Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 4


Isi 4

Ndị-agha ndị Nifaị wee merie ndị-ori Gadiantọn—E gburu Gịdianhaị, ma onye nnọchị-anya ya, Zemnaraịha, akwugburu ya—Ndị Nifaị wee too Onye-nwe maka mmeri ha nile. Ihe dịka afọ 19 ruo 22 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo na ngwụcha nke afọ nke iri na asatọ ndị-agha nile nke ndị-ori ahụ ejikerewo maka agha, ma malite ịgbadata na-ịbịa n’ike site n’ugwu-nta nile ahụ, ma pụta site n’ugwu ukwu nile, ma n’ọzara, na ebe ewusịrị-ike ha nile, na ebe nzuzo ha nile, ma malite iwere onwunwe nke ala ahụ nile ma ndị dị n’ala dị na ndịda-ndịda ma ndị dị n’ala dị n’elu-elu, ma malite iwere onwunwe nke ala ahụ nile nke ndị Nifaị ahapụworo, na obodo-ukwu nile ahụ a hapụworo ka ha tọgbọrọ n’efu.

2 Mana lee, e nweghị anụ ọhịa ọbụla ma-ọbụ anụ-ịchụ-nta n’ala ndị ahụ nile nke ndị Nifaị hapụwororịị, ma enweghị anụ-ịchụ-nta dịrị ndị-ori ahụ nile ma ọbụghị n’ime ọzara ahụ.

3 Ma ndị-ori ahụ enweghị ike ịnọ ma ọbụghị n’ime ọzara ahụ, n’ihi enweghị nri; n’ihi na ndị Nifaị ahapụwo ala ha nile ka ha tọgbọrọ n’efu, ma ha achịkọtawo igwe-anụ ha na igwe-anụmanụ ha na ihe onwunwe ha nile, ma ha nọkọtara n’otu ìgwè.

4 Ya mere, e nweghị ohere maka ndị-ori ahụ ịpụnara ihe na inweta nri, ma ọbụghị ịbịalite n’agha n’ebe ghere oghe megide ndị Nifaị; ma ndị Nifaị ebe ha nọ n’otu ìgwè, ma ebe ha nwere nnukwu ọnụ-ọgụgụ dị otu a, ma ebe ha dokwaworo ihe-oriri nile nye onwe ha, na ịnyịnya nile na igwe-ehi, na igwe-anụ n’ụdị ọbụla, ka ha wee dị ruo afọ asaa, n’ime oge nke ha nwere olile-anya ibibipụ ndị-ori ahụ site n’elu iru nke ala ahụ, ma otu a ka afọ nke iri na asatọ siri gafee.

5 Ma o wee ruo na n’afọ nke iri na iteghete Gịdianhaị chọpụtara na ọ dịịrị mkpa na ya ga-agalite n’agha imegide ndị Nifaị, n’ihi na e nweghị ụzọ nke ha ga-enwe ike ibi ma ọbụghị na ọ bụ ịpụnara ihe ma zuo ori ma gbuo mmadụ.

6 Ma ha anwaghị-anwa ịgbasa onwe ha n’elu iru nke ala ahụ nke ga-eme ka ha nwee ike zụlite akụkụ-ubi, eleghị anya ndị Nifaị abịakwasị ha ma gbuo ha, ya mere Gịdianhaị nyere ndị-agha ya nile iwu na n’afọ nke a ha ga-agalite n’agha megide ndị Nifaị.

7 Ma o wee ruo na ha bịalitere n’agha; ma ọ bụụrụ n’ọnwa nke isii; ma lee, nnukwu na oke egwu ka ụbọchị ahụ dịịrị nke ha bịalitere n’agha; ma ha kere ekike n’ụdị ekike nke ndị-ori; ma ha nwere akpụkpọ Nwa-atụrụ gburu gburu ukwu ha, ma e tejiri ha n’ọbara, ma a kpụrụ isi ha akpụ, ma ha kpugidere ha epekele mkpuchi-isi ha; ma nnukwu na oke egwu ka ụdịdị nke ndị-agha nile nke Gịdianhaị ahụ dịịrị, n’ihi ngwa-agha ha, na n’ihi nteji e tejiri ha n’ọbara.

