Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 28


Isi 28

Iteghete n’ime Iri na abụọ ahụ wee chọọ ma e kwere ha nkwa ihe nketa n’ime ala-eze Kraịst ma ha nwụọ—Ndị Nifaị Atọ ahụ wee chọọ ma e nyere ha ike imeri ọnwụ ka ha wee nọgide n’ụwa ruo mgbe Jisus ga-abịa ọzọ—E nwogharịrị ha ma hụ ihe nile na-akwadoghị n’iwu ikwupụta, ma ha na-akụzi ozi-ọma n’etiti ndị mmadụ. Ihe dịka site na afọ 34 ruo 35 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo mgbe Jisus kwuworo okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso uzo ya okwu, n’otu n’otu, na-asị ha: Gịnị ka unu chọrọ n’aka m, mgbe m gakwuworo Nna?

2 Ma ha nile wee kwuo okwu, ma ewezuga atọ, na-asị: Anyị chọrọ ka mgbe anyị bichaworo afọ nke mmadụ, ka ije-ozi anyị, n’ime nke i kpọworo anyị, ga-enwe ngwụcha, ka anyị wee bịakwute gị ọsọ-ọsọ n’ala-eze gị.

3 Ma ọ sịrị ha: Ngọzi na-adịrị unu n’ihi na unu chọrọ ihe nke a n’aka m; ya mere, mgbe unu gbasịworo iri afọ asaa na abụọ unu ga-abịakwute m n’ala-eze m; ma n’ebe m nọ unu ga-achọta aezumike.

4 Ma mgbe ọ gwaworo ha okwu, ọ tụgharịrị onwe ya nye atọ ndị ahụ, ma sị ha: Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu, mgbe m gakwuworo Nna?

5 Ma ha nwere mwute n’obi ha, n’ihi na ha anwaghị-anwa ịgwa ya ihe nke ha chọrọ.

6 Ma ọ sịrị ha: Lee, aama m echiche unu nile, ma unu achọwo ihe ahụ nke bJọn, onye m hụrụ n’anya, onye mụ na ya nọ na ije-ozi m, tutu mgbe ndị Juu buliri m elu, chọrọ n’aka m.

7 Ya mere, ngọzi karịrị na-adịrị unu, n’ihi na unu aagaghị edetụ bọnwụ ire mgbe ọbụla, mana unu ga-ebi ịhụ ihe nile nke Nna mesoro ụmụ nke mmadụ, ọbụna ruo mgbe ihe nile ga-emezu dịka uche nke Nna siri dị, mgbe m ga-abịa n’otuto m jiri cike nile nke elu-igwe.

8 Ma unu agaghị anagide mgbu nile nke ọnwụ mgbe ọbụla; mana mgbe m ga-abịa n’otuto m a ga-agbanwe unu n’otu ntabi-anya site an’ịnwụ anwụ baa bn’anwụghị anwụ; ma mgbe ahụ ka unu ga-enwe ngọzi n’ala-eze nke Nna m.

9 Ma ọzọ, unu agaghị enwe mgbu mgbe unu ga-ebi n’anụ-arụ, ọbụghị ma unu ga-enwe mwute ma ewezuga ma ọbụghị maka mmehie nile nke ụwa; ma ihe nile a ka m ga-eme n’ihi ihe ahụ nke unu chọworo n’aka m, n’ihi na unu achọwo ka unu wee awetara m mkpụrụ-obi nke ndị mmadụ, mgbe nile ụwa na-eguzo.

10 Ma n’ihi nke a unu ga-enwe auju nke ọn̄ụ; ma unu ga-anọdụ n’ala-eze nke Nna; e, ọn̄ụ unu ga-eju eju, ọbụna dịka Nna nyeworo m uju nke ọn̄ụ; ma unu ga-adị ọbụna otu m dị, ma adị m ọbụna dịka Nna; ma Nna na mụ bụ botu;

11 Ma aMụọ Nsọ na-agba ama maka Nna na mụ; ma Nna na-enye ụmụ nke mmadụ Mụọ Nsọ, n’ihi m.

12 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kwuworo okwu ndị a, o jiri mkpịsị-aka ya metụ onye ọbụla n’ime ha ma ewezuga atọ ndị ahụ ga-echere, ma mgbe ahụ ọ pụrụ.

