Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 11


Jisus Kraịst gosịrị ndị nke Nifaị onwe ya, dịka igwe mmadụ ahụ gbakọtara ọnụ n’ala Uju ahụ, ma kụziere ha ozi-ọma; ma n’uzo dị otu a ka o gosịrị onwe ya nye ha.

Mejupụtara isi 11 ruo isi 26 e tinyekọtara.

Isi 11

Nna Ahụ wee gbaa ama maka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya—Kraịst wee pụta ihe ma kwupụta aja mgbaghara mmehie ya—Ndị ahụ wee metụ apa nile nke mmerụ-arụ dị n’aka ya abụọ, ụkwụ ya abụọ, na akụkụ ya—Ha wee tie Hosana—O wee dozie usoro na ụdị nke baptism—Mụọ nke ndọrọ-ndọrọ bụ nke ekwensu—Ozizi nke Kraịst bụ na ndị mmadụ ga e kwere ma e mee ha baptism ma ha anata Mụọ Nsọ. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na e nwere nnukwu igwe-mmadụ gbakọtara ọnụ, nke ndị nke Nifaị, gburu-gburu temple ahụ nke dị n’ala Uju; ma ha na-enwe ịtụ-n’anya ma na-eche otu onye na ibe ya, ma na-egosị otu onye na ibe ya annukwu na mgbanwe ịtụ-n’anya nke wereworo ọnọdụ.

2 Ma ha nọọrọ na-akpa nkata gbasara Jisus Kraịst a, maka onye e nyeworo aihe iriba-ama ahụ gbasara ọnwụ ya.

3 Ma o wee ruo na mgbe ha nọ na-akpa nkata otu a, otu onye na ibe ya, ha nụrụ aolu dịka o si n’elu-igwe pụta; ma ha lepụrụ anya ha gburu-gburu, n’ihi na ha aghọtaghị olu ahụ nke ha nụrụ; ma o bụghị olu-ike, ọbụghị ma ọ bụụrụ olu dasịrị ike; otu o sila dị, ma na-agbanyeghị na ọ bu olu bntakịrị ọ dụpuru ndị ahụ nụrụ ya n’etiti, nke mere na o nweghị okporo arụ ha nke ọ na emeghị ka o maa jijiji; e, ọ dụpuru ha ruo na mkpụrụ-obi ahụ, ma mee ka obi ha n’ere ọkụ.

4 Ma o wee ruo na ọzọ ha nụkwara olu ahụ, ma ha aghọtaghị ya.

5 Ma ọzọ nke ugboro atọ ha nụrụ olu ahụ, ma meghee ntị ha ịnụ ya; ma anya ha nile chere iru n’ebe ụda ahụ dị, ma ha legidere anya chee iru n’elu-igwe, site n’ebe ụda ahụ siri bịa.

6 Ma lee, nke ugboro atọ ha ghọtara olu ahụ nke ha nụrụ; ma ọ sịrị ha:

7 Lee aỌkpara m hụrụ n’anya, bonye m nwere ezigbo mmasị na ya, onye m nyeworo aha m otuto nʼime ya—nụrụ nụ olu ya.

8 Ma o wee ruo, ka ha ghọtara, ha lepụrụ anya ha n’elu ọzọ chee iru n’elu-igwe; ma lee, ha ahụrụ otu Nwoke na-agbadata site n’elu-igwe; ma o yi uwe mwụda ọcha; ma ọ gbadatara ma guzoro n’etiti ha; ma anya nile nke igwe mmadụ dum ahụ tụgharịrị lekwasị ya, ma ha anwaghị anwa imeghe ọnụ ha, ọbụna otu onye nye ibe ya, ma ha amataghị ihe ọ pụtara, n’ihi na ha chere na ọ bụ onye mụọ-ozi nke pụtaworo ihe nye ha.

