Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 14


Isi 14

Jisus wee nye iwu-nsọ nile: Ekpela ikpe; jụọ Chineke; kpachara-anya maka ndị-amụma ụgha—O wee kwe ndị ga-eme ọchịchọ nke Nna ya nkwa nzọpụta—Tulee Matiu 7. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu nile ndị a ọ tụgharịrị ọzọ n’ebe igwe mmadụ ahụ nọ, ma megheere ha ọnụ ya ọzọ, na-asị: N’ezie, n’ezie, asị m unu, aEkpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.

2 aN’ihi na ihe ọbụla unu jiri kpee ikpe, ka a ga-eji kpee kwa unu; ma ihe ọbụla unu jiri tụọ, ka a ga-eji tụọrọ unu ọzọ.

3 Ma gịnị ka ị na-elere irighiri nke dị n’anya nwanne gị, mana ị tuleghị osisi nke dị n’anya nke gị?

4 Ma-ọbụ olee otu ị ga-esi sị nwanne gị: Ka m dọpụta irighiri site n’anya gị—ma lee, osisi dị n’anya nke gị?

5 Gị onye iru-abụọ, buru ụzọ wepụ aosisi ahụ site n’anya nke gị; ma mgbe ahụ ka ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ irighiri ahụ site n’anya nwanne gị.

6 Enyekwala ụmụ nkịta ihe ahụ nke dị ansọ, ọbụghị ma unu ga-atụpụ ọla pel unu n’iru igwe ézì, adịghị ama ama ha zọgide ha n’okpuru ụkwụ ha, ma tụgharịa ọzọ ma dọkasịa unu.

7 aRịo, ma a ga-enye unu ya; chọọ, ma unu ga-achọta; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu ya.

8 N’ihi na onye ọbụla nke na-arịọ, na-anata; ma onye na-achọ, na-achọta; ma onye nke na-akụ aka, a ga-emeghere ya.

9 Ma-ọbụ olee onye nọ n’ime unu, ọbụrụ na nwa ya nwoke rịọ achịcha, ga-enye ya okwute?

10 Ma-ọbụ ọbụrụ na ọ rịọ azụ, ọ ga-enye ya agwọ?

11 Ọ bụrụ na unu mgbe ahụ, ebe unu bụ ndị ọjọọ, matara otu esị enye ụmụ unu onyinye ọma, olee otu Nna unu nke bi n’elu-igwe ga-esi enye ndị rịọrọ ya ihe ọma nke karịrị?

12 Ya mere, ihe nile ọbụla unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, ameere nu ha ọbụna otu ahụ, n’ihi na nke a bụ iwu ahụ na ndị-amụma ahụ.

13 Banye nu n’ụzọ nke dị amkpafa, n’ihi na obosara ka ọnụ-ụzọ-ama ahụ dị, ma bmbara ka ụzọ ahụ dị, nke na-edụba na mbibi, ma ọtụtụ ka ha dị bụ ndị na-aba site na ya;

14 N’ihi na mkpafa ka aọnụ-ụzọ-ama ahụ dị, ma bwara-wara ka ụzọ ahụ dị, nke na-edụba na ndụ, ma cole na ole ka ha dị bụ ndị na-achọta ya.

15 Kpachapụ-anya maka andị-amụma-ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, mana n’ime ime ha bụ nkịta-ọhịa na-apụnara atụrụ.

16 Unu ga-amata ha site na mkpụrụ ha nile. Ndị mmadụ ha na-ekpokọta mkpụrụ-osisi vine nke ogwu, ma-ọbụ osisi fig nke ogwu ogwu?

17 Ọ bụna otu ahụ osisi ọma ọbụla na-amịpụta mkpụrụ ọma; mana osisi mebiri emebi na-amịpụta mkpụrụ ọjọọ.

18 Osisi ọma enweghị ike imipụta mkpụrụ ọjọọ, ọbụghị ma osisi mebiri emebi ga-amịpụta mpụrụ ọma.

19 Osisi ọbụla nke ana-amịpụtaghị mkpụrụ ọma a ga-egbutu ya, ma tụba ya n’ime ọkụ.

20 Ya mere, site na amkpụrụ ha nile unu ga-amata ha.

21 Ọ bụghị onye ọbụla nke na-asị m, Onye-nwe, Onye-nwe, ga-aba n’ala-eze nke elu-igwe; kama onye nke na-eme ọchịchọ nke Nna m nke bi n’elu-igwe.

22 Ọtụtụ aga-asị m n’ụbọchị ahụ: Onye-nwe, Onye-nwe, ọbụ na anyị ebubeghị amụma n’aha gị, ma n’aha gị chụpụwo ajọọ-mụọ nile, ma n’aha gị rụwo ọtụtụ ọrụ dị ebube?

23 Ma mgbe ahụ ka m ga-ekwupụtara ha: Ọ dịghị mgbe ọbụla m amatara unu; bsi n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ ọjọọ.

24 Ya mere, onye ọbụla nụrụ ihe nkwupụta m nile ndị a ma na-eme ha, aga m atụnyere ya onye amamihe, nke wuru ụlọ ya n’elu ankume

25 Ma ammiri-ozuzo gbadatara, ma ide-mmiri nile bịara, ma ifufe nile fere, ma fekwasị ụlọ ahụ; ma ọ bdaghị, n’ihi na a tọrọ ntọ-ala ya n’elu okwute.

26 Ma onye ọbụla nke na-anụ ihe nkwupụta m nile ndị a ma ghara ime ha a ga-atụnyere ha onye nzuzu, nke wuru ụlọ ya n’elu aaja

27 Ma mmiri-ozuzo gbadatara, ma ide mmiri nile bịara, ma ifufe nile fere, ma fekwasị ụlọ ahụ; ma ọ dara, ma nnukwu ka ọdịda ya dị.