13 Ma lee, e meghere elu-igwe nile, ma e awelitere ha n’ime elu-igwe, ma hụrụ ma nụrụ ihe ndị a na-anaghị ekwu ekwu.

14 Ma e agbochiri ha ikwupụta ha; ọbụghị ma e nyere ha ike ka ha kwupụta ihe nile nke ha hụrụ ma nụ;

15 Ma, ma ha nọ na arụ ma-ọbụ ha pụtara site na arụ, ha enweghị ike ịkọ; n’ihi na ọ dịịrị ha ka amnwogharị nke ha, na a gbanwere ha site na arụ a nke anụ arụ baa n’ime ọnọdụ anwụghị-anwụ, ka ha wee hụ ihe nile nke Chineke:

16 Mana o wee ruo na ha kuzịkwara ozi-ọma ọzọ n’elu iru nke ụwa; otu o sila dị ha akụzighị ozi-ọma maka ihe ndị ha nụworo ma hụ kwa, n’ihi iwu-nsọ ahụ nke e nyere ha n’elu-igwe.

17 Ma ugbua, ma ha nọ n’ịnwụ anwụ ma-ọbụ n’anwụghị anwụ, site n’ụbọchị nke mnwogharị ha, amaghị m;

18 Mana otu a ka m matara, dịka ihe-ndekọta nke e nyeworo siri dị—ha gara nʼiru n’elu iru nke ala ahụ, ma kụziere ndị ahụ ozi-ọma, na-ejikọta na nzukọ-nsọ ahụ ka ha ra ga-ekwere n’ikwusa-okwu ozi-ọma ha; na-eme ha baptism, ma ka ha ra e mere baptism natara Mụọ Nsọ.

19 Ma a tụbara ha n’ụlọ-mkpọrọ site na ndị na abụghị ndị nzukọ-nsọ ahụ. Ma aụlọ-mkpọrọ ahụ enweghị kwa ike ijide ha, n’ihi na ha gbawara abụọ.

20 Ma a tụdara ha n’ime ala ahụ; mana ha jiri okwu Chineke tie ala ahụ ihe-otiti, nke mere na site an’ike ya a napụtara ha site n’omimi nile nke ala ahụ; ma ya mere ha enweghị ike igwu ọlụlụ nile zuru ijide ha.

21 Ma ugboro atọ ka a tụbara ha n’ime aoke ọkụ ma ha anataghị mmeru arụ.

22 Ma ugboro abụọ a tụbara ha n’ime aọgba nke anụ-ọhịa nile; ma lee ha na anụmanụ nile gwuru-egwu dịka nwata ya na nwa-atụrụ na-an̄ụ ara, ma ha anataghị mmeru-arụ.

23 Ma o wee ruo na otu a ha gara nʼiru n’etiti ndị nke Nifaị ahụ nile, ma kwusaa aozi-ọma nke Kraịst nye ndị nile nọ n’elu iru nke ala ahụ; ma agbanwere ha nye Onye-nwe, ma e jikọtara ha nye nzukọ-nsọ nke Kraịst ahụ, ma otu a ndị nke bọgbọ ahụ a gọziri ha, dịka okwu nke Jisus siri dị.

24 Ma ugbua mụ, Mọmọn, abịa na ngwụcha nke ikwu okwu gbasara ihe ndị a na nwa oge.

25 Lee, a chọrọ m ide aaha nile nke ndị ahụ na-agaghị edetụ onwu ire mgbe ọbụla, ma na Onye-nwe gbochiri m; ya mere e deghị m ha, n’ihi na e zonarịrị ha ụwa.