8 Ma o wee ruo na ndị-agha nile nke ndị Nifaị, mgbe ha hụrụ ụdịdị nke ndị-agha nke Gịdianhaị, ha nile a dawọrịị n’ala, ma welitere mkpọku ha nile nye Onye-nwe Chineke ha, na ọ ga-edebe ha ma napụta ha site n’aka nile nke ndị-iro ha.

9 Ma o wee ruo na mgbe ndị-agha nile nke Gịdianhaị hụrụ nke a ha malitere iti mkpu n’otu olu na-adasike, n’ihi ọn̄ụ ha, n’ihi na ha echewọrịị na ndị Nifaị adawọrịị n’ịtụ egwu n’ihi oke egwu ha tụrụ maka ndị-agha ha nile.

10 Mana n’ihe nke a ha enwetaghị ihe ha bu nʼobi, n’ihi na ndị Nifaị atụghị ha egwu; mana ha atụrụ egwu Chineke ha ma rịọ ya maka nchekwa; ya mere, mgbe ndị-agha nile nke Gịdianhaị bịakwasịrị ha n’ike ha nọ na njikere izute ha; e, n’ume nke Onye-nwe ha nabatara ha.

11 Ma agha ahụ malitere n’ọnwa nke a bụ nke isii; ma nnukwu na oke egwu ka agha ahụ dịịrị n’ebe ahụ, e, nnukwu na oke egwu ka ogbugbu ahụ dịịrị n’ebe ahụ, nke mere na e nweghị mgbe a matara nnukwu ogbugbu dị otu a n’etiti ndị nke Lihaị ahụ nile site n’oge ọ hapụrụ Jerusalem.

12 Ma na-agbanyeghị ammaja nile ahụ na in̄ụ-iyi nile ahụ nke Gịdianhaị meworo, lee, ndị Nifaị meriri ha, nke mere na ha daghachiri azụ site n’iru ha.

13 Ma o wee ruo na aGịdgịdonaị nyere iwu na ndị-agha ya nile ga-achụ ha ruo oke-ala nile nke ọzara ahụ, ma na ha ekwesịghị idebe onye ọbụla nke ga-adaba n’aka ha n’ụzọ; ma otu a ha chụrụ ha ma gbuo ha, ruo n’oke-ala nile nke ozara ahụ, ọbụna ruo mgbe ha mezuworo iwu nke Gịdgịdonaị.

14 Ma o wee ruo na Gịdianhaị, onye guzoworo ma lụọ-ọgụ na-atụghị egwu, a chụrụ ya ọsọ dịka ọ na-agbalaga; ma ebe ike gwụrụ ya n’ihi nnukwu ịlụ-ọgụ ya a chụfere ya ma gbuo ya. Ma nke a bụ ngwụcha nke Gịdianhaị onye-ori.

15 Ma o wee ruo na ndị-agha nile nke ndị Nifaị laghachịkwara ọzọ n’ebe nchekwa ha. Ma o wee ruo na afọ nke iri na iteghete nke a gafere, ma ndị ori ahụ abịaghị kwa ọzọ n’agha; ọbụghị ma ha bịara ọzọ n’afọ nke iri abụọ.

16 Ma n’afọ nke iri abụọ na otu ha abịaliteghị n’agha, mana ha bịalitere n’akụkụ nile ịgba ndị Nifaị gburu-gburu; n’ihi na ha chere na ọbụrụ na ha ga-ebepụ ndị nke Nifaị site n’ịbịa n’ala ha nile, ma ha ga-akpachị ha n’akụkụ nile, ma ọbụrụ na ha ga-ebepụ ha site na ohere ha nile pụtara ìhè, na ha nwere ike ime ka ha rara onwe ha nye dịka ọchịchọ ha nile siri dị.

17 Ugbua ha ahọpụtaworo onwe ha onye-ndu ọzọ, onye aha ya bụụrụ Zemnaraịha; ya mere ọ bụụrụ Zemnaraịha mere ka ndị-agha-ịgba gburu-gburu a bụrụ ihe ga-eme.

