Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 8


Isi 8

Oke-ikuku-mmiri nile, ala-ọma-jijiji nile, ọkụ nile, ifufe gburu gburu nile, mbibi nile a hụrụ-anya na-agba-ama mkpọgide-n’obe nke Kraịst—Ọtụtụ ndị ka e bibiri—Ọchịchịrị kpuchịrị ala ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ—Ndị nke fọdụrụ sụrụ-ude ụwa-na-chi ha. Ihe dịka afọ 33 ruo 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na dịka akụkọ-ndekọta anyị siri dị, ma anyị matara akụkọ-ndekọta anyị na ọ bụ ezi-okwu, n’ihi na lee, ọ bụụrụ onye ezi-omume dekọrọ akụkọ-ndekọta ahụ—n’ihi na n’ezi-okwu ọ rụrụ ọtụtụ aọrụ-ebube bn’aha nke Jisus; ma enweghị nwoke ọbụla nwere ike ịrụ ọrụ-ebube n’aha nke Jisus ma ọbụghị na a sachara ya mpekere nile site n’ajọọ-omume ya—

2 Ma ugbua o wee ruo, ọbụrụ na e nweghị ndehie nwoke a mere na ngụkọta nke oge anyị, aafọ nke iri atọ na atọ agafewo;

3 Ma ndị ahụ malitere iji nnukwu ezi-okwu na-ele anya ihe iriba-ama nke onye-amụma Samuel, onye nke Leman, nyeworo; e, maka oge nke a ga-enwe aọchịchịrị n’ohere nke mkpụrụ ụbọchị atọ n’elu iru nke ala ahụ.

4 Ma a malitere inwe nnukwu obi abụọ nile na ịrụ-ụka nile n’etiti ndị ahụ, na-agbanyeghị na e nyewo ọtụtụ aihe iriba-ama.

5 Ma o wee ruo n’afọ nke iri atọ na anọ, n’ọnwa nke mbụ, n’ụbọchị nke anọ nke ọnwa ahụ, nnukwu ebili-mmiri palitere, ụdị nke a na-amatabeghị mbụ n’ala ahụ nile.

6 Ma e nwekwara nnukwu na oke-ikụkụ-mmiri dị egwu, ma e nwere aegbe-elu-igwe dị egwu, nke mere na ọ bmara ala ahụ nile jijiji dịka ọ chọrọ ikewasị iche iche.

7 Ma e nwere amụma-elu nile dị nkọ karịa, ụdị nke a na-amatabeghị mbụ n’ala ahụ nile.

8 Ma aobodo-ukwu nke Zarahemla bara ọkụ.

9 Ma obodo-ukwu nke Moronaị damiri n’ime omimi nile nke osimiri, ma ndị nile bi n’ime ya mikpuru.

10 Ma e buuru aja bukwasị obodo-ukwu nke Moronaịha ahụ, nke mere na n’ọnọdụ nke obodo-ukwu ahụ e nweziri nnukwu ugwu-ukwu.

11 Ma e nwere nnukwu mbibi dị egwu n’ala dị na ndịda-ndịda.

12 Mana lee, e nwere nnukwu mbibi dị egwu karịa n’ala dị n’elu-elu; n’ihi na lee, iru nile nke ala ahụ a gbanwere ya, n’ihi oke-ikụkụ-mmiri ahụ na ifufe gburu gburu nile, na egbe-elu-igwe nile na amụma-elu nile, na ịma jijiji karịrị akarị nke ala ahụ nile;

13 Ma aokporo-ụzọ nile gbawasịrị, ma ụzọ nile dị ahata-aha e mebiri ha, ma ọtụtụ ebe dị larịị dịzịrị ndakoro.

14 Ma ọtụtụ nnukwu obodo-ukwu na ndị kwesịrị ịrịba-ama e amikpuru ha, ma ọtụtụ a gbara ha ọkụ, ma ọtụtụ a magidere ha jijiji ruo mgbe ụlọ nile dị ha n’ime daworo n’ala, ma ndị nile bi n’ime ha e gburu ha, ma ebe ahụ nile a hapụrụ ha ka ha tọgbọrọ n’efu.