9 Ma o wee ruo na o setịpụrụ aka ya ma gwa ndị ahụ okwu, na-asị:

10 Lee, a bụ m Jisus Kraịst, onye nke ndị-amụma nile gbara ama ga-abịa n’ime ụwa.

11 Ma lee, a bụ m aìhè na ndụ nke ụwa; ma an̄ụwo m site bn’iko ilu ahụ nke Nna nyeworo m, ma enyewo m Nna otuto cn’iwekwasị onwe m mmehie nile nke ụwa, n’ime nke m taworo ahụhụ dọchịchọ nke Nna n’ihe nile site na mmalite.

12 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu nile ndị a igwe mmadụ ahụ nile dara n’ala, n’ihi na ha chetara na e buworịị aamụma maka ya n’etiti ha na Kraịst ga-egosị onwe ya nye ha mgbe ọ rịgoroworo n’elu-igwe.

13 Ma o wee ruo na Onye-nwe gwara ha okwu na-asị:

14 Bilie ma bịarute-kwute m, ka unu wee arụnye aka unu nile n’akụkụ m, na kwa ka unu bmetụ aka n’apa nile nke ntu nile n’aka m abụọ na n’ụkwụ m abụọ, ka unu wee mata na abụ m cChineke nke Israel ahụ, na Chineke nke dụwa dum, ma e gbuwo m maka mmehie nile nke ụwa.

15 Ma o wee ruo na igwe mmadụ ahụ garuru, ma rụnye aka ha nile n’akụkụ ya, ma metụ aka n’apa nile nke ntu nile ahụ n’aka ya abụọ na n’ụkwụ ya abụọ; ma nke a ka ha mere, na-agaru n’otu n’otu ruo mgbe ha nile garuworo, ma hụ n’anya ha, ma jiri aka ha metụ, ma mata n’ezi-okwu ma gbaa ama, na a bụ ya, bụ onye nke ndị-amụma dere maka ya, na ọ ga-abịa.

16 Ma mgbe ha nile garuworo ma gbaworo onwe ha ama, ha tiri mkpu n’otu olu, na-asị:

17 Hosana! Ngọzi na-adịrị aha nke Chineke kachasị-elu! Ma ha dara n’ala n’ụkwụ nke Jisus, ma afee ya.

18 Ma o wee ruo na ọ gwara aNifaị okwu (n’ihi na Nifaị nọ n’etiti igwe-mmadụ ahụ) ma o nyere ya iwu ka ọ bịarute.

19 Ma Nifaị biliri ma garuo, ma kpọọ isi n’ala n’iru Onye-nwe ma sutu ụkwụ ya abụọ ọnụ.

20 Ma Onye-nwe nyere ya iwu ka o bilie. Ma o biliri ma guzoro n’iru ya.

21 Ma Onye-nwe sịrị ya: Enye m gị aike ka imee ndị a bbaptism mgbe m rigoroworo ọzọ n’elu-igwe.

22 Ma ọzọ Onye-nwe kpọrọ andị ọzọ, ma gwa ha otu ihe ahụ; ma o nyere ha ike ime baptism. Ma ọ sịrị ha: Otu a ka unu ga-esi mee baptism; ma agaghị enwe bịrụ ụka ọbụla n’etiti unu.

23 N’ezie asị m unu, na onye ọbụla chegharịrị na mmehie ya site an’okwu nile unu, ma bchọọ ka e mee ya baptism n’aha m, otu a ka unu ga-esi mee ha baptism—Lee, unu ga-agbada ma cguzoro n’ime mmiri ahụ, ma n’aha m ka unu ga-eme ha baptism.

24 Ma ugbua lee, ndị a bụ okwu nile nke unu ga-ekwu, na-akpọ ha aha ha, na-asị:

25 Ebe m nwere aikike e nyere m site na Jisus Kraịst, e mee m gị baptism n’aha nke bNna, na nke Ọkpara, na nke Mụọ Nsọ. Amen.

26 Ma mgbe ahụ ka unu aga-abịanye ha n’ime mmiri, ma gụpụta ha ọzọ site n’ime mmiri ahụ.

27 Ma n’ụdị a ka unu ga-eme baptism n’aha m; n’ihi na lee, n’ezie asị m unu, na Nna ahụ, na Ọkpara ahụ, na Mụọ Nsọ bụ aotu; ma a nọ m n’ime Nna, ma Nna nọ n’ime m, ma Nna ahụ na mụ bụ otu.