18 Mana lee, nke a bụụrụ uru nye ndị Nifaị ahụ; n’ihi na o kweghị ndị-ori ahụ omume ịgba gburu-gburu ogologo oge zuru-oke iji nweta ihe mmekụta n’arụ ndị Nifaị, n’ihi nnukwu ihe-oriri ndị nke ha debesịworo,

19 Ma n’ihi ezughị-ezu nke ihe-oriri nile n’etiti ndị-ori ahụ; n’ihi na lee, ha enweghị ihe ọbụla ma ọbụghị anụ maka ịdị ndụ ha, bụ anụ nke ha nwetara n’ime ọzara ahụ;

20 Ma o wee ruo na aanụ-ọhịa ahụ kọrọ ụkọ n’ọzara ahụ nke mere na ndị-ori ahụ fọdụrụ ntakịrị ka ha nwụọ site na agụụ.

21 Ma ndị Nifaị ahụ nọọrọ na-azọpụta ije esepụghị-aka ma n’ehihie ma n’abalị ma na-adakwasị ndị-agha ha nile, ma na-ebepụ ha na puku na puku ma na iri nile nke puku.

22 Ma otu a ọ bụụrụ ọchịchọ nke ndị Zemnaraịha ahụ iwezuga onwe ha site n’atụmatụ ha, n’ihi nnukwu mbibi nke bịakwasịrị ha n’abalị na n’ehihie.

23 Ma o wee ruo na Zemnaraịha nyere ndị ya iwu ka ha wezuga onwe ha site n’agha-ịgba gburu-gburu ahụ, ma zọga ije n’ebe kachasị tee anya nke ala ahụ dị n’elu-elu.

24 Ma ugbua, Gịdgịdonaị ebe ọ matara maka atụmatụ ha, ma ebe ọ matara maka adịghị-ike ha n’ihi enweghị nri, na nnukwu ogbugbu nke e meworo n’etiti ha, ya mere ọ zipuru ndị-agha ya nile n’oge abalị, ma bepụ ụzọ nke ịlaghachi-azụ ha, ma debe ndị-agha ya nile nʼụzọ nke nlaghachị-azụ ha.

25 Ma nke a ka ha mere n’oge abalị, ma zọrọ-ije ha gafee ndị-ori ahụ, nke mere na n’echi ya, mgbe ndị-ori ahụ malitere ịzọ-ije ha, ndị-agha nke ndị Nifaị zutere ha ma n’iru ha ma n’azụ ha.

26 Ma ndị-ori ahụ nọ na ndịda-ndịda e bepụ kwara ha n’ebe nile nke mgbaghachị ha. Ma ihe nile ndị a e mere ha site n’iwu nke Gịdgịdonaị.

27 Ma e nwere ọtụtụ puku puku ndị raara onwe ha nye ndị-mkpọrọ n’aka ndị Nifaị, ma ndị fọdụrụ n’ime ha e gburu ha.

28 Ma onye-ndu ha, Zemnaraịha, a kpọọrọ ya kwụgbuo ya n’elu osisi, e, ọbụna n’elu ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ma mgbe ha kwụgbuworo ya ruo mgbe ọ nwụrụ ha gbudara osisi ahụ n’ala, ma tie n’olu na-adasike, na-asị:

29 Ka Onye-nwe chekwaa ndị ya n’ezi-omume na n’idi nsọ nke obi, ka ha wee mee ka e gbuda n’ala ndị nile ga-achọ igbu ha n’ihi ike na ntụgwa nzuzo nile, ọbụna dịka e sịworo gbuda nwoke a n’ala.

30 Ma ha n̄ụrịrị ọn̄ụ ma tie kwa ọzọ n’otu olu, na-asị: Ka aChineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, chekwaa ndị a n’ezi-omume, oge nile nke ha bga-akpọ n’aha nke Chineke ha maka nchekwa.

31 Ma o wee ruo na ha malitere, ha nile dịka otu, n’ịbụ-abụ, na aito Chineke ha n’ihi nnukwu ihe nke o mewooro ha, n’ichekwa ha site n’ịdaba n’aka nile nke ndị iro ha.

32 E, ha tiri: aHosana dịrị Chineke Kachasị Elu. Ma ha tiri: Ngọzi na-adịrị aha nke Onye-nwe Chineke bPụrụ Ime Ihe nile, Chineke Kachasị Elu.

33 Ma obi ha nile jupụtara n’ọn̄ụ, ruo n’ịwụpụta ọtụtụ anya-mmiri, n’ihi nnukwu ịdị-mma nke Chineke n’ịnapụta ha site n’aka nile nke ndị-iro ha; ma ha matara na ọ bụụrụ n’ihi nchegharị ha na ịdị-umeala ha ka e jiworo napụta ha site na mbibi mgbe nile na-adigide.