe e bu ụzọ kwupụta ọmụmụ Aịsak.)

23 Mgbe ahụ Abraham dara kpube iru ya n’ala nụrịkwaa ọn̄ụ, wee sịkwa n’ime obi ya, N’ebe ahụ ka a ga-amụ nwa nye ya onye dị otu narị afọ n’okenye, na Sera nke dị iri afọ itoolu n’okenye ga-amụ ya.