Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 6


Isi 6

Ndị nke Nifaị wee mee nke-ọma—Mpako, akụ, na ịrọ-otu wee malite—E kewasịrị Nzukọ-nsọ ahụ site na nghọtahie—Setan duru ndị ahụ na nnupụ-isi pụtara ìhè—Ọtụtụ ndị-amụma kwusara nchegharị ma e gburu ha—Ndị gburu ha gbara izu ịweghara ọchịchị ahụ. Ihe dịka afọ 26 ruo 30 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na ndị nke ndị Nifaị laghachịrị ha nile n’ala nke aka ha nile n’afọ nke iri abụọ na isii, nwoke ọbụla ya na ezi na ụlọ ya, igwe anụ ya nile na igwe anụmanụ ya nile, ịnyịnya ya nile na igwe-ehi ya, na ihe nile ọbụla bụ nke ha.

2 Ma o wee ruo na ha erichabeghị ihe-oriri ha nile; ya mere ha were nye onwe ha ihe nile ha na-erichabeghị site n’akụkụ-ubi ha nile n’ụdị ọbụla, na ọla-edo ha, na ọla-ọcha ha, na ihe ha nile dị oke-ọnụ-ahịa, ma ha laghachiri n’ala nke aka ha nile na ihe onwunwe ha nile, ma n’akụkụ elu-elu ma n’akụkụ ndịda-ndịda, ma n’ala dị n’elu-elu ma n’ala dị na ndịda-ndịda.

3 Ma ha nyere ndị-ori nile ahụ ndị baworo n’ime ọgbụgba-ndụ idebe udo nke ala ahụ, ndị nwere ọchịchọ ịbụ ndị Leman, ala, dịka ọnụ-ọgụgụ ha nile siri dị, ka ha wee nwee, site n’ọrụ aka ha nile, ebe ha ga-esi nweta ihe ha ji adị ndụ; ma otu a ha hiwere udo n’ala ahụ.

4 Ma ha malitere ọzọ ime nke-ọma na ibawanye nnukwu; ma afọ nke iri abụọ na isii na asaa gafere, ma e nwere nnukwu usoro n’ala ahụ; ma ha emewo iwu ha nile dịka ahata-aha na izi-ezi siri dị.

5 Ma ugbua o nweghị ihe ọbụla dị n’ala ahụ nile ga-egbochi ndị ahụ ime nke-ọma esepụghị-aka, ma ọbụghị na ha ga-adaba n’ime njehie.

6 Ma ugbua ọ bụụrụ Gịdgịdonaị, na onye-ikpe ahụ, Lakoniọs, na ndị ahụ ahọpụtaworo ndị ndu, bụ ndị hiweworo nnukwu udo a n’ala ahụ.

7 Ma o wee ruo na e nwere ọtụtụ obodo-ukwu e wuru ọhụrụ, ma e nwere ọtụtụ obodo-ukwu ochie e wugharịrị.

8 Ma e nwere ọtụtụ okporo-ụzọ e wulitere, na ọtụtụ ụzọ e mere nke duru site n’obodo-ukwu ruo n’obodo-ukwu, na site n’ala ruo n’ala, na site n’ebe ruo n’ebe.

9 Ma otu a ka afọ nke iri abụọ na asatọ siri gafee, ma ndị ahụ nwere udo esepụghị-aka.

10 Mana o wee ruo n’afọ nke iri abụọ na iteghete a malitere inwe ịrụ-ụka n’etiti ndị ahụ; ma ụfọdụ buliri onwe ha elu nye ampako na itu-ọnụ nile n’ihi nnukwu ụba ha karịrị akarị, e, ọbụna ruo na nnukwu inye nsogbu nile;

11 N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị ọzụ-ahịa ukwu n’ala ahụ, na kwa ọtụtụ ndị ọka-iwu, na ọtụtụ ndị-ọrụ.

12 Ma a malitere igosi ihe dị iche na ndị ahụ site n’ọkwa nile, dịka aakụ na ụba ha nile na ohere ha maka ọmụmụ ihe siri dị; e, ụfọdụ nọọrọ n’amaghị-ama n’ihi ogbenye ha, ma ndị ọzọ natara nnukwu ọmụmụ-ihe n’ihi akụ na ụba ha nile.

13 Ụfọdụ buliri onwe ha elu na mpako, ma ndị ọzọ dị umeala karịa; ụfọdụ kwụghachịrị ịkpọ-iyi n’ọnọdụ ịkpọ-iyi, ebe ndị ọzọ ga-anata ịkpọ-iyi na ansogbu na ụdị mkpagbu nile dị iche iche, ma ha agaghị atụgharị ma bkwuo okwu ọjọọ ọzọ, kama ha dị umeala nwee obi nchegharị n’iru Chineke.

14 Ma otu a e nwere nnukwu ahaghị-n’otu n’ala ahụ nile, nke mere na nzukọ-nsọ ahụ malitere ikewasị; e, nke mere na n’afọ nke iri atọ nzukọ-nsọ ahụ e kewasịrị ya n’ala ahụ nile ma ọbụghị n’etiti ndị Leman ole na ole ndị a gbanwere nye okwukwe nke ezi-okwu ahụ; ma ha achọghị isi n’ime ya pụọ, n’ihi na ha kwụsiri ike, ma kwesie ike, ma bụrụ akwaa akwụrụ, dị na njikere na amgbalị nile idebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe.