26 Mana lee, ahụwo m ha, ma ha akụziworo m ozi-ọma.

27 Ma lee ha ga-anọ n’etiti ndị Jentaịlụ, ma ndị Jentaịlụ agaghị amata ha.

28 Ha ga-anọ kwa n’etiti ndị Juu, ma ndị Juu agaghị amata ha.

29 Ma ọ ga-eru, mgbe Onye-nwe hụrụ na ọ dị mma na amamihe ya na ha ga-akụziri aagbụrụ nke Israel gbasasịrị agbasasị ozi-ọma, ma nye mba nile, ebo nile, asụsụ nile na ndị mmadụ, ma ha ga-ewepụta site na ha nye Jisus ọtụtụ mkpụrụ-obi, nke ga-eme ka emezuo ọchịchọ ha, na kwa n’ihi ike nke Chineke na-eme ka mmadụ kwenye nke dị n’ime ha.

30 Ma ha dịka andị mụọ-ozi nke Chineke, ma ọbụrụ na ha ga-ekpe ekpere nye Nna n’aha nke Jisus ha nwere ike igosi onwe ha onye ọbụla dị ha mma.

31 Ya mere, nnukwu na ọrụ ịtụ-n’anya nile ka ha ga-arụ, tutu annukwu na ụbọchị na-abịa abịa ahụ mgbe ndị nile ga-eguzoro n’ezie n’iru oche-ikpe nke Kraịst;

32 E ọbụna n’etiti ndị Jentaịlụ ka a ga-enwe annukwu na ọrụ dị ịtụ-n’anya ha rụrụ, tutu ụbọchị ikpe ahụ.

33 Ma ọbụrụ na unu nwere akwụkwọ-nsọ nile nke na-enye nkọwasị maka ọrụ ịtụ-n’anya nile nke Kraịst, unu ga, dịka okwu nile nke Kraịst siri dị, amata na ihe ndị a ga-abịarịrị.

34 Ma ahụhụ dịrị onye nke na aagaghị an̄a ntị n’okwu nile nke Jisus, na kwa nye bndị nke ọ họrọworo ma ziga n’etiti ha; n’ihi na onye ọbụla na anataghị okwu nile nke Jisus na okwu nile nke ndị ahụ o zigaworo anataghị ya; ma ya mere ọ gaghị anata ha n’ụbọchị ikpeazụ;

35 Ma ọ gaara akara ha mma ma ọbụrụ na amụbeghị ha. N’ihi na unu chere na unu nwere ike izere ikpe-ziri-ezi nke Chineke e mejọrọ emejọ, onye a azọgideworo n’ọkpuru ụkwụ nke ndị mmadụ, na site n’ebe ahụ nzọpụta nwere ike ịbịa?

36 Ma ugbua lee, dịka m kwuru gbasara ndị ahụ Onye-nwe họrọworo, e, ọbụna atọ ndị e welitere n’elu-igwe, ndị m na-amataghị ma a sachara ha site n’ịnwụ anwụ ruo n’anwụghị anwụ—

37 Mana lee, site n’oge m dere, ajụtawo m Onye-nwe, ma o mewo ka ọ pụta ìhè nye m na a ga-enwerirị mgbanwe e mere n’arụ ha nile, ma-ọbụ ọ dị mkpa na ha ga-ederịrị onwu ire;

38 Ya mere, ka ha wee ghara ide onwu ire e nwere amgbanwe e mere n’arụ ha nile, ka ha ghara ịta ahụhụ mgbu ma-ọbụ mwute ma ewezuga maka mmehie nile nke ụwa.

39 Ugbua mgbanwe nke a na nke ga-ewere ọnọdụ n’ụbọchị ikpeazụ ahaghị n’otu; mana e nwere mgbanwe e mere ha, nke mere na Setan agaghị enwe ike n’arụ ha, ka o wee ghara aịnwa ha; ma a bsachara ha n’anụ arụ, nke mere na ha dị cnsọ, ma na ike nile nke ụwa enweghị ike ijide ha.

40 Ma n’ọnọdụ nke a ha ga-anọgide ruo n’ụbọchị ikpe nke Kraịst; ma n’ụbọchị ahụ ha ga-anata mgbanwe nke ka ukwuu, na ka anabata ha n’ime ala-eze nke Nna ka ha ghara ịpụ kwa ọzọ, kama ibinyere Chineke ebighi-ebi n’elu-igwe nile.