Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 15


Isi 15

Jisus wee kwupụta na e mejupụtara iwu nke Moses na ya—Ndị nke Nifaị bụ atụrụ nke ọzọ ahụ nke o kwuru maka ya na Jerusalem—N’ihi ajọọ-omume, ndị nke Onye-nwe nọ na Jerusalem amataghị maka atụrụ nke Israel e kposasịrị. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kwuchaworo ihe nkwupụta nile ndị a, o lepụrụ anya ya gburu-gburu lee igwe mmadụ ahụ, ma sị ha: Lee, unu anụwo ihe nile nke m kuziri tutu mụ arigokwuru Nna m; ya mere, onye ọbụla na-echeta ihe ndị a nke m kwuworo ma ana-eme ha, ya ka m bga-ekulite n’ụbọchị ikpe-azụ.

2 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu ndị a ọ hụrụ na e nwere ụfọdụ n’etiti ha ọ tụrụ n’anya, ma chee ihe ọ ga-eme gbasara aiwu nke Moses; n’ihi na ha aghọtaghị ihe nkwupụta ahụ na ihe ochie nile agabigawo, ma na ihe nile aghọwo ihe ọhụrụ.

3 Ma ọ sịrị ha: Ya atụla unu n’anya na asị m unu na ihe ochie nile agabigawo, ma na ihe nile aghọwo ihe ọhụrụ.

4 Lee, asị m unu na e mejupụtawo aiwu ahụ nke e nyere Moses.

5 Lee, aabụ m onye nke nyere iwu ahụ, ma abụ m onye nke ya na ndị m Israel gbara-ndụ; ya mere, iwu ahụ n’ime m e mejupụtara ya, n’ihi na abịawo m bimejupụta iwu ahụ; ya mere o nwere ọgwụgwụ.

6 Lee, anaghị m aebibi ndị-amụma, n’ihi na ka ha ra bụ ndị a na-emejupụtabeghị n’ime m, n’ezie asị m unu, a ga-emejupụta ha nile.

7 Ma n’ihi na asị m unu na ihe ochie nile agabigawo, anaghị m ebibi ihe ahụ nke e kwuworo gbasara ihe ndị nke ga-abịa.

8 N’ihi na lee, aọgbụgba-ndụ ahụ nke m meworo mụ na ndị m, e mejupụtabeghị ha nile; mana iwu ahụ nke e nyeworo Moses nwere ọgwụgwụ n’ime m.

9 Lee, abụ m aiwu ahụ, na bìhè ahụ. Lekwasị m anya, ma nagide ruo ọgwụgwụ, ma unu cga-adị ndụ; n’ihi na onye ahụ dna-anọgide ruo ọgwụgwụ ka m ga-enye ndụ-ebighi-ebi.

10 Lee, enyewo m unu aiwu-nsọ nile ahụ; ya mere debe iwu-nsọ m nile. Ma nke a bụ iwu ahụ na ndị-amụma nile ahụ, n’ihi na n’ezie ha bgbara-ama maka m.

11 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu ndị a, ọ sịrị iri na abụọ ndị ahụ nke ọ họrọworo:

12 Unu bụ ndị na-eso ụzọ m; ma unu bụ ìhè nye ndị a, ndị bụ ndị fọdụrụ nke ụlọ nke aJosef.

13 Ma lee, nke a bụ aala nke nketa unu; ma Nna enyewo unu ya.

14 Ma ọdịghị mgbe ọbụla Nna nyeworo m iwu-nsọ na m aga-agwa ya ụmụnne unu nọ na Jerusalem.

15 Ọ bụghị ma ọ dị mgbe Nna nyeworo m iwu-nsọ na m ga-agwa ha gbasara aagbụrụ ndị ọzọ nke ụlọ nke Israel ahụ, ndị nke Nna dupụworo site n’ala ahụ.

16 Nke ha otu a ka Nna nyere m iwu-nsọ, na m ga-agwa ha.

17 Na e nwere m atụrụ ndị ọzọ ndị na-abụghị nke ogige-atụrụ nke a; ha kwa ka m ga-akpọtarịrị, ma ha ga-anụ olu m; ma a ga-enwe otu ogige atụrụ, na otu aonye-ọzụzụ atụrụ.

18 Ma ugbua, n’ihi ịkpọ-ekwe-nkụ na ekweghị-ekwe, ha aaghọtaghị okwu m; ya mere enyere m iwu ka m ghara ịgwa kwa ha ọzọ site na Nna gbasara ihe nke a.

19 Mana, n’ezie, asị m unu na Nna enyewo m iwu, ma ana m agwa unu ya, na ekewapụrụ unu site n’etiti ha n’ihi ajọọ-omume ha; ya mere ọ bụ n’ihi ajọọ-omume ha ka ha jiri mataghị maka unu.

20 Ma n’ezie, asị m unu ọzọ na agbụrụ nke ọzọ ahụ ka Nna kewapụtaworo site na ha; ma ọ bụ n’ihi ajọọ-omume ha ka ha jiri mataghị maka ha.

21 Ma n’ezie asị m unu, na unu bụ ndị ahụ nke m sịrị: Enwere m aatụrụ ndị ọzọ ndị na-abụghị nke ogige-atụrụ nke a; ha kwa ka m ga-akpọtarịrị, ma ha ga-anụ olu m; ma a ga-enwe otu ogige-atụrụ, na otu onye-ọzụzụ-atụrụ.

22 Ma ha aghọtaghị m, n’ihi na ha chere na ọ bụrịị andị Jentaịlụ; n’ihi na ha aghọtaghị na a bga-agbanwe ndị Jentaịlụ site n’ikwusa ozi-ọma ha.

23 Ma ha aghọtaghị m na m sịrị na ha ga-anụ olu m; ma ha aghọtaghị m na ndị aJentaịlụ agaghị enwe ike mgbe ọbụla ịnụ olu m—na mụ agaghị egosipụta ha onwe m ma ọbụghị site na bMụọ Nsọ.

24 Mana lee, unu anụwo aolu m ma hụ kwa m; ma unu bụ atụrụ m, ma agụnyere unu n’etiti ndị Nna bnyeworo m.