Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jenesis 48


NAJS, Jenesis 48:5–11 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 48:5–6)

(Mkpụrụ Josef ga-abụ ndị ndu n’ime mkpokọta nke Israel n’ụbọchị ndị ikpeazụ.)

5 Na ugbụ a ụmụ gị ndịkom abụọ, Ifrem na Manase, ndị a mụrụ nye gị n’ala Ijipt, tutu m bịakwute gị n’Ijipt; lee nke m ka ha bụ; Chineke nke nna m ha ga-agọzi ha; ọbụna dịka Reuben na Simeon ka a ga-agozi ha, n’ihi na ha bụ nke m; ya mere a ga-akpọ ha aha na-igbaso aha m. (Ya mere a kpọrọ ha Israel.)

6 Na ụmụ gị ndị ị mụsoworo ha, ọ bụ gị nwe ha, n’aha ụmụnne ha ka a ga-akpọ ha n’ihe nketa ha, n’ime agbụrụ nile ahụ; ya mere na a kpọrọ ha agbụrụ nile nke Manase na nke Ifrem.

7 Jekọb wee sị kwa Josef, mgbe Chineke nke nna m ha pụtakwutere m na Luz, na ala nke Kenean; ọ n̄ụrụ iyi nye m, na ya ga-enye m, na mkpụrụ m, ala ahụ maka inwere ya ruo mgbe nile na-adịgide.

8 Ya mere, o nwa m nwoke, ọ gọziwo m na ikulite gị ịbụ onye odibo nye m, na-ịzọpụta ụlọ m site n’ọnwụ;

9 Na-ịnapụta ndị m, ụmụnne gị, site n’ụnwụ nke tara akpụ n’ala ahụ; ya mere na Chineke nke ndị nna gị ha ga-agọzi gị, na mkpụrụ nke úkwù gị nile, na a ga-agọzi ha na-ịdị elu karịa ụmụnne gị, na ịdị elu karịa ụlọ nna gị;

10 N’ihi na i metawo nke ọma, na ụlọ nna gị ehulatawo ala nye gị, ọbụna dịka e gosiri gị ya, tutu e ree gị baa n’Ijipt site n’aka ụmụnne gị; ya mere na ụmụnne gị ga-ehulata ala nye gị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, nye mkpụrụ nke úkwù gị nile ruo mgbe nile.

11 N’ihi na ị ga-abụ ìhè nye ndị m, ịnapụta ha n’ụbọchị nile nke ndọkpụ n’agha ha, site n’oru; na iweta nzọpụta nye ha, mgbe ha dum na-ehulataworị ala n’okpuru mmehie.