15 Ugbua ihe kpatara ajọọ-omume nke a nke ndị ahụ bụụrụ nke a—Setan nwere nnukwu ike, ruo n’ịkpalite ndị ahụ ime ụdị ajọọ-omume ọbụla dị iche iche, na ịfụli ha elu na mpako, na-anwa ha ịchọ ike, na ikike, na ụba nile, na ihe efu nile nke ụwa.

16 Ma otu a ka Setan siri dufuo obi nile nke ndị ahụ ime ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche; ya mere ha enwewo ọn̄ụ udo nanị afọ ole na ole.

17 Ma otu a, na mmalite afọ nke iri atọ—ndị ahụ ebe anapụtaworo ha n’ohere nke ogologo oge ka aonwunwa nile nke ekwensu ahụ na-ebugharị ha ebe ọbụla nke ọ chọrọ ibụga ha, na-ime ajọọ-omume ọbụla ọ chọrọ ka ha mee—ma otu a na mmalite nke a, afọ nke iri atọ, ha nọọrọ n’ọnọdụ nke ajọọ-omume dị egwu.

18 Ugbua ha emeghị mmehie ana-amaghị-ama, n’ihi na ha matara ọchịchọ Chineke gbasara ha, n’ihi na a kuziworo ha ya rị; ya mere ha kpachapụrụ-anya bnupu-isi megide Chineke.

19 Ma ugbua ọ bụụrụ n’ụbọchị nile nke Lakoniọs, nwa nwoke nke Lakoniọs, n’ihi na Lakoniọs nọchịrị oche nke nna ya ma chịa ndị ahụ n’afọ ahụ.

20 Ma a malitere inwe ndịkom a akwalitere mụọ ha site n’elu-igwe ma zipụta, na-eguzo n’etiti ndị ahụ n’ala ahụ nile, na-ekwusa ozi-ọma na-agba-ama n’atụghị egwu maka mmehie nile na ajọọ-omume nile nke ndị ahụ, ma na-agbara ha ama gbasara mgbapụta ahụ nke Onye-nwe ga-eme maka ndị ya, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, mbilite-n’ọnwụ nke Kraịst; ma ha gbara-ama n’atụghị egwu maka bọnwụ ya na ahụhụ ya nile.

21 Ugbua e nwere ọtụtụ n’ime ndị ahụ ndị iwe were karịa n’ihi ndị ahụ gbara-ama maka ihe ndị a; ma ndị ahụ were iwe kara bụrụ ndị-isi-ikpe ahụ, na ndị abuwororịị ndị isi nchụ-aja na ndị ọka-iwu; e, ndị nile ahụ bụụrụ ndị ọka-iwu, iwe were ha n’ebe ndị ahụ gbara-ama maka ihe ndị a nile nọ.

22 Ugbua e nweghị onye-ọka-iwu ma-ọbụ ọka-ikpe ma-ọbụ onye isi nchụ-aja nke nwere ike ịma onye ọbụla ikpe ọnwụ ma ọbụghị na amam-ikpe ha, onye-ọchịchị nke ala ahụ etinyewo aka n’akwụkwọ maka ya.

23 Ugbua e nwere ọtụtụ ndị ahụ gbara-ama maka ihe ndị gbasara Kraịst ndị gbara-ama n’atụghị egwu, ndị nke ndị-ikpe ahụ kpọọrọ ma gbuo ha na nzuzo, na mmata nke ọnwụ ha abịarughị onye-ọchịchị nke ala ruo mgbe ha nwụchaworo.

24 Ugbua lee, nke a megidere iwu nile nke ala ahụ, na a ga-egbu onye ọbụla ma ọbụghị na ha nwere ike site n’aka onye-ọchịchị nke ala ahụ—

25 Ya mere mkpesa bịalitere rute ala nke Zarahemla, ruo onye-ọchịchị nke ala ahụ, megide ndị-ikpe a ndị maworo ndị-amụma nile nke Onye-nwe ikpe ọnwụ, na-abụghị dịka iwu ahụ siri dị.

26 Ugbua o wee ruo na a kpọọrọ ha ma kpọlite ha n’iru onye-ikpe ahụ, ka e kpee ha ikpe maka imebi-iwu nke ha meworo, dịka aiwu ahụ siri dị nke ndị ahụ nyeworo.

27 Ugbua o wee ruo na ndị-ikpe ahụ nwere ọtụtụ ndị enyị na ebo nile; ma ndị fọdụrụ, e, ọbụna ọfọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ ndị ọka-iwu nile na ndị isi nchụ-aja nile, kpọkọtara onwe ha ọnụ, ma dị n’otu ha na ebo nile nke ndị-ikpe ahụ a ga-ekpe ikpe dịka iwu siri dị.

28 Ma ha bara n’ime aọgbụgba-ndụ otu onye na ibe ya, e, ọbụna n’ime ọgbụgba-ndụ ahụ nke ndị mgbe ochie nyere, ọgbụgba-ndụ nke e nyere ma nye site na bekwensu, ịtụgwa megide ezi-omume nile.

29 Ya mere ha jikọtara megide ndị nke Onye-nwe, ma baa n’ime ọgbụgba-ndụ ibibi ha, na ịnapụta ndị nke ikpe mara maka igbu mmadụ site na njidesike nke ikpe-ziri-ezi, nke a chọrọ iji leta ha dịka iwu ahụ siri dị.

30 Ma ha mere ihe efu iwu na ihe nile ruru mmadụ nke mba ha; ma ha gbara-ndụ otu onye na ibe ya ibibi onye-ọchịchị ahụ, na idebe aonye-eze n’ala ahụ, ka ala ahụ ghara ịdị kwa ọzọ na ntọhapụ kama ka ọ dịrị n’okpuru ndị-eze.