15 Ma e nwere ụfọdụ obodo-ukwu ndị fọdụrụ; mana mmebi dị na ha dị ukwuu karịa, ma e nwere ọtụtụ bi n’ime ha ndị e gburu-egbu.

16 Ma e nwere ụfọdụ ndị e bufuru n’ifufe gburu gburu ahụ; ma ebe ha gara ọdịghị onye matara, ma ọbụghị na ha matara na e bufuru ha.

17 Ma otu a iru nke ala ahụ nile mebiri n’ụdị, n’ihi oke-ikụkụ-mmiri ahụ nile, na egbe-elu-igwe nile, na amụma-elu ahụ nile, na ima jijiji nke ala ahụ.

18 Ma lee, ankume nile ahụ e tiwara ha abụọ, a gbawasịrị ha n’elu iru nke ala ahụ nile, nke mere na a chọtara ha na mpekere gbawasịrị agbawasị, ma na njikọ nile ma na mgbawa nile, n’elu iru nile nke ala ahụ.

19 Ma o wee ruo na mgbe egbe-elu-igwe nile, na amụma-elu nile ahụ, na ebili mmiri ahụ, na oke ikuku mmiri ahụ, na ịma jijiji nile nke ala ahụ kwụsịrị—n’ihi na lee, ha nọrọ ihe dịka ohere nke oge aawa atọ; ma ụfọdụ kwuru na oge ahụ karịrị; otu o sila dị, nnukwu ihe nile ndị a dị egwu e mere ha n’ihe dịka ohere nke oge awa atọ—ma mgbe ahụ lee, e nwere ọchịchịrị n’elu iru nke ala ahụ.

20 Ma o wee ruo na e nwere agbidigbi ọchịchịrị n’elu iru nile nke ala ahụ, nke mere na ndị bi n’ime ya ndị na-adabeghị nwere ike ainwe mmetụta bụzụ nke ọchịchịrị ahụ;

21 Ma enweghị ike inwe ìhè, n’ihi ọchịchịrị ahụ, ma-ọbụ oriọna nile, ma-ọbụ ọkụ-opịpị nile, ma-ọbụ na enwere ike inwe ọkụ afụnwuru jiri e zigbo nkụ kpọrọ-akpọ karịa, nke ga-eme na enweghị ike inwe ihe ọbụla ma ọlị;

22 Ma enweghị ìhè ọbụla a hụrụ, ma-ọbụ ọkụ, ma-ọbụ ihe ọkụ, ma-ọbụ anyanwụ, ma-ọbụ ọnwa, ma-ọbụ kpakpando nile, n’ihi na oke nnukwu ka igirigi ọchịchịrị ahụ nke dị n’elu iru nke ala ahụ dị.

23 Ma o wee ruo na ọ dịgidere n’ohere nke mkpụrụ aụbọchị atọ na e nweghị ìhè a hụrụ; ma e nwere nnukwu iru-uju na iti mkpu na ịkwa-akwa n’etiti ndị ahụ nile esepụghị-aka; e, nnukwu ka isu-ude nile nke ndị ahụ dịịrị, n’ihi ọchịchịrị na nnukwu mbibi ahụ nke bịakwasịworo ha.

24 Ma n’otu ebe, a nụrụ ka ha na-eti na-asị: O na anyị chegharịworọrịị tutu nnukwu ụbọchị nke a dị egwu, ma mgbe ahụ ka a gaararịị edebe ụmụnne anyị nwoke, ma agaraghị akpọ ha ọkụ na nnukwu obodo-ukwu aZarahemla ahụ.

25 Ma n’ebe ọzọ a nụrụ ka ha na-eti na-eru uju, na-asị: O na anyị chegharịworọrịị tutu nnukwu ụbọchị nke a dị egwu, ma ghara igbu ma tụọ ndị-amụma ahụ nile okwute, ma chụpụ ha; mgbe ahụ ka ndị nne anyị na ụmụada anyị nile mara mma, na ụmụ anyị a gaara edebe ha, ma agaraghị eliwo ha n’ime nnukwu obodo-ukwu Moronaịha ahụ. Ma otu a ka iti ogologo mkpu nile nke ndị ahụ siri dị ukwuu na egwu.