28 Ma dịka m siworo nye unu iwu, otu ahụ ka unu ga-esi mee baptism. Ma agaghị enwe aịrụ ụka n’etiti unu, dịka ọ na-adịrịị na mbụ; ọbụghị ma a ga-enwe ịrụ ụka n’etiti unu gbasara ihe nile nke ozizi m, dịka ọ na-adịrịị na mbụ.

29 N’ihi na n’ezie, n’ezie asị m unu, onye nke nwere mụọ nke andọrọ-ndọrọ abụghị nke m, kama ọ bụ nke bekwensu, onye bụ nna nke ndọrọ-ndọrọ, ma ọ na-akpalite obi nile nke ndị mmadụ iji iwe dọọ ndọrọ-ndọrọ, otu onye na ibe ya.

30 Lee, nke a abụghị ozizi m, iji iwe kpalite obi nile nke ndị mmadụ, otu onye megide ibe ya; mana nke a bụ ozizi m, na a ga-akwụsị ụdị ihe ndị ahụ.

31 Lee, n’ezie, n’ezie, asị m unu, aga m ekwupụtara unu aozizi m.

32 Ma nke a bụ aozizi m, ma ọ bụ ozizi ahụ nke Nna nyeworo m; ma ana m bagba-ama maka Nna, ma Nna na-agba ama maka m, ma cMụọ Nsọ na agba-ama maka Nna na mụ; ma ana m agba-ama na Nna nyere mmadụ nile iwu, n’ebe nile, ka ha chegharịa ma kwere na m.

33 Ma onye ọbụla kwere na m, ma e amee ya baptism, onye ahụ a bga-azọpụta ya; ma ha bụ ndị cga-eketa ala-eze nke Chineke.

34 Ma onye ọbụla na-ekweghị na m, ma e meghị ya baptism, a ga-ama ya ikpe.

35 N’ezie, n’ezie, asị m unu, na nke a bụ ozizi m, ma ana m agba-ama maka ya site na Nna; ma onye ọbụla akwere na mụ kwerekwara na Nna; ma ya ka Nna ga-agbara ama maka m, n’ihi na ọ bga-eji ọkụ na cMụọ Nsọ leta ya.

36 Ma otu a ka Nna ga-agba-ama maka mụ, ma Mụọ Nsọ ga-agbara ya ama maka Nna na mụ, n’ihi na Nna, na m, na Mụọ Nsọ bụ otu.

37 Ma ọzọ asị m unu, unu ga-echegharịrị, ma adị ka nwa ntakịrị, ma e mee unu baptism n’aha m, ma-ọbụ ọdịghị ụzọ unu ga-esi nwe ike ịnata ihe ndị a.

38 Ma ọzọ asị m unu, unu ga-echegharịrị, ma e mee unu baptism n’aha m, ma dị ka nwa ntakịrị, ma-ọbụ ọdịghị ụzọ unu ga-esi nwe ike iketa ala-eze nke Chineke.

39 N’ezie, n’ezie, asị m unu, na nke a bụ ozizi m, ma onye ọbụla awukwasịrị ụlọ n’elu nke a wukwasịrị n’elu nkume m, ma bọnụ-ụzọ ama nile nke ala-mụọ agaghị aka ha ike.

40 Ma onye ọbụla nke ga-ekwupụta karịa ma-ọbụ welata karịa nke a, ma hiwe ya maka ozizi m, onye ahụ si na ihe ọjọọ bịa, ma ewukwasịghị ya n’elu nkume m; mana o na-ewukwasị n’elu antọ-ala aja, ma ụzọ nile nke ala-mụọ meghere emeghe guzoro ịnabata ụdị onye ahụ mgbe ide mmiri nile ga-abịa ma ikuku nile kukwasị ha.

41 Ya mere, gaa nʼiru gakwuru ndị a, ma kwupụta okwu nile nke m kwuworo, ruo nsọtụ nile nke ụwa.