Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, 1 Samuel 16


NAJS, 1 Samuel 16:14–16, 23 (tụlee ihe dị iche na 1 Samuel 16:14–16, 23; mgbanwe dị ka nke a ka e mere na 1 Samuel 18:10 na 19:9)

(Mụọ ọjọọ ahụ nke bịa kwasịrị Sọl esiteghị n’Onye-nwe.)

14 Kama Mụọ nke Onye-nwe wezugara onwe ya site n’ebe Sọl nọ, ma otu mụọ ọjọọ nke na-esiteghị n’Onye-nwe wee sogbue ya.

15 Na ndị odibo Sọl wee sị ya, lee ugbụ a, mụọ ọjọọ nke na-esiteghị na Chineke na-esogbu gị.

16 Ka onye-nwe anyị ugbụ a nye ndị odibo gị iwu, ndị nọ n’iru gị, ka ha chọpụta otu nwoke, onye maara ịkpọ ụbọ akwara nke ọma; na ọ ga-eru, na mgbe mụọ ọjọọ ahụ, nke na-esiteghị na Chineke, bịakwasịrị gị na ọ ga-akpọ ụbọ jiri aka ya, ọ ga-adịkwa gị mma.

23 O wee ruo na mgbe mụọ ọjọọ ahụ nke na-esiteghị na Chineke nọkwasịrị Sọl, na Devid weere ụbọ-akwara, were kwa aka ya kpọọ ya; arụ wee dajụọ Sọl, o wee dị ya mma, mụọ ọjọọ ahụ wee si n’ebe ọ nọ wezuga onwe ya.